Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
b A kọwara nchegbu a na-ekwu maka ya n’ebe a dị ka “nchegbu na-abịa n’ihi ụjọ, bụ́ nke na-eme ka mmadụ ghara inwe ọṅụ ná ndụ.” Ụfọdụ nsụgharị na-asị “unu echegbula onwe unu.” Ma nsụgharị dị otú ahụ na-enye echiche na anyị ekwesịghị ịmalite ichegbu onwe anyị. Otu akwụkwọ ntụaka na-ekwu, sị: “Ọdịdị okwu ngwaa Grik ahụ bụ iwu nọ n’ụdị okwu bụ́ nke na-egosi ihe ndị na-eme ugbu a, na-enye iwu ka a kwụsị ime ihe a maliteworo ime.”