Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
a N’ụzọ dị ukwuu ọ bụ ndị Farisii kpatara ụdị okpukpe ndị Juu e nwere taa, ya mere ọ bụghị ihe ijuanya na okpukpe ndị Juu ka na-achọ ụzọ isi zere ọtụtụ n’ime iwu Ụbọchị Izu Ike ya ndị a gbakwụnyere. Dị ka ihe atụ, onye jere ileta ụlọ ọgwụ okpukpe ọdịnala ndị Juu n’Ụbọchị Izu Ike pụrụ ịchọpụta na ígwè mbugo na-eji aka ya akwụsị n’okpukpu ụlọ elu ọ bụla ka ndị o bu nwee ike izere ịrụ “ọrụ” mmehie nke ịpị bọtịn ígwè mbugo aka. Ụfọdụ ndị dọkịta bụ́ ndị okpukpe ndị Juu na-eji ink ga-ehichapụ n’ụbọchị ole na ole edepụta ọgwụgwọ a ga-enye onye ọrịa. N’ihi gịnị? Mishnah na-agụnye ide ihe dị ka “ọrụ,” ma ọ na-akọwa “ide ihe” dị ka ịhapụ akara ga-adịgide adịgide.