Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
c N’oge ndị nna ochie, onyeisi ezinụlọ ọ bụla na-anọchite anya nwunye ya na ụmụ ya n’ihu Chineke, ọbụna na-achụ àjà n’aha ha. (Jenesis 8:20; 46:1; Job 1:5) Otú ọ dị, mgbe e guzobere Iwu ahụ, Jehova họpụtara ndị ikom sitere n’ezinụlọ Erọn dị ka ndị nchụàjà bụ́ ndị e kwesịrị isi n’aka ha na-achụ àjà. O doro anya na ndị nnupụisi 250 ahụ adịghị njikere ịkwado mgbanwe a e mere n’usoro e ji eme ihe.