Ụmụ Obere Ihe Ị̀ Na-ewe Ha n’Ihe Dị Mkpa?
“ỤMỤ obere ihe dị mkpa nke ukwuu. Nke ahụ bụ okwu ndị dị n’otu abụ a maara nke oma. N’ụzọ kwekọrọ na nke ahụ, Onye ozizi kasị nwee amamihe n’ụwa kwuru n’otu mgbe gara aga, sị: “Onye kwesịrị ka a tụkwasị ya obi n’ihe dịkarịsịrị nta kwesịkwara ka a tụkwasị ya obi n’oké ihe.”—Luk 16:10.
Ụmụ obere ihe pụrụ nnọọ ịdị mkpa nke ukwuu. N’eziokwu, ọ bụ ụmụ obere ihe dị iche iche mejupụtara ụwa. Ma, ọtụtụ mgbe ọ na-adị ka à na-eduru anyị jee n’ilefuru ha anya n’ihi na ha dị nta.
Ụmụ Obere Ihe Ndị Dị Mkpa
Otu obere ihe dị nnọọ nta, nke onye ọ bụla n’ime anyị na-agaghị anọ ebe a ma e wezuga ya, bụ àkwá ahụ nke mkpụrụ ndụ banyeworo n’ime ya nke dị n’usoro ọmụmụ nwa. Russell Colman, onye Australia bụ injinịa, kpọrọ akụkụ ya bụ isi “ihe pụrụ ịbụ ihe dị ịtụnanya nke kasị dị n’usoro dị n’eluigwe na ala a ma ama, nke na-agbanwe ụmụ irighiri ihe ndị dị mfe gaa n’ịghọ mmadụ ndị ọtụtụ ihe mejupụtara, ndị nwekwara ọgụgụ isi.”
Ihe mejupụtara ahụ anyị bụ 100 trillion ụmụ irighiri mkpụrụ ndụ. Usoro DNA dị n’ime nke ọ bụla n’ime ụmụ irighiri mkpụrụ ndụ ndị a nwere n’ime ha ihe ọmụma nke ga-ejupyta ọtụtụ puku peji akwụkwọ ma ọ bụrụ na e bipụta ha!
Gịnịkwanụ banyere atom ahụ. nke e cheburu na a pụghị ikewa ekewa? A kọwawo nwa obere ihe nke a e ji ewulite ihe dị ka akụkụ kasị dị nta nke ihe ọ bụla nke na-ejigide mmiri ọgwụ ndị e ji mara ya. Ụmụ irighiri electron gbara akụkụ etiti ya dị nta, nke a na-akpọ nucleus, gburugburu, nke na 99.9999999999999 pasenti nke atom ahụ bụ ohere tọgbọrọ n’efu!
Ọ bụrụ na e jiri anyị bụ mmadụ tụnyere eluigwe na ala a ma ama, anyị dị nnọọ nta nke ukwuu. Dị ka ihe atụ, mgbe anyị tụlere eziokwu ahụ nke bụ na mbara ala anyị bụ́ ụwa ji 333,000 okpukpu dị nta karị anyanwụ anyị, bụ́ nke bụkwa kpakpando na-ebughị oké ibu nke dị n’ime otu n’ime ọtụtụ ijeri ụyọkọ kpakpando a na-apụghị ịgụta ọnụ ndị dị na mbara
eluigwe, ọ̀ bụ na a ḍighi echetara anyị otú anyị si dị nnọọ nta ma
ọ bụrụ na e jiri anyị tụnyere ihe
a nile?
Ọbụna na a pụrụ ikewa oge n’onwe ya, ọ bụ ezie na ọ dịghị agwụ agwụ, gaa n’ọ̀tụ̀tụ̀ ndị dị nta. Ọtụtụ millisecond na-emejupụta otu sekọnd, ọtụtụ sekọnd na-emejupụta otu minit, ọtụtụ minit na-emezu awa, otú ahụkwa ka ọ na-agagide ruo n’ogologo oge ndị a na-apụghị ịka aka, n’enweghị ọgwụgwụ. N’ihe omume ndị metụtara egwuregwu, ọbụna nkera nke otu sekọnd pụrụ ịbụ ọdịiche dị n’etiti inwe mmeri na ịbụ onye e meriri
emeri.
Obi Ụtọ Site n’Ụmụ Obere Ihe
N’etiti ndị bụ enyi, ụmụ obere ihe na-adị mkpa nke ukwuu n’ihi na ha na-ewusi mmekọrịta ndị na-adịgide adịgide ike. N’alụmdi na nwunye, ọ na-abụkarị ụmụ obere ihe—okwu ndị e chepụtara nke ọma, ile anya, ma ọ bụ ihe omume—na-eme ihe dị ukwuu n’ime ka njikọ ahụ bụrụ nke obi ụtọ na nke ịhụnanya. N’aka nke ọzọkwa, ileghara “ụmụ obere ihe” ndị ahụ anya n’ụzọ ezi echiche na-adịghị ya pụrụ itolite, ọbụna ruo n’ókè ịkpata nnukwu nsogbu ndị na-aghasa alụmdi na nwunye.
Okwukwe na ikwesị ntụkwasị obi, ndị bụ àgwà ndị dị mkpa n’onwe ha, bụ ihe a na-egosipụta ọtụtụ mgbe n’ụzọ ndị dị nta. Ma, chee echiche banyere nnukwute nkwụghachi ụgwọ, afọ ojuju, na obi ụtọ ngosipụta ndị a dị nta nke ntụkwasị obi na ịbụ onye a pụrụ ịdabere na ya pụrụ iweta.
Ee, a na-ejikọkarị ịdị mkpa dị ukwuu na ụmụ obere ihe. Otú ọ dị, ma ihe ò buru ibu ma ọ bụ na ọ dị nta na-adabere n’uzọ e si lee ya anya, ọ bụkwa onye na-eme ntụle ahụ na-amakarị otú ọ hà. Otú o sina dị, ma ọ̀ bụ okwu na-egosi ịhụnanya, àgwà ndị dị n’ime onwe anyị, ma ọ bụ ụmụ irighiri ihe ndị na-akwado ndụ, nye ndị nwere obi ekele, ‘ụmụ obere ihe dị mkpa nke ukwuu n’ezie.’
[Foto ndị dị na peeji nke 31]
Ụmụ obere ihe ndị dị mkpa a pụrụ imere ndị ọzọ