Ikiri Ụwa
Ụmụaka Bụ́ Ndị Agha Okpuru
Ụmụaka na-esokarị n’ime ndị agha okpuru gburugburu ụwa. Dị ka akwụkwọ akụkọ bụ́ International Herald Tribune si kọọ, ụmụaka na-amụta otú e si egbu mmadụ ngwa ngwa, echiche ha nke ihe ọma na ihe ọjọọ esighị ike dị ka ọchịchọ ha nke ịbụ ndị a nabatara n’òtù ndị agha ọ bụla nke ghọrọ ndị òtù ha. “Na Rwanda na n’ebe ndị ọzọ, ndị na-arụ ụfọdụ n’ime arụrụala ndị kasị njọ bụ ụmụaka,” ka otu onye na-ekwuchitere òtù Mba Ndị Dị n’Otu kwuru. “Ha chọrọ isonye n’òtù na ịbụ ndị a na-enye otuto, ndị ọgbọ ha pụkwara ịnakwere ha nanị site n’ịbụ ndị na-adịghị atụ egwu ma ọ bụ ndị arụrụala karịa ndị meworo okenye.” N’otu ọgba aghara e nwere n’Africa, a zụrụ ụmụ okoro ndị gbara nanị afọ asatọ ọzụzụ ma manye ha ịkpa arụ dị iche iche, dị ka ịgbagbu nne na nna ha n’égbè na ibewa ha akpịrị. A manyere ụmụ agbọghọ a tọọrọ isi nri, ihicha ihe, na ime ndị ikom obi ụtọ n’ụzọ mmekọahụ. “Atụmatụ ọnụ ọgụgụ ụmụaka so na-alụ agha ugbu a dị malite na 50,000 ruo ihe ruru 200,000 n’agha 24,” ka magazin bụ́ Newsweek na-ekwu.
Nchebe Cycad
Ọtụtụ ndị ọkà mmụta ihe ọkụkụ na-ele cycad Encephalartos woodii anya dị ka ihe ọkụkụ kasị dị ụkọ n’ụwa. Ya mere mgbe South Africa kpebiri iziga ihe atụ nke ihe ọkụkụ ebe okpomọkụ a nke dị ka ọbọ aka gaa n’Ihe Ngosi Okooko Osisi Chelsea na London n’afọ gara aga, ha mere ihe iji chebe ya site n’ili otu ihe na-egbochi izu ohi bụ́ microchip n’ógwè ya ma jiri mmanụ na-egbu nje tee ya. A na-echebe cycad nile e si na South Africa bute n’ụzọ dị otú a, ka magazin bụ́ New Scientist na-akọ. Iji gbochie ndị ohi, ndị ọkà n’ichebe ihe na South Africa na-echebe cycad ọhịa n’otu ụzọ a ugbu a, site n’enyemaka nke usoro ịchụso ihe nke e ji satelite eme.
Ihe Mkpuchi Nnukwu Mpio Ndị Na-efu Efu
Ihe karịrị 200 mmadụ bi na Beijing danyere ná nnukwu mpio ndị ghere oghe na 1994, ka akwụkwọ akụkọ bụ́ Economic Daily kọrọ. Gịnị kpatara ya? Ndị ohi ezuruwo ihe karịrị 2,000 ihe mkpuchi nnukwu mpio n’okporo àmà dị iche iche nke isi obodo China n’ime afọ ahụ. A sịrị na ọ bụ ndị na-akwagharị akwagharị, ndị a na-akpọ ndị nkwagharị nke China, zuuru ihe ka ọtụtụ n’ime ha. Izu ihe mkpuchi ndị ahụ n’ohi anọwo na-arị elu n’ime iri afọ gara aga tinyere ịrị elu nke ndị na-akwagharị akwagharị nke obodo ukwu ahụ. A pụrụ ire ihe mkpuchi dị 60 kilogram n’arọ n’ọnụ ego karịrị 100 yuan ($12, U.S.). Ndị bi n’ebe ahụ e merụrụ ahụ gụnyere ma ndị ji ụkwụ aga ma ndị na-agba ọgba tum tum.
Nsụgharị Ndị Ọhụrụ nke Bible
“Ntiwapụta nke mbipụta ọhụrụ nke Bible n’asụsụ Bekee ọgbara ọhụrụ na-erute n’ụlọ ahịa ndị na-ere akwụkwọ,” ka magazin bụ́ U.S.News & World Report na-ekwu. E bipụtawo Bible maka ụmụaka, ndị na-eme egwuregwu mmega ahụ, ndị agadi, ndị nne na-arụ ọrụ n’ụlọ, ndị nna, na ìgwè ndị ọzọ. Otu, bụ́ Black Bible Chronicles, “na-eji okwu e ji amata otu òtù na ihe nkiri iji mee ka akụkọ Bible doo ndị dị afọ iri na ụma bụ́ ndị African-American anya.” Ọzọ, bụ́ The New Testament and Psalms: An Inclusive Version, ji okwu na-adịghị akpọ nwoke ma ọ bụ nwanyị aha eme ihe. A kpọrọ Chineke “Nna-Nne,” Nwa nke mmadụ bụkwa “onye bụ mmadụ.” Iji zere ịkpasu ndị na-eme aka ekpe iwe, ndị nsụgharị kpọrọ aka nri Chineke “aka dị ike” ya, n’ihi ihe ndị yikwara ka ha na-egosi ịkpọasị agbụrụ, a dịghịzi e were ọchịchịrị dị ka ihe nnọchianya nke ihe ọjọọ. Nke atọ kwa, bụ́ New International Reader’s Version New Testament, ka onye bipụtara ya na-akọwa dị ka “Bible mbụ e detụrụla n’asụsụ ogo agụmakwụkwọ nke 2.9, nke kasị ala n’ahịa.” Ihe odide ahụ na-ekwubi, sị: “Ná ngụkọta, e nwere ugbu a ihe karịrị 450 nsụgharị Bible n’asụsụ Bekee nanị. N’ihi mbipụta ọhụrụ nile jupụtara n’ụlọ ahịa, o yikarịrị ka Bible agaghị atụfu ọnọdụ ya nke ịbụ akwụkwọ kasị aga ahịa e nwetụrụla.”
Nsogbu Aha
China, nke nwere ihe karịrị 1.2 ijeri mmadụ, na-eche ụkọ nke ụba aha ezinụlọ ihu. Dị ka ndị na-eme nnyocha si ekwu, nanị 3,100 aha ezinụlọ ka e ji eme ihe ugbu a n’ebe ahụ, n’iji ya tụnyere ihe dị ka 12,000 e nwere n’oge gara aga. Ihe dị ka 350 nde mmadụ—nke yiri ngụkọta nke ụba mmadụ na United States na Japan—na-ejirịta aha ezinụlọ ise a na-azakarị eme ihe: Li, Wang, Zhang, Liu, na Chen. Ọzọkwa, a na-azakarịkwa otu aha mbụ ndị ahụ. Na Tianjin, dị ka ihe atụ, ihe karịrị 2,300 mmadụ na-aza aha bụ́ Zhang Li, na-ejikwa otu mkpụrụ okwu ahụ eme ihe, ebe ọtụtụ ndị ọzọ na-eji otu ụzọ ịkpọ okwu eme ihe ma na-eji mkpụrụ okwu dị iche iche na-ede ya. Dị ka ihe si n’ọgba aghara ahụ pụta, e jidewo ọtụtụ ndị mmadụ aka ha dị ọcha, e jiriwo mmehie ihe kachapụ ihe ndekọ dị iche iche nke ụlọ akụ̀, a wawokwa ndị mmadụ na-abụghị ndị e bu n’obi ahụ n’ụlọ ọgwụ. Republic of Korea na-enwekwa nsogbu yiri nke ahụ. Otu nnyocha e mere na 1987 gosiri na 1 n’ime mmadụ 5 ọ bụla n’ebe ahụ nwere Kim dị ka aha ezinụlọ ha. A machibidoro alụmdi na nwunye nke ndị nwere otu aha ezinụlọ iwu iji gbochie ọmụmụ nke ndị si n’otu ọbara. Nke a mere ka ọtụtụ di na nwunye na-ebikọ ọnụ n’edejupụtaghị akwụkwọ alụmdi na nwunye, wee si otú a ghara iru eru maka inshọransị na ego enyemaka ndị ọzọ. Otú ọ dị, ụlọikpe kasị elu ná mba ahụ ekpebiwo ugbu a na a ga-ewere alụmdi na nwunye dị otú ahụ nke ndị nwere otu aha dị ka ndị iwu kwadoro ma ọ bụrụ na di na nwunye ahụ buru ụzọ lụọ n’ofesi.
E Bowo Ndị Inyom Rwanda Ebubo
Ndị inyom, tinyere ndị ikom, aghaghị ịbụ ndị ụta dịịrị maka ogbugbu nke ma ọ dịkarịa ala 500,000 mmadụ na Rwanda na 1994, ka otu òtù a haziri na London bụ́ Ihe Ruuru Africa na-azọrọ. “Ndị inyom gburu ọtụtụ puku ndị inyom ọzọ,” ka akụkọ ha na-ekwu. “Ókè ndị inyom keere òkè dị ukwuu n’igbu ọchụ ndị ahụ enweghị atụ. Nke a adapụtaghị na mberede. Ndị kpara nkata oké mgbukpọ ahụ gbalịrị ime ka ọnụ ọgụgụ dị ukwuu nke ụmụ mmadụ, dị ka o kwere omume, tinye aka—ndị ikom, ndị inyom na ọbụna ụmụaka ndị gbara nanị afọ asatọ. Ha gara n’ihu ikepụta mba nke ndị na-emebiga ihe ókè ndị e ji ọbara nke mgbukpọ nke agbụrụ jikọọ.” Ọtụtụ n’ime ndị inyom tinyere aka na ya nọ n’ọkwá ọrụ dị elu—ndị minista ọchịchị, ndị ọchịchị ógbè dị iche iche, ndị nọn, ndị nkụzi, na ndị nọọsụ. Ụfọdụ keere òkè n’ogbugbu ahụ, na-eji mma na égbè, ebe ndị ọzọ mere ihe igosi nkwado site n’iji iti mkpu na-akwado ndị ikom ahụ na-egbu mmadụ, site n’ikwere ka ha bata n’ebe obibi na ụlọ ọgwụ dị iche iche, na site n’ịkwakọrọ ngwongwo pụọ n’ụlọ na iyipụ ndị nwụrụ anwụ uwe.
Ihe E Kere Eke Ndị Na-edebe Ihe Ọcha
Ụfọdụ ihe ọkụkụ na-amị mkpụrụ na-egosi ikike na-atụ n’anya n’ihicha na ime ka ájá ọzara mmanụ metọworo dịghachi mma, ka akwụkwọ akụkọ The Times nke London na-ekwu. Ndị ọkà mmụta sayensị achọpụtawo na n’ebe mmanụ na-erughị pasent 10 nke ájá n’ịdị arọ, ihe ọkụkụ ndị a pụrụ ito nke ọma, mkpọrọgwụ ha na-adịgidekwa ọcha n’ụzọ zuru ezu. N’ihi gịnị? Ọtụtụ nde nje bi na gburugburu mkpọrọgwụ ihe ọkụkụ ahụ na-amịkọrọ mmanụ ma na-agbarikwa ya ka ọ bụrụ ihe ndị na-adịghị emerụ ahụ. Ihe ọkụkụ ndị a sitere n’ìgwè ihe ọkụkụ ndị kasị baa ụba, bụ́ Compositae, nke na-agụnye daisy, aster, na ọtụtụ ahịhịa. Ndị ọkà mmụta sayensị na-atụ aro ka a kụọ ndị a iji mee ka nhicha a na-ehicha ọzara na Kuwait gaa ngwa ngwa. Afọ anọ mgbe agha e soro Iraq lụọ gasịrị, ihe dị ka 50 kilomita n’obosara nke ọzara ka bụ nke e metọrọ emetọ.
Iji Isi Ha Eme Ihe
“Ndị inyom Africa na-ebu ite mmiri ma ọ bụ ite nri ndị dị arọ dị ka a ga-asị na ha ebughị ihe ọ bụla maa gaa ije ọtụtụ maịlụ,” ka magazin bụ́ Discover na-ekwu. “Ndị nchọpụta achọpụtawo na ndị inyom pụrụ ibu nnukwu ibu n’ejighị ike ọ bụla ọzọ mee ihe.” Ụfọdụ ndị inyom Kenya pụrụ ibu ihe ruru 20 pasent nke ịdị arọ ha n’etinyekwughị mgbalị. Olee otú ha si eme ya? Site n’iburu “ibu arọ ha n’ụzọ dị nnọọ irè karịa ndị mmadụ ibu ibu dị arọ n’azụ ma ọ bụ ndị mmadụ a na-enyebeghị ọzụzụ iji isi ha ebu ihe,” ka magazin bụ́ New Scientist na-aza. “Ndị ahụ na-eme nchọpụta kwenyere na ihe bụ isi na-enye aka bụ ụzọ ịga ije ná nṅagharị nke ndị inyom ahụ.” Mgbe anyị na-aga ije, anyị na-eyi eriri e kenyere n’elu nke na-aṅagharị aṅagharị, na-ebufe ụfọdụ n’ime ike anyị ná nzọụkwụ nke ọzọ. Nye ndị Europe, ịdị irè nke mbufe ike nke a na-ebelata ka ibu ahụ na-adịwanye arọ. Ma nye ndị inyom Africa na-ebu ibu n’isi ha, ịdị irè ya na-amụba nnọọ amụba, nke na-eme ka uru ahụ ha ghara inwe ike ịrụ ọrụ ọzọ. Otú ọ dị, ọ na-ewe ọtụtụ afọ iji mụta nkà ahụ nke ọma.
“Mgbaàmà Ọrịa Jerusalem”
Ọ bụ “ihe otiti nke ndị na-eme njem nleta bụ́ ndị, n’ịbụ ndị oké mkpali ime mmụọ siri ike nke obodo ukwu ahụ rikpuru, abụrụwo ndị e mere ka ha kwere na ha bụ Onye Nzọpụta ahụ, ma ọ bụ onye ọzọ a ma ama n’ime Bible, ma ọ bụ na Chineke enyewo ha ozi ma ọ bụ iwu pụrụ iche,” ka magazin bụ́ Time na-ekwu. “Ihe ka ọtụtụ n’ime ha nwere akụkọ ahụ ike nke nsogbu uche.” Otu onye Itali gbara afọ ọnụ, onye a hụrụ ka o yi uwe mwụda na-awagharị n’ebe dị nso na Betlehem, zọọrọ na ya bụ Jisọs. Otu onye gba ọtọ, nke ji mma agha n’aka, na-agbafe n’etiti Obodo Ukwu Ochie ahụ, na-asị na ya nwere ọrụ nke ịgwọ ndị kpuru ìsì. Otu nwoke gbara dimkpa bụ́ onye Canada sịrị na ya bụ Samson ma “gosipụta” ya site n’ịdọkapụ ihe mgbochi window e ji ígwè mee n’ọnụ ụlọ ndị ọrịa n’ụlọ ọgwụ ya ma na-agbalaga. A na-ebugakarị ndị nwere mgbaàmà ọrịa ahụ n’Ụlọ Ọgwụ Isi Mgbaka Kfar Shaul nke dị na Jerusalem—ọ bụghị ka a gwọọ ha kama ime ka ahụ dajụọ ha ka ha wee laghachi n’ụlọ maka ọgwụgwọ. Ụlọ ọgwụ ahụ na-ahụ ihe dị ka 50 ụdị ndị ọrịa dị otú ahụ n’otu afọ, karịsịa site n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Europe na United States.