Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
a The New English Bible na-asụgharị Abụ Ọma 96:1 ịbụ: “Bụkuonụ ONYENWE ANYỊ abụ, mmadụ nile nọ n’ụwa.” The Contemporary English Version na-agụ, sị: “Onye ọ bụla nọ n’ụwa a, bụkuo ONYENWE ANYỊ abụ otuto.” Nke a kwekọrọ ná nghọta bụ́ na site n’ikwu “ụwa ọhụrụ” Aịsaịa na-ezo aka n’ebe ndị Chineke nọ, bụ́ ndị laghachiworo n’ala ha.