Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
a N’otu akwụkwọ ozi o degara n’Ebe Obibi Ego nke U.S., nke akara ụbọchị ya bụ November 20, 1861, Odeakwụkwọ Ngalaba Ndebe Akụ̀ bụ́ Salmon P. Chase dere, sị: “Ọ dịghị mba pụrụ isi ike ma ọ bụghị site n’ike Chineke na-enye, ma ọ bụ nọrọ ná nchebe ma ọ bụghị site ná nchebe Ya. E kwesịrị ibi ntụkwasị obi ndị obodo anyị nwere n’ebe Chineke nọ ná mkpụrụ ego mba anyị.” N’ihi ya, e biri ụkpụrụ nduzi ahụ bụ́ “Na Chineke Ka Anyị Tụkwasịrị Obi” nke mbụ ya ná mkpụrụ ego U.S. e nwere na 1864.