Ihe Ndị Dị n’Akwụkwọ Abụ Ọma
Abụ Mgbago.
134 Unu niile bụ́ ndị ohu Jehova,+
Unu ndị na-eje ozi n’ụlọ Jehova n’abalị,+
Toonụ Jehova.
2 Bụrụnụ ndị dị nsọ mgbe unu na-eweli aka unu na-ekpe ekpere,+
Tookwanụ Jehova.
3 Ka Jehova, Onye kere eluigwe na ụwa,
Si na Zayọn gọzie gị.