Ịka Rọba—Ọrụ nke Na-emetụta Ndụ Gị
Site n’aka onye nta akụkọ Teta! na Nigeria
N’ELEKERE anya ise n’ụtụtụ, oké ọhịa mmiri ozuzo dị na Nigeria na-agba ọchịchịrị, na-ajụkwa oyi. N’ime otu ụlọ e ji blọkụ ụrọ wuo n’etiti oké ọhịa, John si n’ụra bilie ma yiri uwe ya. Mgbe ahụ o chere ihu n’ọchịchịrị ahụ, na-eburu otu ọkụ oriọna, bọket plastik, na otu mma dị mkpirikpi nke nwere ihu a gbagọrọ agbagọ. N’ime hour anọ na-esochi, ọ na-aga site n’osisi ruo n’osisi, jiri mma na-aka akara ná mkpo osisi nke ọ bụla.
Nke a bụ nke mbụ n’usoro ihe omume dị ogologo nke pụrụ imesị metụta ndụ gị. N’ụzọ dị aṅaa? N’ihi na osisi ndị John ji mma kaa akara bụ osisi rọba. Rọba kwa, nke nwere ikike ihichapụ akara ndị e ji pensịl kanye, bụ otu n’ime ihe ndị kasị baa uru, nke anyị ji eme ihe n’ụzọ kasị saa mbara.
Ọtụtụ Puku nke Ihe Ndị E Ji Ya Mee
Cheedị nnọọ echiche banyere òkè rọba na-ekere ná ndụ gị. Ọ pụrụ ịbụ na e ji rọba mee ike akpụkpọ ụkwụ gị. Ọ pụrụ ịbụ na e ji foam rọba mee okpuru kapet na arịa ụlọ gị. O yikarịrị ka e ji rọba mee eriri ndọtị dị n’ákwà gị. Mgbe mmiri na-ezo, ị pụrụ ịchịrị uwe mmiri na buut ndị e ji rọba mee. Ị̀ na-aga igwu mmiri? Ákwà dere mmiri, enyo anya, na akpụkpọ ụkwụ e ji egwu mmiri pụrụ inwe rọba. Ị́ chọghị igwu mmiri? Eleghị anya ị ga-ahọrọ nanị iji raft rọba wee na-ese n’elu mmiri ma ọ bụ iji bọl ụsọ mmiri e ji rọba mee na-egwuri egwu. Eleghị anya, na gburugburu ebe obibi gị, e nwere rọba e ji agbagide ihe, nchịcha rọba, na rọba e ji anyakudo ihe. Mgbe ị ga-ehi ụra n’abalị a, ọ pụrụ ịbụ n’elu matras na ohiri isi e ji ihe sitere na rọba mee ka ị ga-edina. Ọ bụrụ na oyi na-atụ gị, ị pụrụ ịmakụ karama e ji rọba mee, bụ́ nke a gbanyere mmiri ọkụ.
E wezụgakwa ihe ndị ahụ nile, e nwere ọtụtụ ihe nke o doro anya na ha agaghị arụ ọrụ nke ọma ma ọ bụrụ na ha enweghị akụkụ ndị e ji rọba mee—washer, belt, gasket, hose, roller, ma ọ bụ valvụ. Dị ka ihe atụ, otu ụgbọala nwere ihe dị ka 600 akụkụ ndị bụ rọba. Ná ngụkọta, dị ka akwụkwọ bụ́ The World Book Encyclopedia si kwuo, a na-eji rọba emepụta ihe dị n’agbata 40,000 na 50,000 ụdị ihe.
Gịnị mere rọba ji aba uru otú a? Ọ na-esi ike mgbụcha, na-anagide okpomọkụ, na-adọtị adọtị, na-anagide mmiri, na-anagide ikuku, na-achịkwa ịsụ asụ. Tụlee taya, ma ọ̀ bụ nke ịnyịnya ígwè, ụgbọala, ma ọ bụ nke ụgbọelu. N’ihi na ọ bụ rọba, taya adịghị agbụchapụ ngwa ngwa n’ihi mmetụ ọ na-emetụ mgbe mgbe n’ala, ọ gaghịkwa enwuru ọkụ n’ihi nchicha ọ na-echicha mgbe mgbe. Mgbe i si n’apịtị gbafere, i kwesịghị ịtụ egwu ma taya ọ̀ ga-ede mmiri ma retọọ; ọ gaghịkwa ata nchara. Ọ bụghị nanị na rọba adịghị egbochi mmiri ịbanye n’ime taya, kama ọ na-egbochikwa ikuku a fụnyere n’ime ya ikupụsị. Ọzọkwa, ka ị na-aga n’ihu, ikike ịchịkwa ịsụ asụ nke rọba dị na taya gị na-enye aka ime ka mmali na mmada dị n’ụzọ ghara imetụta gị nke ukwuu. N’ezie, e wezụga rọba, ọ ga-esiri ndị na-emepụta ihe ike imepụta taya.
Ya mere ikekwe ị ga-ekwere na ndị na-aka rọba dị ka John na-eje ozi dị oké mkpa nke na-emetụta ndụ anyị n’ụzọ dị mma. Otú ọ dị, ọ bụghị rọba nile na-esite n’osisi. Rọba aka mere, nke e ji ọgwụ eme, na-ekere òkè dị ukwuu n’ụlọ ọrụ mmepụta ihe. Ụdị rọba abụọ ahụ nwechara ike na adịghị ike ha. A pụrụ iji nke ọ bụla n’ime ha abụọ mepụta ihe, ọ bụkwa ọnụ ahịa dịnụ na-ekpebikarị nhọrọ a na-eme. A na-eji ngwakọta nke rọba aka mere na rọba osisi emepụta ihe ndị ọzọ. Ihe ka ọtụtụ n’ime taya ụgbọala nwere rọba aka mere karịa rọba osisi. Otú ọ dị, n’ihi na nke aka mere adịghị anagidecha oké okpomọkụ, a na-eji ọ̀tụ̀tụ̀ ka elu nke rọba osisi eme taya ụgbọala egwuregwu ịgba ọsọ, gwongworo, bọs, na ụgbọelu.
Ịka Osisi
Osisi rọba na-eto nke ọma karịsịa n’ọnọdụ ihu igwe okpomọkụ, nke na-ede mmiri n’akụkụ ebe ụwa kewara abụọ. Ọtụtụ n’ime rọba osisi dị n’ụwa na-esite na Ndịda Ebe Ọwụwa Anyanwụ Esia, karịsịa Malaysia na Indonesia. Ndị fọdụrụnụ na-esite na Ndịda America tinyekwara Ebe Ọdịda Anyanwụ na n’Ebe Etiti Africa.
John adịghị aka osisi ruo mgbe osisi ahụ gbara ihe dị ka afọ isii. Mgbe nke ahụ gasịrị, osisi ahụ ga-emepụta rọba ruo 25 na 30 afọ dị n’ihu, ọ ga-etokwa ruo ihe dị ka 20 mita n’ịdị elu. Mgbe osisi rọba “lara ezumike nká” n’imepụta ihe, ọ pụrụ ịnọgide na-eto eto, ruo ịdị elu bụ́ 40 mita, ọ pụkwara ịdị ndụ ruo n’afọ agadi bụ́ 100 afọ ma ọ bụ karị.
Rọba si n’osisi agbapụta kpọmkwem na-eyi mmiri ara ehi kama iyi taya ụgbọala. Ihe a dị ka mmiri ara ehi, bụ́ nke a na-akpọ latex, nwere ụmụ irighiri ihe rọba. Ihe dị ka 35 pasent nke latex ahụ bụ rọba. Ihe fọdụrụnụ na-abụkarị mmiri.
Iji kapụta latex, John na-eji mma akanye otu akara n’uhie nke mkpo osisi. Akara a na-agaru ọkara gburugburu osisi ahụ. Ọ na-elezi anya ka ọ ghara ịkanye akara ahụ n’ụzọ miri emi nke ukwuu, ebe ọ bụ na nke ahụ ga-emebi osisi ahụ. Latex ahụ na-amalite ịgbapụta ozugbo e jisịrị mma kanye akara ahụ; ọ na-agba n’ahịrị nke mma ahụ a kanyere nyere, ma na-asọbanye n’iko e ji achara mee nke John kwụnyere n’osisi ahụ. Oruru ahụ na-aga n’ihu ruo hour abụọ ma ọ bụ atọ; o wee kwụsịzie.
Otu ụbọchị ma ọ bụ abụọ n’ihu, mgbe ọzọ John ga-aka osisi ahụ, ọ ga-eji mma kanye akara ọzọ kpọmkwem n’okpuru nke mbụ. N’oge ọzọ ọ ga-aka mma n’okpuru nke ahụ. N’ikpeazụ, a na-ebepụ otu akụkụ nke mkpo osisi ahụ. Ugbu a John ga-amalite ịka akụkụ ọzọ nke osisi ahụ, na-ahapụ akụkụ ahụ ka o ruchie kpam kpam, bụ́ ebe ọ ga-aka n’ọdịnihu.
John na-arụ ọrụ ọsọ ọsọ, na-aga nanị ya n’ime oké ọhịa ahụ dị jụụ, na-aka osisi ndị ahụ iji mee ka latex gbapụta. E mesịa, ọ na-agaghachi n’osisi nke ọ bụla ma na-awụnye latex ndị gbakọtara n’ime bọket ya. Ọzọ, John na-etinye formic acid na mmiri n’ime latex ahụ. Nke a na-eme ka o sie ike ma kpụkọọ ya dị nnọọ ka mmanya vine gbara ụka si akpụkọ mmiri ara ehi. Mgbe ahụ John na-eburu bọket latex ahụ n’isi pụta n’okporo ụzọ, bụ́ ebe gwongworo sitere n’ụlọ ọrụ na-emegharị rọba nke dịkarịsịrị nso na-abịa eburu ya.
John na-alọta ụlọ ugbu a iji saa ahụ, rie ihe, ma zuru ike. Mgbe chi gamiworo n’ehihie, mgbe ọ na-ahapụ ụlọ ya ọzọ, ọ na-eji ejiji n’ụzọ dị mma ma buru akpa n’aka ya. Ugbu a ọ gaghị adị na-aga site n’osisi ruo n’osisi kama site n’ụlọ ruo n’ụlọ. Dị ka onye ozi bụ́ ọsụ ụzọ oge nile, John na-ekere òkè zuru ezu n’ọrụ nkwusa na nke ime ndị na-eso ụzọ.
Ka John na-eduzi ọmụmụ Bible mbụ ya n’ụbọchị ahụ, latex ndị ahụ ọ wụkọtara ọnụ ga-eruworị ụlọ ọrụ na-emegharị ya. N’ebe ahụ, a ga-ekewa rọba ahụ pụọ n’ebe mmiri dị, mịkpọọ ya, ma pịkọta ya ọnụ n’ùkwù n’ùkwù maka mbupụ. N’oge na-adịghị anya ọ ga-anọ n’ụzọ ya ịga England, Japan, ma ọ bụ United States. Ụlọ ọrụ na-emepụta rọba osisi n’ụwa nile na-emepụta ihe karịrị nde tọn ise nke rọba kwa afọ. Ọ bụ ezie na o nwere ike ọ gaghị abụ, ọ pụrụ ikwe omume na rọba dị n’ike akpụkpọ ụkwụ ọzọ ị ga-enweta ga-esite n’osisi John kara.
[Foto dị na peeji nke 28]
John nọ n’ọrụ n’ebe ọ na-aka osisi rọba
[Foto dị na peeji nke 30]
John na-ekere òkè n’ozi ndị Kraịst