Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g97 9/8 p. 30-31
  • Ikiri Ụwa

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ikiri Ụwa
  • Teta!—1997
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ịnwụ na Nwata
  • Ọrịa Ndị Na-esite n’Ihe Oriri
  • Enwe Ndị Dị “Nsọ” —Ihe Na-akpasu Iwe
  • Ọ̀ Bụ Ihe A Na-eyi Eyi Kpadoro Akpado?
  • Ịchọgharị “Ndị Iro A Na-amaghị”
  • Ndị Na-eche Oriri Nsọ Nche
  • Vidio Nchetaghachi Ihe
  • Akwụkwọ E Ji Nsị Enyi Mee
  • Usoro Iri Ihe
  • Mgbochi Ọgbụgbọ na Ọnyụnyụ Na-adịghị Efu Ego
  • Ịhụnanya America Hụrụ Égbè
  • Tv Ihe ‘A Na-adịghị Achọpụta Ngwa Ngwa Na Ọ Na-akụzi Ihe’
    Teta!—2006
  • Nri Ị Na-eri Ọ̀ Na-akpatara Gị Ọrịa?
    Teta!—2012
  • Ikiri Ụwa
    Teta!—2001
Teta!—1997
g97 9/8 p. 30-31

Ikiri Ụwa

Ịnwụ na Nwata

E jiri ha tụnyere ụmụaka nọ ná mba 25 ndị ọzọ mepere emepe, ụmụaka nọ na United States ji okpukpu 12 yie ka ha ga-anwụ n’ọgụ égbè, jiri okpukpu 5 yie ka ha ga-anwụ n’igbu ọchụ, jirikwa okpukpu abụọ yie ka ha ga-egbu onwe ha, ka akwụkwọ akụkọ The Dallas Morning News na-akọ. “Anyị nọ na-atụ anya na United States ga-enwe ọ̀tụ̀tụ̀ ka elu, ma ịdị ukwuu nke ịdị iche ahụ juru anyị anya,” ka Etienne Krug, onye nduzi akụkọ ahụ maka Ụlọ Ọrụ Maka Nchịkwa Ọrịa dị na Atlanta, Georgia, na-ekwu. Ihe ndị so n’ihe e jikọtara ya na ọnwụ ike n’etiti ụmụaka bụ ọgwụ ọjọọ, ịda ogbenye, ezinụlọ tiwara etiwa, na ohere agụmakwụkwọ dị nta.

Ọrịa Ndị Na-esite n’Ihe Oriri

Ọchịchọ rịrị elu a na-achọ “ụdị dị iche iche nke ihe ubi ndị ka dị ndụ kwa afọ” tinyere “ahịa zuru ụwa ọnụ nke pụrụ ibuga ihe oriri n’ebe ọ bụla n’ụwa n’otu abalị” so na-akpata mpụta nke nrịanrịa ọhụrụ ndị na-esite n’ihe oriri na United States, ka JAMA (The Journal of the American Medical Association) na-akọ. Dabere n’ihe ọmụmụ e mere n’afọ iri gara aga, ndị ọkà mmụta sayensị na-eme atụmatụ na nje na-esite n’ihe oriri “na-eme ka nde mmadụ 6.5 ruo nde 81 daa ọrịa, na-akpatakwa ọnwụ nke mmadụ 9000 kwa afọ na United States.” Ụfọdụ ndị ọkachamara kwenyekwara na ịrị elu n’oriri a na-eri ihe oriri ndị e ji nsị anụmanụ kọọ pụrụ iso kpata nsogbu ahụ. Dị ka akụkọ JAMA si kwuo, “E coli pụrụ ịdị ndụ ná nsị ehi ruo ụbọchị 70, ọ pụkwara ịmụba n’ihe oriri ndị e ji nsị anụ kọọ, ọ gwụla ma e ji ọkụ ma ọ bụ ihe ntinye ndị dị ka nnu ma ọ bụ ihe nchekwa gbuo nje ndị ahụ.”

Enwe Ndị Dị “Nsọ” —Ihe Na-akpasu Iwe

Enwe rhesus ebiwo na Vrindavan, India, ruo ogologo oge onye ọ bụla pụrụ icheta, ka ọkà n’ihe ọmụmụ banyere ezinụlọ enwe, bụ́ Iqbal Malik, na-ekwu. Ọtụtụ na-ewere enwe ndị ahụ dị ka ihe dị nsọ, ha enwerewokwa onwe ha ịgagharị n’obodo nsọ ndị Hindu n’atụghị egwu njide—ya bụ, ruo ugbu a. Dị ka magazin New Scientist si kwuo, ọnụ ọgụgụ rhesus ahụ arịwo elu n’ụzọ dị ukwuu n’ebe ahụ n’afọ ndị a n’ihi na ọnụ ọgụgụ nke ndị njem ala nsọ na-azụ ha amụbawo. A na-eche na ịzụ enwe na-eweta ọganihu. Otú ọ dị, n’afọ ndị gafeworonụ, enwe ndị ahụ fọziri nke nta ka ọ bụrụ na ha na-adabere kpam kpam n’ihe a na-enye ha n’ihi na e nwere ahịhịa ndụ dị nta. “Ha amalitewo izuru akpa ma na-abanye n’ụlọ ije chọọ ihe oriri.” Ndị bi ebe ahụ ekwetawo ka e jide ma wega ihe ruru 60 pasent nke ọnụ ọgụgụ enwe ahụ n’ime ime obodo. Malik na-ekwu, sị: “Chi ndị ahụ aghọọla ihe na-akpasu iwe.”

Ọ̀ Bụ Ihe A Na-eyi Eyi Kpadoro Akpado?

Ọ bụ ezie na ọkpụkpụ ụkwụ anyị na-akwụsị ito ná ngwụsị oge uto, ụkwụ anyị na-agbanwe ná ndụ anyị nile. Neil Koven, onye isi oche nke Òtù Ahụ Ike Metụtara Ọgwụgwọ Ụkwụ nke Canada, na-ekwu, sị: “Ka anyị na-aka nká, ụkwụ anyị na-adịkwu mbadamba ma na-asatụ asa, ya mere ha na-etokwu ogo ma na-asakwu mbara. Ọ bụ n’ihi na akwara anyị adịghị esichakwa ike.” Ndị ọkachamara n’ihe a na-eyi n’ụkwụ na-eme atụmatụ na ihe ruru otu ọkara nke ndị toruworo ogo mmadụ na-eyi akpụkpọ ụkwụ na-abụghị ụkwụ ha—ọ̀tụ̀tụ̀ ibu ya na-abụkarịsị nsogbu—nke na-akpata akị ụkwụ, ụkwụ mgbasi, ụkwụ òtùtù, na nkwarụ nke mkpịsị ụkwụ. Akpụkpọ ụkwụ gị ọ̀ na-akpadosi gị ike? “Guzoro n’elu mpempe akwụkwọ n’eyighị ihe ọ bụla n’ụkwụ ma kaa ihe gburugburu ụkwụ gị abụọ. Tụkwasịzie akpụkpọ ụkwụ gị n’elu akwụkwọ ahụ ma kaa ihe gburugburu ha. Site n’ịtụle ọdịiche akara ndị ahụ, ị ga-enwe ike ịhụ otú ị na-afanye ụkwụ gị n’akpụkpọ ụkwụ gị,” ka akwụkwọ akụkọ bụ́ The Toronto Star na-ekwu. Iji nweta nke ga-aba gị nke ọma, tụọ ụkwụ gị n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀ mgbe ọ bụla ị gara ịzụrụ akpụkpọ ụkwụ, zụrụkwa nke ị chọrọ ịzụ n’ehihie ma ọ bụ n’uhuruchi mgbe i jiworo ụkwụ gị gagharịa.

Ịchọgharị “Ndị Iro A Na-amaghị”

Na 1997, ihe ndị ahụ na-adịghị anabata ma ọ bụ hay fever ji ọnwa abụọ malite n’oge karịa ka ọ na-adịkarị nye ndị bi na Rom, Itali, ka Corriere della Sera na-ekwu. Otu onye ọkà n’ihe ndị ahụ na-adịghị anabata chere na ihe kpatara mwakpo ntụ okooko osisi nke a n’oge bụ “mmụba e nwere n’ozuzu ya ná nkezi ọ̀tụ̀tụ̀ okpomọkụ nke mbara ụwa, bụ́ nke belataworo ịdị ogologo nke oge oyi n’ụzọ pụtara ìhè.” Akwụkwọ akụkọ ahụ na-ekwu na “ụbọchị ndị dị mma ewetawo ntụ okooko osisi ndị a na-amaghị, nke ndị ọkachamara ná ngalaba ahụ na-enweghị ike imebi.” “Ịchọgharị ihe a na-amaghị na-akpata ya” esiwo otú a maliterị, ma ka ọ dị ugbu a, “ndị ọrịa na-arịa ihe ndị ahụ na-adịghị anabata, ndị a na-apụghị ịmata ihe na-akpata ha.”

Ndị Na-eche Oriri Nsọ Nche

St. Charles Katọlik Chọọchị dị na Picayune, Mississippi, amalitewo idebe ndị nche iji jide n’aka na ọ dịghị onye ọ bụla na-apụ na chọọchị n’eloghị Oriri Nsọ ahụ. A malitere ime nke a n’ihi ọtụtụ ọnọdụ ebe ndị mmadụ jiworo oriri nsọ, ma ọ bụ Achịcha Nsọ, nke ndị Katọlik na-ewe dị ka ihe dị nsọ, pụọ na chọọchị. Dị ka akwụkwọ akụkọ The Dallas Morning News si kwuo, ụkọchukwu bụ́ John Noone na-azọrọ na “ndị na-efe Setan chọrọ inweta achịcha nsọ ahụ” iji wee “merụọ” ya. Ọrụ ndị nche Oriri Nsọ bụ ileru ndị na-abịa chọọchị anya na ịhụ ma ha loro ya n’ezie. Ọ bụrụ na ha eloghị ya, a na-eji obiọma gwa ndị ahụ na-aga chọọchị ka ha rie Achịcha Nsọ ahụ ma ọ bụ weghachi ha.

Vidio Nchetaghachi Ihe

Dị ka okwu e bipụtara na magazin bụ́ Pediatrics si kwuo, “ihe ọmụmụ ole na ole e ji mee nnwale na-egosi na vidio egwú pụrụ inwe mmetụta dị ukwu n’omume site n’igbu mmetụta nke ndị na-ekiri ya n’ebe ime ihe ike dị na site n’ime ka ndị nọ n’afọ iri na ụma yikwuo ka ha ga-akwado inwe mmekọahụ tupu alụmdi na nwunye.” Ihe kasị echegbu ndị mụrụ ụmụ bụ okwu abụ dị n’egwú rock na-adasi ụda ike na gangsta rap. “Nye ìgwè nta nke ndị nọ n’afọ iri na ụma, nhọrọ egwú pụrụ ịbụ oké ihe mgbaàmà. Ọtụtụ ihe ọmụmụ na-egosi na ịhọrọ egwú rock na-adasi ụda ike pụrụ ịbụ ihe àmà pụtara ìhè maka nkewapụ onwe onye, iji ihe na-eri ahụ eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi, isi mgbaka, ihe ize ndụ igbu onwe onye, echiche na-ezighị ezi banyere ọrụ nwoke ma ọ bụ nwanyị, ma ọ bụ àgwà dị ize ndụ n’oge uto.” Akụkọ ahụ, nke ndị dọkịta asatọ chịkọtara n’agbata 1995 na 1996, na-ekwu, sị: “Ọ bụrụ na ndị na-ekiri ihe anụ otu egwú mgbe ha kirisịworo nke vidio ya, ozugbo ha ‘na-echetaghachi’ ihe ndị e mere na vidio ahụ.”

Akwụkwọ E Ji Nsị Enyi Mee

Mgbe ndị agbata obi hụrụ ka Mike Bugara na-esi ite nsị enyi n’azụ ụlọ ya, n’ụzọ kwere nghọta ha nwere nnọọ nchegbu. Ụfọdụ chere na ọ na-ata amoosu, ma, n’ezie, ọ na-eme akwụkwọ. Maazị Bugara buru ụzọ jiri unere, ọka, na akwụkwọ osisi eucalyptus mepụta akwụkwọ. Ma nsị enyi ndị dị na Kenya bụ́ nke jupụtara na fiber mere ka onye ahụ na-akwadosi nchebe ihe okike ike malite iche banyere iji ya mepụta akwụkwọ. O kpebiri na ọ ga-abụ ụzọ dị mma isi welite “nghọta ndị mmadụ banyere uru nke idebe ụdị ihe ndị a ndụ,” ka magazine bụ́ New Scientist na-akọ. Ugbu a a na-eji akwụkwọ ya e ji nsị enyi mee eme kaadị ịkpọ òkù maka ememe mgbaafọ 50 nke Ụlọ Ọrụ Na-ahụ Maka Anụ Ndị Bi n’Ọhịa na Kenya n’afọ a.

Usoro Iri Ihe

TV bụ “ebe ihe dị ukwuu n’akparamàgwà usoro ime ihe nke oge a lekwasịrị anya,” ka akwụkwọ akụkọ The New York Times na-ekwu. Otu ihe atụ e nyere bụ omume nke iri ihe mgbe a na-ekiri telivishọn—ugbu a ọ bụ usoro ime ihe ná mba dị iche iche gburugburu ụwa. Dị ka ihe atụ, na Mexico, ọtụtụ ezinụlọ na-eri nri abalị ha ka ha na-ekiri usoro ihe nkiri. Otu nnyocha e mere na nso nso a na France kpughere na “a na-eri 62 pasent nke ihe oriri mgbe a gbanyere TV.” Na China, ndị na-ekiri ihe na-anụ ụtọ ihe omume TV pụrụ iche ka ha na-ata mkpụrụ watermelon a hụrụ ahụ. Mkpụrụ ojii ndị a na-ewukwa ewu n’etiti ndị na-ekiri TV n’Israel, tinyere mkpụrụ sunflower na pistachios. Mgbadume TV na Philippines gụnyere ụkwụ ọkụkọ a mịrị amị, ntị ezì, na eriri afọ ọkụkọ a fanyere n’osisi ma mịkpọọ. Mgbadume na-amasịkarị ha bụ balut—“ụmụ ọbọgwu nọ n’àkwá e siri esi, ndị a na-eri site ná mkpokoro ya nke e fesakwara nnu,” ka akwụkwọ akụkọ bụ́ Times na-ekwu.

Mgbochi Ọgbụgbọ na Ọnyụnyụ Na-adịghị Efu Ego

Ndị ọkà mmụta sayensị kwere na ha achọpụtawo ụzọ na-adịghị efu ego nke isi gbochie ọgbụgbọ na ọnyụnyụ—iji ákwà sari zaa mmiri ọṅụṅụ! Ndị na-eme nchọpụta na Mahadum nke Maryland, dị na United States, na n’Ụlọ Ọrụ Mba Nile Maka Inyocha Ọrịa Otoro, dị na Dacca, Bangladesh, chọpụtara na nje bacteria na-ebute ọgbụgbọ na ọnyụnyụ na-ebi n’afọ copepod, bụ́ crustacean ndị dị ka plankton na-ebi na mmiri. Site n’ịwụfe mmiri site n’ákwà sari anọ e jikọrọ ọnụ, a pụrụ iwepụ ihe karịrị 99 pasent nke nje bacteria ọgbụgbọ na ọnyụnyụ. A pụziri igbu nje dị n’ákwà sari site n’ịgba ya n’anwụ ruo hour abụọ, ma ọ bụ, n’oge oké mmiri ozuzo, site n’itinye ya ọgwụ mgbochi nje ndị dị ọnụ ala. Akwụkwọ akụkọ London bụ́ The Independent na-akọ na ịnwale ya n’èzí ga-amalite n’afọ a, mgbe a ga-akụziri ndị bi n’ógbè ndị o metụtara ụzọ e si etinye usoro ahụ n’ọrụ.

Ịhụnanya America Hụrụ Égbè

“Mmadụ 4 n’ime ndị America 10 toruworo ogo mmadụ na-ebi n’ezinụlọ ndị nwere égbè, ebe obibi ndị ahụ nwekwara nkezi nke égbè abụọ maka otu, dị ka otu njụta echiche e mere ná mba ahụ si kwuo,” ka akwụkwọ akụkọ bụ́ Daily News nke New York na-akọ. “Ná njụta echiche ahụ, 25% kwuru na ha nwere otu pistol, 27% otu obere égbè na 29% ogologo égbè.” Ọtụtụ ezinụlọ nwere ihe karịrị otu ụdị égbè.

    Akwukwo Igbo (1984-2026)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2026 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya