Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g97 11/8 p. 28-29
  • Enyemaka Maka Ụkwụ Mgbu

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Enyemaka Maka Ụkwụ Mgbu
  • Teta!—1997
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ịba nke Ọma, Ejiji, na Ụkwụ
  • Ihe Ọmụma Maka Ịzụ Ahịa
  • È Kwesịrị Iji Ịga Ije Emega Ahụ́?
    Teta!—2004
Teta!—1997
g97 11/8 p. 28-29

Enyemaka Maka Ụkwụ Mgbu

“ỤKWỤ m na-egbu m!” O doro anya na nke ahụ bụ ikwu okwu karịa otu ihe dị. Ka o sina dị, nsogbu nke ụkwụ mgbu dị oké njọ na United States ime ka ndị ọkachamara n’ọrịa ụkwụ na-enwe ọrụ.

Mgbe ọ tụlesịrị ịwa ụkwụ 2,000 ọ wara n’ime oge karịrị afọ 14, Dr. Michael Coughlin, dibịa na-agba ọkpụkpụ, chọpụtara ihe dị ịtụnanya. “Ọ bụ ihe ijuanya,” ka ọ na-ekwu, “na m chọpụtara na ọ fọrọ nke nta ka ọwụwa ahụ a nile bụrụ n’ụkwụ ndị inyom.” N’ihi gịnị ka ndị inyom jikarị na-enwe nsogbu ụkwụ?

Ịba nke Ọma, Ejiji, na Ụkwụ

Otu nnyocha e mere ndị inyom 356 chọpụtara na ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ 9 n’ime 10 yiri, ná nkezi, saịzi ụkwụ ha karịrị nnọọ! Akụkụ nke nsogbu ahụ dabeere n’ụzọ e si eme akpụkpọ ụkwụ ndị inyom. “Ndị na-arụ akpụkpọ ụkwụ adịkwaghị eji last e jikọtara ọnụ na-eme ihe, bụ́ nke pụrụ ime ka ike akpụkpọ ụkwụ dị ntakịrị ma mee ka ebe ihu saa asa karị,” ka dibịa na-agba ọkpụkpụ bụ́ Francesca Thompson na-akọwa.a

N’ihi ya, mgbe ha na-ele akpụkpọ ụkwụ, ọtụtụ ndị inyom na-achọpụta na mgbe ebe ihu bara nke ọma, ike ya na-agbụ agbụ; ma mgbe ebe ike ya bara nke ọma, ebe ihu na-akpagide akpagide. Ndị ọzọ na-ahọrọ ike ụkwụ bara nke ọma nke na-akpagide akpagide n’ihu, ebe ọ bụ na ime ihe dị iche pụrụ ịpụta ụkwụ ịmịpụ mgbe ọ bụla a tụrụ ụkwụ.

Ịfabanye ebe ihu nke ụkwụ n’ime ọnụ akpụkpọ ụkwụ dị mkpagide yiri ka ọ dị nnọọ njọ. Ma ndị na-arụ ha na-eji sentimita ole na ole na-ewelikwa ike akpụkpọ ụkwụ elu. Ọ bụ ezie na a na-ele ya anya dị ka ihe na-ewu ewu, ike akpụkpọ ụkwụ dị elu na-etinye nrụgide nile n’ọkpụkpụ mkpịsị ụkwụ nke ukwu, ọ na-asụmikwukwa ụkwụ gaa n’ime ọnụ akpụkpọ ụkwụ nke pụrụ ịdịwo nnọọ mkpagide. “Ọ dịghị ihe dị ka akpụkpọ ụkwụ ike ya dị elu nke dị mma,” ka Dr. David Garrett, ọkachamara n’ọrịa ụkwụ, na-ekwu. Ụfọdụ na-ekwu na ike akpụkpọ ụkwụ ndị dị elu pụrụ imesị bibie ụkwụ, nkwonkwo ụkwụ, afọ ụkwụ, ikpere, na azụ nke onye na-eyi ya. Ha pụkwara ime ka uru ahụ nke ụkwụ na akwara uru ahụ dị mkpụmkpụ, nke pụrụ ime ka ndị na-agba ọsọ karịsịa nọrọ n’ọnọdụ ịdaba n’ajọ mmerụ ahụ.

Ụkwụ nwanyị anaghị ekwekọ nke ọma ná mmejọ a na-emejọ ya. N’ezie, n’afọ ndị na-agafenụ ebe ihu nke ụkwụ na-agbasakarị—ọbụna mgbe onye ahụ toruworo okenye. Ma ikiri ụkwụ adịghị otú ahụ. “Ikiri ụkwụ nwere nanị otu ọkpụkpụ,” ka Dr. Thompson na-ekwu, “nke ahụ na-adịgidekwa ntakịrị mgbe a dị afọ 84 dị ka ọ dị mgbe a dị afọ 14.” Nke a na-eme ka o sikwuoro nwanyị ike ịchọta akpụkpọ ụkwụ ga-aba nke ọma site n’ikiri ụkwụ ruo mkpịsị ụkwụ.

Ihe Ọmụma Maka Ịzụ Ahịa

Ka ịba nke ọma na iwu ewu nke akpụkpọ ụkwụ ha na-arụ ọrụ megide ha, olee otú ndị inyom pụrụ isi gbochie ụkwụ mgbu? Azịza ya na-amalite n’ebe a na-ere akpụkpọ ụkwụ. Ụfọdụ ndị ọkachamara na-atụ aro ndị na-esonụ:

● Zụta akpụkpọ ụkwụ n’uhuruchi, mgbe ụkwụ gị na-azatụ aza.

● Yitụ ụkwụ ya abụọ—ọ bụghị nanị otu.

● Jiri n’aka na ike ya bara nke ọma nakwa na ogologo, obosara, na ịdị elu nke ọnụ ụkwụ ya zuru ezu.

● Cheta na ebe a na-ere akpụkpọ ụkwụ pụrụ inwe kapeti e ji ihe dị oké yọrị yọrị mee, na-eme ka ọbụna akpụkpọ ụkwụ na-abaghị ụkwụ dị mma na nwa oge.

● Zere akpụkpọ ụkwụ e ji akpụkpọ siri ike ma ọ bụ ihe ndị mmadụ mere mee. N’adịghị ka akpụkpọ dị nro ma ọ bụ nke nwere ajị, ụdị a anaghị apịaji apịaji mgbe ị na-aga ije.

● Ọ bụrụ na ị zụta akpụkpọ ụkwụ ndị ike ha dị elu, nwalee itinye ihe n’ime ha ka ha wee dịtụkwuo yọrị yọrị. Tụlee iyi akpụkpọ ụkwụ ndị dị elu maka nanị obere oge, jiri ndị ike ha ka ala na-agbanwe ya mgbe mgbe n’ime ụbọchị dum.

Tụkwasị n’ihe dị n’elu, cheta mgbe nile na akpụkpọ ụkwụ kwesịrị ịdị mma n’ụkwụ n’oge a zụtara ya. N’adịghị ka ihe ọha kwere, e nweghị oge mmara ahụ dịnụ. “Ekwela ma ọlị ka onye na-ere ahịa mee ka ikweta na akpụkpọ ụkwụ na-afụ gị ụfụ ga-adị mma mgbe ọ matasịrị gị ahụ,” ka Dr. Coughlin na-adọ aka ná ntị. “Nanị ihe ga-emebi bụ ụkwụ gị.”

Ma gịnị ma ọ bụrụ na nanị nhọrọ i nwere bụ ihu akpụkpọ ụkwụ dị mkpagide nke ike ya dị mma ma ọ bụ ihu akpụkpọ ụkwụ dị mma nke ike ya na-agbụ agbụ? Dr. Annu Goel, ọkachamara n’ọrịa ụkwụ, na-ekwu na i kwesịrị ikpebi nke ka mfe ndozi. “E nwere ụzọ abụọ isi eme nke a,” ka ọ na-ekwu. “Nke mbụ, ị pụrụ ịzụta akpụkpọ ụkwụ ebe ihu ya dị nnọọ obosara wee tinye ihe dị yọrị yọrị n’ime ya ka ike ya wee dịkwuo mma n’ụkwụ. . . . Ụzọ nke abụọ bụ ịzụta akpụkpọ ụkwụ ike ya dị mma wee gbasatụkwuo ebe ihu ya. Ma nke a na-adịkarị irè n’akpụkpọ ụkwụ e ji akpụkpọ anụ mee.”

Ebe ọtụtụ ndị inyom na-aga ije ihe dị ka kilomita 15 kwa ụbọchị, ha ga-eme nke ọma inyocha akpụkpọ ụkwụ ha. Dị ka magazin bụ́ American Health na-ekwu, “site n’ịkwanyekwuru ụkwụ ùgwù—karịsịa site n’iyi akpụkpọ ụkwụ ndị bara nke ọma—ị pụrụ igbochi ọtụtụ nsogbu ụkwụ ka ha wee ghara ịdị ma ọlị.”

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

a “Last” bụ ihe ọ̀tụ̀tụ̀ yiri ụkwụ nke e ji akpụ akpụkpọ ụkwụ.

[Igbe dị na peeji nke 28]

Nsogbu Anọ A Na-enwekarị n’Ụkwụ

Bunion. Bunion bụ akpụ na-afụ n’okpuru mkpịsị ụkwụ nke ukwu. Mgbe ọ na-abụghị ebumpụta ụwa, akpụkpọ ụkwụ na-akpagide akpagide ma ọ bụ nwere ike dị elu pụrụ ịkpata bunion. Ite ya ihe dị ọkụ ma ọ bụ ice pụrụ ibelata igbu mgbu ya, ma ọ dị mkpa ịwa ya awa iji wee gwọchaa bunion.

Hammertoe. Mkpịsị ụkwụ ndị gbagọrọ agbagọ chee ihu n’ala pụrụ ịbụ nke akpụkpọ ụkwụ na-etinye ebe ihu nke ụkwụ n’oké nrụgide kpatara. A pụrụ ịchọ ịwa ya awa ka e wee dozie nkwarụ ahụ.

Akị ụkwụ. Akpụ fụrụ afụ n’elu mkpịsị ụkwụ, nke nchihịa ahụ na nrụgide na-akpata, mgbe ụfọdụ na-esite n’iyi akpụkpọ ụkwụ dị oké mkpagide. Ịgwọ ya n’ụlọ pụrụ iwetatụ ahụ efe, ma ịwa ya awa na-adịkarị mkpa ka e wee dozie mkpịsị ụkwụ ndị kwarụrụ akwarụ bụ́ ndị na-akpata nchihịa ahụ.

Ụkwụ mgbasi. Ọkpụrụkpụ anụ ahụ nwụrụ anwụ na-echebe ụkwụ pụọ ná nchihịa ahụ ugboro ugboro. Ịbịa ya mmiri dị ṅara ṅara e tinyere Epsom salt pụrụ ime ka ha dịtụ nro. Ma anwala anwa ibepụ ha, ebe nke a pụrụ ịkpata ọrịa.

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 28]

The Complete Encyclopedia of Illustration/J. G. Heck

    Akwukwo Igbo (1984-2026)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2026 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya