Abụ Ọma
116 M hụrụ Jehova n’anya
Maka na ọ na-anụ olu m. Ọ na-anụ arịrịọ m na-arịọ ka o nyere m aka.+
3 Ọnwụ kere m ụdọ gburugburu.
Ọ dị m ka à ga-asị na ili* jichiri m.+
Nsogbu zuru m ahụ́, m nọkwa na-eru naanị uju.+
4 Ma m kpọkuru Jehova, kpọọ aha ya, sị:+
Chineke anyị na-eme ebere.+
6 Jehova na-echebe ndị na-amaghị ihe.+
E mere ka ike gwụ m, ma ọ zọpụtara m.
7 Ka mkpụrụ obi m* zuo ike ọzọ,
N’ihi na Jehova emesola m ihe otú dị mma.
8 Ị napụtala m* n’aka ọnwụ.
I mere ka m kwụsị ibe ákwá, meekwa ka m ghara ịkpọbi ụkwụ.+
9 M ga-adị ndụ na-efe Jehova.*
10 Ekwuru m okwu maka na m nwere okwukwe.+
E mekpara m ahụ́ nke ukwuu.
11 Ma ụjọ tụrụ m, mụ asị:
“Mmadụ niile bụ ndị ụgha.”+
12 Gịnị ka m ga-eji kwụọ Jehova ụgwọ
Maka ihe ọma niile o meere m?
13 M ga-aṅụ ihe dị n’iko iji kelee ya maka na ọ zọpụtara m,*
M ga-akpọkukwa aha Jehova.
14 M ga-emezu nkwa m kwere Jehova.
M ga-anọ n’ihu ndị ya niile mezuo ya.+
16 Jehova, m na-arịọ gị arịrịọ
N’ihi na abụ m ohu gị.
Abụ m ohu gị, nwa ohu gị nwaanyị.
Ị tọpụla m agbụ e kere m.+
17 M ga-achụrụ gị àjà ekele.+
M ga-akpọku aha Jehova.
18 M ga-emezu nkwa m kwere Jehova.+