Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
b N’ihe dị ka n’afọ 760 O.A., otu ìgwè ndị Juu a maara dị ka ndị Karait chọrọ ka e nwee nrapagide siri ike karị n’Akwụkwọ Nsọ. N’ịjụ ikike nke ndị rabaị, “Iwu E Nyere n’Ọnụ,” na Talmud, ha nwere ihe ka ukwuu mere ha ga-eji jiri oké nlezianya chebe ihe odide Bible. Ezinụlọ ụfọdụ site n’ìgwè a ghọrọ ndị Masoret bụ́ ọkà n’idepụtaghachi ihe.