Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
c Otu ihe mere ka aka ná ntị ahụ a dọrọ ghara ịdacha ike ike bụ na e kwuru na ndị ọ gbasara karịchaa bụ ìgwè atụrụ nta, ya bụ, otu narị puku na iri puku anọ na puku anọ. N’isi nke ise n’akwụkwọ a, a ga-agwa anyị na tupu afọ 1935, Ndị Mmụta Baịbụl chere na ndị chọọchị Krisendọm so ‘n’oké ìgwè mmadụ’ ahụ e kwuru okwu ha ná Mkpughe 7:9, 10. Ha chekwara na ndị chọọchị Krisendọm a bụ ndị nke abụọ Kraịst ga-akpọrọ laa eluigwe n’ihi na ha kwadoro ya n’ụbọchị ahụ ọ ga-abịa.