Ihe Ga-enyere Gị Aka Ka Ị Kwusịlata Ichegbu Onwe Gị
Ọ bụrụ na ị na-echegbu onwe gị nke ukwuu, o nwere ike ime ka ị rịawa ọrịa ma ọ bụ mee ka obi na-ajọ gị njọ. O nwedịrị ike ịkpatara gị nsogbu karịrị nsogbu ahụ mere i ji na-echegbu onwe gị.
Ihe ụfọdụ ga-enyere gị aka ka ị ghara ịna-echegbu onwe gị
Gbaa mbọ ka ị ghara ịna-egekarị ma ọ bu na-elekarị akụkọ ọjọọ. Ọ bụghị iwu na ị ga-amatacha ihe niile gbasara ihe ọjọọ ọ bụla merenụ. Ụjọ ga na-atụ gị, obi ana-ekokwa gị n’elu ma ị na-ege akụkọ ọjọọ mgbe niile.
Ihe Baịbụl kwuru: “Obi ọjọọ na-eme ka ike na-agwụ mmadụ.”—Ilu 17:22.
“Ọ naghị ara ahụ́ ya amara mmadụ ahụ́ ịna-aga n’Ịntanet mgbe niile ka ọ hụ ihe ndị kacha ọhụrụ nakwa ihe ndị na-awụ akpata oyi dị ebe ahụ, ma ịna-eme ihe a adịghị mma. Mgbe ọ bụla m belatara ige akụkọ ụwa, m na-akwụsịlata ichegbu onwe m.”—John.
Ihe ị ga-echebara echiche: Ọ̀ bụ iwu na ị ga-amatacha gbasara ihe ọhụrụ ọ bụla merenụ?
Nwee oge i ji eme ihe dị iche iche. Gbaa mbọ nwee oge a kapịrị ọnụ ị ga-eji na-eteta ụra, na-eri nri, na-arụ ọrụ ndị dị n’ụlọ, ma na-alakpu ụra. I nwee oge i ji eme ihe dị iche iche, ọ ga-eme ka ahụ́ kpakọọ gị ọnụ, meekwa ka ị kwụsịlata ichegbu onwe gị.
Ihe Baịbụl kwuru: “Atụmatụ onye na-arụsi ọrụ ike ga-eme ka ihe gaziere ya.”—Ilu 21:5.
“Mgbe ọrịa koronavaịrọs malitere, m kwụsịrị ime ihe dị iche iche n’oge m na-ejibu eme ha, malitekwa iji oge karịrị akarị atụrụ ndụ. Ma, ebe ọ bụ na m chọrọ iji oge m na-eme ihe bara uru, m depụtara oge m ga-eji na-eme ihe ndị m kwesịrị ime n’ụbọchị edepụta.”—Joseph.
Ihe ị ga-echebara echiche: Ị̀ haziri oge ị ga-eji na-eme ihe ndị dịịrị gị n’ụbọchị otú ọ ga-abụ ná ngwụcha ụbọchị ọ bụla, obi adị gị mma na i ji ụbọchị ahụ mee ihe bara uru?
Lekwasị anya n’ihe ọma ndị na-eme ná ndụ gị. Ọ bụrụ na ihe ị na-eche mgbe niile bụ ihe ndị ị na-emetaghị n’oge gara aga ma ọ bụ ihe ọjọọ ndị nwere ike ime n’ọdịnihu, ị ga na-echegbukwu onwe gị. Kama ịna-eche ihe ndị ahụ, na-eche gbasara ihe abụọ ma ọ bụ atọ na-eme gị obi ụtọ.
Ihe Baịbụl kwuru: “Gosikwanụ na obi dị unu ụtọ maka ihe e meere unu.”—Ndị Kọlọsi 3:15.
“Ịgụ Baịbụl na-eme ka m na-eche ihe ndị dị mma ma ghara itinye uche n’ihe ndị na-eme mmadụ obi ọjọọ. Ihe a nwere ike ịdị ka egwuregwu, ma ọ na-enyere m aka.”—Lisa.
Ihe ị ga-echebara echiche: Ị̀ na-echekarị gbasara ihe ọjọọ ndị na-eme ná ndụ gị ma leghara ihe ọma ndị na-emere gị anya?
Na-eche gbasara ndị ọzọ. Ndị na-echegbu onwe ha na-achọkarị ịnọrọ onwe ha. Ma, kama ịna-anọrọ onwe gị, chee otú i nwere ike isi na-enyere ndị ọzọ nwere mkpa aka.
Ihe Baịbụl kwuru: “Unu achọla ihe ga-adị naanị onwe unu mma, kama na-achọkwanụ ihe ga-adị ndị ọzọ mma.”—Ndị Filipaị 2:4.
“Imere ndị ọzọ ihe ọma na-eme m obi ụtọ. Ka m na-eme ihe ga-eme ka obi dị ha mma, ọ na-eme ka mụnwa kwụsịlata ichegbu onwe m. N’eziokwu, inyere ndị ọzọ aka na-ewekọrọ oge m nke na anaghịzi m enwe oge m ga-eji na-echegbu onwe m.”—Maria.
Ihe ị ga-echebara echiche: N’ime ndị niile ị ma, è nwere ndị e kwesịrị inyekwuru aka, gịnịkwa ka i nwere ike ime iji nyere ha aka?
Na-eme ihe ndị ga-eme ka ahụ́ gbasie gị ike. Na-ewepụta oge emega ahụ́ ma na-ezu ike. Na-eri nri na-edozi ahụ́. Ime ihe ndị a nwere ike ime ka ike ụwa ghara ịna-agwụ gị, meekwa ka ị ghara ịna-echegbu onwe gị.
Ihe Baịbụl kwuru: ‘Mmadụ imega ahụ́ bara uru.’—1 Timoti 4:8, ihe e dere n’ala ala peeji amaokwu a.
“Mụ na nwa m nwoke na-anọ n’ime ụlọ emega ahụ́ mgbe ọ bụla maka na anyị agaghị anọli n’èzí na-eme ya otú anyị chọrọ. Ihe a emeela ka anyị na-enwekwu obi ụtọ, meekwa ka otú anyị si emeso ibe anyị kakwuo mma.”—Catherine.
Ihe ị ga-echebara echiche: Ì kwesịrị ịgba mbọ na-erikwu nri na-edozi ahụ́ ma na-emegakwu ahụ́ ka ahụ́ nwee ike ịdịkwu gị mma?
E wezụga ihe ndị a anyị kwuru ga-enyere mmadụ aka ịkwụsịlata nchegbu, ihe ọzọ na-enyekwara ọtụtụ ndị aka bụ ịmata ọmarịcha nkwa ndị Baịbụl kwere na ihe ga-adị mma n’ọdịnihu. Gụọ isiokwu bụ́ “Gịnị Ka Alaeze Chineke Ga-eme?”