Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
a Ebe ọtụtụ ndị Juu na-anọghị n’Israel na-abụkwaghị ndị na-agụ Hibru werewere, ógbè ndị Juu dị otú ahụ dị ka nke dị n’Alexandria, Ijipt, hụrụ n’oge na-adịghị anya mkpa ọ dị ịsụgharị Bible gaa n’asụsụ ala ahụ. Iji gboo mkpa a, a kwadebere nsụgharị Septuagint nke Grik na narị afọ nke atọ T.O.A. Nsụgharị nke a ga-emesịa ghọọ isi iyi dị mkpa maka iji otu ihe odide tụlee ibe ya.