Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
b Ndị Israel maara banyere usoro nke ịgbaze ígwè. A chọtawo ebe ụfọdụ ha si gwupụta ọla, a gbazekwara ọla iji mepụta ngwá ọrụ e ji eme ihe n’ụlọ nsọ. (Tụlee 1 Ndị Eze 7:14-46.) O yiri ka ọ bụ ihe na-ekweghị omume na e ji usoro ịgbaze ihe nke a mee ihe n’akpataghị ọ̀tụ̀tụ̀ ụfọdụ nke mmetọ n’ụdị nke anwụrụ, unyi a gbazepụtara, na iberibe ígwè, nke nwere ma eleghị anya nsogbu ndị ọ kpatara. Ma, ọ pụtara ìhè na Jehova dị njikere ịnagide ọ̀tụ̀tụ̀ dị nta nke adịghị ọcha ógbè n’ime ókèala nke a ndị mmadụ bisasịrị ebisasị, nke dịpụkwara iche.