Nrụgide Dị Mma, Nrụgide Dị Njọ
“Ebe ọ bụ na nrụgide bụ mmeghachi omume a na-akapịghị ọnụ nke ahụ nye mkpa ọ bụla, onye ọ bụla na-enwe ọ̀tụ̀tụ̀ ụfọdụ nke nrụgide mgbe nile.”—Dr. Hans Selye.
KA ONYE na-akpọ violin wee kpọpụta egwú, a ghaghị ikwesi eriri dị ná ngwá egwú ya ike—ma ọ bụ nanị ruo n’ọ̀tụ̀tụ̀ ụfọdụ. Ọ bụrụ na ha siri oké ike, ha ga-agbabi. Ma ọ bụrụ na eriri ahụ esichaghị ike, ha agaghị ewepụta ụda ma ọlị. Ọ̀tụ̀tụ̀ kwesịrị ekwesị nke isi ike bụ ịdị n’agbata abụọ ahụ.
O yiri nrụgide. Nke gabigara ókè pụrụ imerụ ahụ, dị ka anyị hụworo. Ma gịnị banyere enweghị nrụgide ma ọlị? Ọ bụ ezie na atụmanya ahụ pụrụ iyi ihe na-adọrọ mmasị, nke bụ eziokwu bụ na nrụgide dị gị mkpa—ma ọ dịghị ihe ọzọ ruo n’ọ̀tụ̀tụ̀ ụfọdụ. Dị ka ihe atụ, ka e were ya na ka ị na-agafe okporo ámá, na mberede i wee hụ na otu obere ụgbọala ji oké ọsọ na-agbata n’ebe ị nọ. Ọ bụ nrụgide na-eme ka i zere mmerụahụ—ngwa ngwa!
Ma nrụgide abaghị uru nanị maka ọnọdụ mberede. Nrụgide dịkwa gị mkpa iji rụzuo ọrụ ndị a na-arụ kwa ụbọchị. Onye ọ bụla na-enwe ọ̀tụ̀tụ̀ nrụgide ụfọdụ mgbe nile. ‘Nanị ụzọ isi gbanarị nrụgide bụ ịnwụ,’ ka Dr. Hans Selye na-ekwu. Ọ na-agbakwụnye na okwu ahụ bụ́ na “ọ na-enwe nrụgide” enweghị ihe ọ pụtara dịkwa ka okwu ahụ bụ́ na “o nwere ahụ ọkụ.” “Ihe anyị bu n’uche n’ezie site ná nkebi okwu ndị dị otú ahụ,” ka Selye na-ekwu, “bụ nrụgide ma ọ bụ ọ̀tụ̀tụ̀ okpomọkụ ahụ gabigara ókè.” N’echiche a ntụrụndụ na-achọkwa nrụgide, otú ahụ ka ọ dịkwa ụra, ebe ọ bụ na obi gị aghaghị ịnọgide na-akụ, akpa ume gị anọgidekwa na-arụ ọrụ.
Ụdị Nrụgide Atọ
Dị nnọọ ka e nwere ọ̀tụ̀tụ̀ nrụgide dị iche iche, e nwekwara ụdị dị iche iche.
Oké nrụgide na-esite ná ndọlị nke ndụ a na-adị kwa ụbọchị. Ọtụtụ mgbe, ọ na-emetụta ọnọdụ ndị na-adịghị mma ndị ọ dị mkpa ka e dozie. Ebe ihe ndị a na-eme ná ndabata, na-anọkwa nanị nwa oge, dị ka ọ na-adịkarị a pụrụ ịnagide nrụgide ha. N’ezie, e nwere ụfọdụ ndị na-esite n’otu nsogbu amaba n’ọzọ—n’ezie, ọgba aghara yiri ka ọ bụ akụkụ nke ọdịdị mmadụ ha. A pụrụ ọbụna ịchịkwa ọ̀tụ̀tụ̀ a nke oké nrụgide. Otú ọ dị, onye na-enwe ya pụrụ ịjụ ịgbanwe, ruo mgbe ọ ghọtara mmetụta nke ụzọ ndụ ya jupụtara ná nsogbu na-enwe n’ahụ ya na n’ahụ ndị nọ ya gburugburu.
Ọ bụ ezie na oké nrụgide na-adị nwa oge, nrụgide na-adịghị ala ala na-adịte aka. Onye na-enwe ya adịghị ahụ ụzọ isi pụta n’ọnọdụ na-akpata nrụgide, ọ masị ya ya bụrụ ahụhụ nke ịda ogbenye ma ọ bụ nhụsianya nke ọrụ e ledara anya—ma ọ bụ enweghị ọrụ. Nrụgide na-adịghị akwụsị akwụsị pụkwara isite ná nsogbu ndị na-aga n’ihu n’ezinụlọ. Ilekọta onye ikwu ahụ na-adịghị ike pụkwara ịkpata nrụgide. N’agbanyeghị ihe kpatara ya, nrụgide na-adịghị akwụsị akwụsị na-eji nwayọọ nwayọọ erida onye o metụtara kwa ụbọchị, kwa izu, kwa ọnwa. “Akụkụ kasị njọ nke nrụgide na-adịghị ala ala bụ na ọ na-amara ndị mmadụ ahụ,” ka otu akwụkwọ na-ekwu n’isiokwu ahụ. “Ndị mmadụ na-amata oké nrụgide ozugbo n’ihi na ọ bụ ihe ọhụrụ; ha na-eleghara nrụgide na-adịghị akwụsị akwụsị anya n’ihi na o mewo ochie, bụrụ nke maara ha ahụ, mgbe ụfọdụkwa bụrụ ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ nke dị ha mma n’ahụ.”
Nrụgide mkpasasị uche na-akpata bụ mmetụta nke ọdachi karịrị mmadụ, dị ka ndina n’ike, ihe ọghọm, ma ọ bụ ọdachi na-emere onwe ya. Ọtụtụ ndị so lụọ agha na ndị lanarịrị ogige ịta ahụhụ na-enwe ụdị nrụgide a. Mgbaàmà nke nrụgide mkpasasị uche na-akpata pụrụ ịgụnye ncheta doro anya nke ihe kpatara mkpasasị uche ahụ, ọbụna ọtụtụ afọ n’ihu, tinyere ịbụ onye ụmụ irighiri ihe na-emetụta karị. Mgbe ụfọdụ a na-achọpụta na onye ọ na-arịa nwere ọnọdụ a na-akpọ nsogbu nrụgide mgbe ọdachi gasịrị (PTSD).—Lee igbe dị n’elu.
Inwe Oké Mmetụta n’Ebe Nrụgide Dị
Ụfọdụ na-ekwu na ụzọ anyị si emeghachi omume ugbu a n’ebe nrụgide dị na-adabere n’ụzọ dị ukwuu n’ọ̀tụ̀tụ̀ na ụdị nrụgide anyị nweworo n’oge gara aga. Ha na-ekwu na ihe omume ndị na-akpata mkpasasị uche pụrụ n’ezie ịgbanwe “usoro njikọ” mmiri ọgwụ nke ụbụrụ, na-eme ka mmadụ na-enwe oké mmetụta karị n’ebe nrụgide dị n’ọdịnihu. Dị ka ihe atụ, n’otu ihe ọmụmụ banyere 556 ndị so lụọ Agha Ụwa nke Abụọ, Dr. Lawrence Brass chọpụtara na ihe ize ndụ nke ọrịa strok ji okpukpu asatọ ka elu n’etiti ndị bụworo ndị a dọọrọ n’agha karịa n’etiti ndị na-abụbeghị—ọbụna afọ 50 mgbe mkpasasị uche nke mbụ gasịrị. “Nrụgide nke ịbụ POW [onye a dọọrọ n’agha] siri oké ike nke na ọ gbanwere ụzọ ndị a si emeghachi omume n’ebe nrụgide dị n’ọdịnihu—o mere ka ha na-enwe oké mmetụta.”
E kwesịghị ileda ihe omume ndị kpatara nrụgide e nwere n’oge a bụ nwata anya, ka ndị ọkachamara na-ekwu, ebe ndị a pụrụ inwe mmetụta dị ukwuu. “A dịghị akpọtara dọkịta ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ụmụaka ndị nwere mkpasasị uche,” ka Dr. Jean King na-ekwu. “Ha na-emeri nsogbu ahụ, na-ebi ndụ ha, ma mesịa bịa n’ọfịs anyị ọtụtụ afọ mgbe nke ahụ gasịrị, na-enwe ịda mbà n’obi ma ọ bụ ọrịa obi.” Dị ka ihe atụ, tụlee mkpasasị uche nke ịbụ onye nne ma ọ bụ nna ya nwụnahụrụ. “Inwe nrụgide siri ike otú ahụ mgbe ị bụ nwata pụrụ ịgbanwe usoro njikọ nke ụbụrụ,” ka Dr. King na-ekwu, “na-eme ya ka ọ ghara inwecha ike ịnagide nrụgide kwesịrị ekwesị, nke a na-enwe kwa ụbọchị.”
N’ezie, otú mmadụ si emeghachi omume n’ebe nrụgide dị pụrụ ịdabere n’ihe ndị ọzọ n’otu aka ahụ, gụnyere ọdịdị ahụ ya na ihe ndị e nwere iji nyere ya aka ịnagide omume ndị na-akpata nrụgide. Otú ọ dị, n’agbanyeghị ihe kpatara ya, a pụrụ ịnagide nrụgide. N’eziokwu, nke a adịghị mfe. Dr. Rachel Yehuda na-ekwu, sị: “Ịgwa onye na-enwe oké nrụgide nanị ka ọ tụsara ahụ yiri ịgwa onye na-apụghị ihi ụra ka o hie nnọọ ụra.” Ma, e nwere ihe dị ukwuu mmadụ pụrụ ime iji belata nrụgide, dị ka isiokwu na-esonụ ga-egosi.
[Igbe dị na peeji nke 23]
Nrụgide n’Ihi Ọrụ—“Ihe Zuru Ụwa Ọnụ”
Otu akụkọ nke òtù Mba Ndị Dị n’Otu na-ekwu, sị: “Nrụgide abụrụwo otu n’ime okwu ahụ ike kasị sie ike nke narị afọ nke 20.” Ọdịdị ọ dị n’ebe ọrụ pụtara nnọọ ìhè.
• Ọnụ ọgụgụ akwụkwọ nzọrọ ndị e jikọtara ha na nrụgide nke ndị ọrụ gọọmenti n’Australia tinyere mụbara ruo pasent 90 n’ime afọ atọ nanị.
• Nnyocha e mere na France kpughere na pasent 64 nke ndị nọọsụ na pasent 61 nke ndị nkụzi na-ekwu na ha na-ewe iwe banyere ọnọdụ na-akpata nrụgide nke ha nọ na ya na-arụ ọrụ.
• Nrịanrịa ndị e jikọtara ha na nrụgide na-efu United States ihe e mere atụmatụ ya ịbụ ijeri $200 kwa afọ. A na-eme atụmatụ na pasent 75 ruo 85 nke ihe mberede nile nke ụlọ ọrụ mmepụta ihe bụ ihe e jikọtara ya na nrụgide.
• N’ọtụtụ mba, a chọpụtara na ndị inyom na-enwe nrụgide karịa ndị ikom, eleghị anya n’ihi na ha na-arụ ọrụ ka ukwuu n’ebe obibi na n’ebe ọrụ.
Nrụgide n’ọrụ bụ n’ezie, dị ka akụkọ nke òtù Mba Ndị Dị n’Otu kpọrọ ya, “ihe zuru ụwa ọnụ.”
[Igbe dị na peeji nke 24]
PTSD—Mmeghachi Omume Kwesịrị Ekwesị n’Ebe Ahụmahụ Na-ekwesịghị Ekwesị Dị
‘Ọnwa atọ mgbe obere ụgbọala anyị kpọkasịchara, m ka enwebeghị ike ịkwụsị ibe ákwá, ma ọ bụ ihi ụra n’abalị. Nanị isi n’ụlọ pụọ na-atụ m ụjọ.’—Louise.
LOUISE na-enwe nsogbu nrụgide mgbe ọdachi gasịrị (PTSD), ọrịa na-agwụ ike nke ihe e ji mara ya bụ nchetaghachi ma ọ bụ nrọ nke ihe na-akpata mkpasasị uche nke na-emeghachi ugboro ugboro ma na-abịa mgbe a na-achọghị ha. Onye nwere PTSD pụkwara inwe oké nkụja. Dị ka ihe atụ, ọkachamara n’ihe banyere ahụ ike nke uche bụ́ Michael Davis na-akọ banyere otu onye so lụọ agha Vietnam bụ́ onye mabara n’ime ọhịa n’ụbọchị agbamakwụkwọ ya mgbe ọ nụrụ ụda nke obere ụgbọala na-agba tụwaị tụwaị. “E kwesịrị inweworị ụdị ihe àmà dị iche iche na gburugburu ebe ahụ ndị ga-agwa ya na ihe nile dị otú o kwesịrị,” ka Davis na-ekwu. “Ọ bụ afọ 25 mgbe nke ahụ gasịrị; ọ nọ na United States, ọ bụghị Vietnam; . . . o yi kootu na-acha ọcha, ọ bụghị uwe agha. Ma mgbe ihe mkpali mbụ ahụ bịara, ọ gbara ọsọ maka nchebe.”
Mkpasasị uche nke ọgbọ agha bụ nanị otu ihe na-akpata PTSD. Dị ka The Harvard Mental Health Letter si kwuo, nsogbu ahụ pụrụ ịpụta site ‘n’ihe omume ma ọ bụ usoro ihe omume ọ bụla nke na-agụnye ọnwụ kpọmkwem ma ọ bụ iyi egwu ọnwụ ma ọ bụ mmerụ ahụ dị oké njọ ma ọ bụ iyi egwu nke mmerụ ahụ. Ọ pụrụ ịbụ ọdachi na-emere onwe ya, ihe mberede, ma ọ bụ ihe mmadụ mere: idei mmiri, ọkụ, ala ọma jijiji, mkpọkasị nke obere ụgbọala, ịtụ bọmbụ, ịgba égbè, ịta mmadụ ahụhụ, ịtọrọ mmadụ, mwakpo, ndina n’ike, ma ọ bụ mmetọ nwatakịrị.’ Nanị ịhụ ihe na-akpata mkpasasị uche ma ọ bụ ịnụ banyere ya—ikekwe site n’akaebe dị ịrịba ama ma ọ bụ foto—pụrụ ịkpali mgbaàmà nke PTSD, karịsịa ma ọ bụrụ na ndị o metụtara bụ ndị òtù ezinụlọ ma ọ bụ ezi ndị enyi.
Otú ọ dị, ndị mmadụ na-emeghachi omume n’ebe mkpasasị uche dị n’ụzọ dịgasị iche iche. “Ihe ka ọtụtụ ná ndị na-enwe ahụmahụ na-akpata mkpasasị uche adịghị enwe mgbaàmà nsogbu uche ndị siri ike, ma ọbụna mgbe e nwere mgbaàmà, ha adịghị abịacha n’ụdị nke PTSD,” ka The Harvard Mental Health Letter na-akọwa. Gịnị banyere ndị nrụgide ha na-eduga na PTSD? Ka oge na-aga, ụfọdụ na-enwe ike ịnagide mmetụta ndị na-eso mkpasasị uche ma nweta ahụ efe. Ndị ọzọ na-anọgide na-agbaso nchetaghachi nke ihe kpatara mkpasasị uche mgba ruo ọtụtụ afọ mgbe o mesịrị.
Na nke ọ bụla, ndị na-enwe PTSD—na ndị chọrọ inyere ha aka—kwesịrị icheta na mgbake chọrọ ndidi. Bible na-agba ndị Kraịst ume ka ha ‘na-agụgụ ndị dara mbà n’obi’ ma ‘na-enwe ogologo ntachi obi n’ebe mmadụ nile nọ.’ (1 Ndị Tesalọnaịka 5:14) Nye Louise, onye e hotara ihe o kwuru ná mmalite, ọnwa ise gafere tupu o nwee ike ịnya obere ụgbọala ọzọ. “N’agbanyeghị ọganihu ndị m nweworo,” ka o kwuru afọ anọ mgbe ihe mberede ahụ gasịrị, “ịnya ụgbọala agaghị abụkwa ihe obi ụtọ ọ bụụrụ m na mbụ. Ọ bụ ihe m na-aghaghị ime, n’ihi ya m na-eme ya. Ma e nwewo m ọganihu eri oge ahụ m na-enweghị ike inyere onwe m aka nke sochiri ihe mberede ahụ.”
[Foto dị na peeji nke 25]
Nrụgide na-ebogbu ọtụtụ ndị na-arụ ọrụ ọfịs
[Foto dị na peeji nke 25]
Ọ bụghị nrụgide nile dị njọ nye gị