MEE 4 RUO 10, 2026
ABỤ NKE 53 Ịkwadebe Maka Ozi Ọma
Na-eme Ka Otú I Si Akụzi Ihe n’Ozi Ọma Kakwuo Mma
‘Kwusaa okwu Chineke. Na-enwe ndidi ka ị na-eme ya, na-emekwa ya ka onye bụ́ aka ochie n’ịkụzi ihe.’—2 TIM. 4:2.
IHE A GA-AMỤ
Ihe atọ anyị ga-eme ga-enyere anyị aka ịna-eme ka otú anyị si akụzi ihe n’ozi ọma kakwuo mma.
1. Gịnị ka anyị kwesịrị ịmụta? Maka gịnị? (2 Timoti 4:2) (Kọwaakwa foto.)
JIZỌS sịrị ndị na-eso ụzọ ya: “Gaanụ mee ndị mba niile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ m. . . . Na-ezi ha ka ha debe ihe niile m nyere unu n’iwu.” (Mat. 28:19, 20) Iwu a gosiri na Ndị Kraịst niile kwesịrị ịna-akụziri ndị ọzọ ihe. Nke bụ́ eziokwu bụ na Jehova na-adọta ndị “na-akpa àgwà otú na-egosi na ha chọrọ inweta ndụ ebighị ebi,” ndị mmụọ ozi ana-enyekwara anyị aka ịchọta ha. (Ọrụ 13:48; Jọn 6:44; Mkpu. 14:6) Ma, anyị kwesịrị ịmụta otú e si akụziri ndị mmadụ gbasara Jehova. Legodị ihe Pọl na Banabas mere. Baịbụl kwuru na mgbe ha na-ezi ozi ọma n’ụlọ nzukọ dị n’Aịkoniọm, ha ‘kwuru okwu otú mere ka ọtụtụ ndị, ma ndị Juu ma ndị Grik, ghọọ ndị na-eso ụzọ Jizọs.’ (Ọrụ 14:1) O doro anya na Pọl na Banabas aghọọla “aka ochie n’ịkụzi ihe.” (Gụọ 2 Timoti 4:2.) Ndị Kraịst niile kwesịrị ịmụta otú e si akụzi ihe nke ọma.
Anyị ga-amụta ịkụzikwu ihe nke ọma n’aka Jizọs na ndị na-eso ụzọ ya, dị ka Pọl na Banabas (A ga-akọwa ya na paragraf nke 1)
2. Gịnị nwere ike ime ka ụfọdụ Ndị Kraịst chee na ha agaghị amụtali ịkụzi ihe nke ọma?
2 Ụfọdụ ndị nwere ike ịna-eche na ha agaghị amụtali otú e si akụzi ihe nke ọma n’ihi na ha agụghị oké akwụkwọ ma ọ bụ na ha amaghị otú e si akọwara mmadụ ihe nke ọma. Ụfọdụ ụmụ nwoke a kọrọ akụkọ ha na Baịbụl chekwara na ha agaghị arụli ọrụ e nyere ha. (Ọpụ. 4:10; Jere. 1:6) Ụfọdụ nwere ike ịna-eche na ha amaghị otú e si akụzi ihe n’ihi na ha enweghị onye ha na-amụrụ Baịbụl ma ọ bụkwanụ na a naghị ege ha ntị otú e si ege ndị ọzọ. Nke bụ́ eziokwu bụ na ọ bụghị onye ọ bụla anyị hụrụ n’ozi ọma ga-ege anyị ntị. Ihe na-emekwa ka ndị mmadụ na-ege anyị ntị abụghị naanị maka na anyị ma akụzi ihe. Dị ka anyị kwurula, Jehova na ndị mmụọ ozi ya na-eme ka anyị chọta ndị nwere ezi obi. N’agbanyeghị ya, anyị chọrọ ịna-eme ike anyị niile izi ndị mmadụ ozi ọma otú ọ ga-amasị ha. Iji nyere anyị aka ime ya, isiokwu a ga-ekwu ụzọ ebe atọ anyị ga-emekwu nke ọma n’ịkụzi ihe n’ozi ọma.
GOSI NDỊ MMADỤ NA IHE GBASARA HA NA-EMETỤ GỊ N’OBI
3. Gịnị mere Jizọs ji kwuo ihe ruru ndị mmadụ n’obi?
3 Baịbụl kwuru na Jizọs “ma ihe dị mmadụ n’obi.” (Jọn 2:25) Ihe ọ pụtara bụ na Jizọs ma ihe ndị mmadụ na-eche na ihe mere ha ji eche otú ahụ. Ọ ghọtara nke ọma ihe bụ́ mkpa ha. Ọ bụ ya mere o ji kwuo ihe ruru ha n’obi. Ọ chọpụtara na a naghị eduzi ndị mmadụ ma na-akasi ha obi. Ndị isi okpukpe ha ji ọtụtụ iwu na omenala bo ha ibu dị arọ. (Mat. 9:36; 23:4) N’ihi ya, Jizọs nyeere ndị mmadụ aka ma kụziere ha ihe ga-eme ka ndụ ha ka mma. Anyị ga-ahụ otú o si mee ya n’ihe ọ kụziiri ha n’elu ugwu. Ọ na-amasị ọtụtụ ndị ige Jizọs ntị n’ihi na ọ na-agwa ha banyere ihe ndị na-echegbu ha.
4. Olee otú anyị ga-esi gosi ndị mmadụ na ihe gbasara ha na-emetụ anyị n’obi? (Kọwaakwa foto.)
4 Otú anyị ga-esi gosi na ihe gbasara ndị anyị hụrụ na-emetụ anyị n’obi bụ ịgbalị ghọta ihe na-echegbu ha. E nwere ọtụtụ ihe ọjọọ na-eme n’ụwa Setan a. N’ihi ya, onye ọ bụla anyị hụrụ n’ozi ọma nwere nsogbu nke ya. Anyị buru ihe a n’obi, ọ ga-eme ka anyị na-emetere ndị anyị gara izi ozi ọma ebere. Dị ka ihe atụ, è nwere okwu a kpụ n’ọnụ ndị anyị na-ezi ozi ọma na-eche banyere ya? Ndị nne na nna hà na-echegbu onwe ha banyere ihe nwere ike ime ụmụ ha n’ụlọ akwụkwọ? Ọ̀ na-esiri ọtụtụ ndị ike ịchọta ọrụ? Gbalịa chee otú ihe si dịrị ndị na-enweghị olileanya si na Baịbụl ‘n’oge a dị oké egwu.’—2 Tim. 3:1; Aịza. 65:13, 14.
Gbalịa ka ị ghọta otú ihe si dịrị ndị ị na-akụziri ihe, na-egosikwa ha na ihe gbasara ha na-emetụ gị n’obi (A ga-akọwa ya na paragraf nke 4)
5. Olee otú Jizọs si dị iche ná ndị Farisii? (Matiu 11:28-30)
5 Jizọs hụrụ ndị ọ kụziiri ihe n’anya. Ha sikwa n’otú o si meso ha chọpụta ya. O metụdịghị ka ndị Farisii, ndị na-eleda ndị mmadụ anya ma na-ewere ha ka ndị na-enweghị uru ha bara. (Mat. 23:13; Jọn 7:49) Kama, ọ kwanyeere ndị mmadụ ùgwù ma meere ha obiọma. Ọ “dị nwayọọ, dịkwa umeala n’obi.” Ihe ndị a so mee ka ọ na-akụzi ihe nke ọma. (Gụọ Matiu 11:28-30.) Anyịnwa kwesịrị ịna-akwanyere ndị anyị na-akụziri ihe ùgwù, na-emekwara ha obiọma.
6. Ndị mmadụ jụ ozi anyị ma ọ bụ na-emegide anyị, olee otú anyị ga-esi na-akwanyere ha ùgwù, na-emekwara ha obiọma?
6 Ụfọdụ na-ajụ ozi anyị ma ọ bụdị na-emegide anyị. Olee otú anyị ga-esi emeso ha? Jizọs gwara anyị na ihe anyị ga-eme abụghị naanị idi mmegide a na-emegide anyị. Ọ gwakwara anyị ka anyị ‘na-emere ndị kpọrọ anyị asị ihe ọma,’ ‘na-agọzi ndị na-abụ anyị ọnụ,’ ‘na-ekpekwa ekpere maka ndị na-akparị anyị.’ (Luk 6:27, 28) Ọ ga-aka adịrị anyị mfe ime otú ahụ ma ọ bụrụ na anyị eburu n’obi na ndị jụrụ ozi ọma anyị ebughị ihe ọjọọ n’obi. Ọ bụ eziokwu na e nwere ndị na-emegide anyị n’ihi ozi ọma anyị, ma e nwere ndị ihe na-echegbu ha bụ nsogbu ezinụlọ ha ma ọ bụ ihe ọzọ na-agbasaghị anyị. O nwekwara ike ịbụ na anyị bịara mgbe na-adịghị ha mma. Nke ọ bụla ọ bụ, anyị kwesịrị ime ihe Baịbụl gwara anyị. Ọ sịrị: “Ka okwu unu na-atọ ụtọ mgbe niile ka ihe e tinyere nnu. Ọ ga-eme ka unu mara otú unu ga-esi azaghachi onye ọ bụla.” (Kọl. 4:6) Ọ bụrụ na anyị emetere ndị mmadụ ebere ma gbalịa ịmata ihe bụ́ mkpa ha, o nwere ike ime ka anyị ghara iwe iwe, anyị ana-akụzikwa ihe nke ọma.
JIRI OKWU CHINEKE NA-AKỤZI IHE
7. Olee otú Jizọs si gosi na ihe ndị ọ na-akụzi si n’Okwu Chineke? (Jọn 7:14-16)
7 Jizọs akụzighị ihe o chere. Ihe ọ kụziri si n’Okwu Chineke. Ọ kụzikwara ya otú ọ ga-adịrị ndị mmadụ mfe ịghọta ya ma cheta ya. Baịbụl gwara anyị na Jizọs kụziri ihe “ka onye Chineke nyere ikike, ọ bụghị ka ndị odeakwụkwọ.” Ihe a ‘juru ndị mmadụ anya.’ (Mak 1:22) Ndị odeakwụkwọ n’oge ahụ na-eji ihe ndị isi okpukpe a ma ama kụziri akwado ihe ha na-akụzi. Ma, Jizọs gwara ndị mmadụ ihe si n’Okwu Chineke. Ebe ọ bụ Ọkpara Chineke bi n’eluigwe tupu ya abịa n’ụwa, a sị na ọ chọrọ, ọ gaara eji ọtụtụ ihe ọ ma kọjuo ndị mmadụ isi, nke nwere ike ịgba ha gharịị. Ma, o meghị otú ahụ. Kama, o ji Okwu Chineke kụziere ndị mmadụ ihe Chineke chọrọ ka ha mee. (Gụọ Jọn 7:14-16.) Jizọs gosiri otú Ndị Kraịst niile kwesịrị isi na-akụzi ihe.
8. Olee otú Pita onyeozi si mee ka Jizọs?
8 Ndị na-eso ụzọ Jizọs na-ejikwa Okwu Chineke akụzi ihe. Dị ka ihe atụ, ka anyị hụ ihe Pita onyeozi kwuru n’ụbọchị Pentikọst 33 Oge Ndị Kraịst. Pita agụghị oké akwụkwọ. Ma, o ji ọtụtụ amaokwu Baịbụl mee ka otú Jizọs si mezuo amụma ndị dị n’Akwụkwọ Nsọ doo anya. (Ọrụ 2:14-37) Gịnị mere mgbe o kwuchara okwu? “E mere ndị ji obi ha niile nabata okwu ya baptizim. N’ụbọchị ahụ, ihe dị ka puku mmadụ atọ (3,000) ghọrọ ndị na-eso ụzọ Jizọs.”—Ọrụ 2:41.
9. Gịnị mere anyị ji kwesị iji Baịbụl na-akụzi ihe?
9 E nweghị ihe ọzọ anyị ga-eji kụziere ndị mmadụ ihe ya eruo ha n’obi ka Okwu Chineke. (Hib. 4:12) N’ihi ya, anyị kwesịrị iji Baịbụl na-akụzi ihe. Anyị kwesịrị ‘ikwusa okwu Chineke,’ ọ bụghị nke anyị. (2 Tim. 4:2) Ilu 2:6 sịrị: “Ọ bụ Jehova na-eme ka mmadụ mara ihe. Ọ bụ okwu si n’ọnụ ya na-eme ka mmadụ mụta ihe ma ghọta ihe.” N’ihi ya, anyị jiri Okwu Chineke na-akụzi ihe, anyị na-eme ka ndị mmadụ nụrụ ihe Jehova na-ekwu. (Mal. 2:7) Anyị chọrọ ka ndị mmadụ mara na e nweghị ebe amamihe mmadụ ruru ma e jiri ya tụnyere ihe dị na Baịbụl, nke si n’ike mmụọ nsọ Chineke. Ọ na-emekwa ka anyị nweta amamihe anyị ga-eji na-eme ihe dị Onye kere anyị mma, ndụ anyị ana-atọkwa anyị ụtọ.—2 Tim. 3:16, 17.
10. Olee otú anyị ga-esi mee ka uche onye anyị na-amụrụ Baịbụl dịrị n’Okwu Chineke?
10 Ị kwadebewe ịmụrụ mmadụ Baịbụl, chọpụta ụzọ ndị ị ga-esi mee ka onye ị na-amụrụ ihe hụ ihe ndị Baịbụl na-akụzi. O kwesịrị ịghọta na foto na vidio na-enyere anyị aka ịghọtakwu ihe a na-akụzi. Mana akwụkwọ bụ́ isi anyị na-amụ bụ Baịbụl. N’ihi ya, unu mụwa ihe, gụọ amaokwu Baịbụl ndị ga-enyere ya aka ịghọta isi ihe a na-amụ, nyekwara ya aka ichebara ihe ọ mụtara na ha echiche. I kwuwe gbasara foto ma ọ bụ vidio, jide n’aka na ọ ghọtara ihe Baịbụl kwuru o kwesịrị ịmụta na ya. Ọ dịghị mkpa ka i kwuwe ọtụtụ okwu ma ọ bụ gụọ ọtụtụ amaokwu Baịbụl iji mee ya. Kama, nye ya oge ka ọ ghọta ihe amaokwu nke ọ bụla a gụrụ na-akụzi. O nwedịrị ike ịdị mkpa ka a gụgharịa amaokwu Baịbụl a gụrụ. Anyị mee otú ahụ, anyị na-egosi na ihe anyị na-amụrụ ndị mmadụ abụghị akwụkwọ ma ọ bụ foto ma ọ bụ vidio, kama ọ bụ Baịbụl.—1 Kọr. 2:13.
11-12. (a) Olee otú anyị ga-esi enwere onye anyị na-amụrụ Baịbụl ndidi? (Ọrụ Ndịozi 17:1-4) (Kọwaakwa foto.) (b) Gịnị ka ụfọdụ ndị na-amaghị gbasara Baịbụl? Oleekwa otú anyị ga-esi enyere ha aka?
11 E nwee ihe siiri onye ị na-amụrụ Baịbụl ike nghọta, cheta na i kwesịrị inwere ya “ndidi” ka ị na-akụziri ya “okwu Chineke.” Ọ bụghị mmadụ niile na-aghọta ihe ozugbo. O nwere ike iwe ụfọdụ ndị a na-amụrụ Baịbụl oge ịmụta eziokwu ndị anyị chere na ha esighị ike. Pọl kwusaara ndị Juu nọ na Tesalonaịka ozi ọma ọtụtụ ugboro, na-akọwara ha ihe dị n’Akwụkwọ Nsọ, tupu ụfọdụ n’ime ha aghọta ihe ọ na-akụzi.—Gụọ Ọrụ Ndịozi 17:1-4.
12 Otú ọzọ anyị nwere ike isi na-enwe ndidi bụ ịna-ajụ onye anyị na-amụrụ ihe ajụjụ ma na-enye ya oge ka ọ zaa. Gbalịa gee ya ntị nke ọma ka ị ghọta ihe mere o ji eche echiche otú o si eche. Gụzie amaokwu Baịbụl ndị ga-enyere ya aka ịghọta ihe Chineke chere gbasara okwu ahụ, unu ekwurịtakwa ya. Ihe ọzọ ị ga-echebara echiche bụ na ụfọdụ ndị ahụtụbeghị Baịbụl, ha amaghịkwa ihe ndị dị na ya. O nwere ike ịba uru ma i gosi ụdị onye ahụ Baịbụl e biri ebi. I nwere ike igosi ya isiokwu bụ́ “Ihe Baịbụl Na-ekwu,” nke dị ná mmalite Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ, ka ọ hụ isiokwu ndị dị mkpa Baịbụl kwuru gbasara ha. I nwere ike inyere ya aka ka ọ ghọta otú Baịbụl ga-esi eme ka ọ na-enwe obi ụtọ ma i gosi ya otu ma ọ bụ abụọ n’ime amaokwu Baịbụl ndị e depụtara n’ajụjụ nke iri na ise. N’eziokwu, i mee ka onye ị na-amụrụ ihe hụ otú Okwu Chineke si akpa ike, ihe ị na-akụziri ya ga-aka abara ya uru.
Onye na-akụzi ihe nke ọma anaghị ekwu ọtụtụ okwu, kama ọ na-ege ntị nke ọma (A ga-akọwa ya na paragraf nke 11 na nke 12)
NYERE HA AKA ỊMATA JEHOVA
13. Anyị kụziwere ndị mmadụ ihe, ònye ka anyị kwesịrị ime ka uche ha dịrị n’ebe ọ nọ? Mee ihe atụ.
13 Ihe bụ́ mkpa anyị bụ inyere ndị anyị na-akụziri ihe aka ịmata Jehova ma bịaruo ya nso. (Jems 4:8) E nwere ike iji ihe a anyị na-eme tụnyere onye chọrọ igosi mmadụ ihe n’abalị. Ihe ọ ga-eme abụghị ịgbawa onwe ya ọkụ. Kama ọ ga-agbara onye ahụ ọkụ n’ihe ahụ ọ chọrọ igosi ya. Ọ bụkwa ihe anyị na-eme ma anyị kụziwere ndị mmadụ ihe. Anyị na-eme ka uche ha dịrị n’ebe Jehova nọ, ọ bụghị n’ebe anyị nọ.
14. Olee otú anyị nwere ike isi nyere onye anyị na-amụrụ ihe aka ka ọ na-eche gbasara Jehova?
14 Ị mụwara mmadụ Baịbụl, nyere ya aka ka ọ mụta ịhụ Jehova n’anya. Ọ ga-eme ka ọ chọọ ime ihe dị ya mma. (Ilu 27:11) Ihe ị na-eme abụghị naanị ịkụziri onye ị na-amụrụ ihe ka ọ na-eme ihe ọma ma zere ihe ọjọọ ka o nwee ike ịghọ Onyeàmà Jehova. Ị chọrọ ka ọ gbanwee ndụ ya ka ihe ya dị Jehova mma. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na e nwere àgwà ọ na-agbalị ịgbanwe, jụọ ya ajụjụ ndị dị ka: “Gịnị mere Jehova ji kpọọ àgwà a asị? Gịnị mere Jehova ga-eji chọọ ka ị kwụsị ime ihe na-atọ gị ụtọ? Olee otú ihe a Jehova chọrọ ka i mee si egosi na ọ hụrụ gị n’anya?” Ọ bụrụ na ị na-eme ka onye ị na-amụrụ ihe na-echekwu gbasara Jehova, ọ ga-eme ka o werekwuo Jehova ka ezigbo Nna ya. Ọ ga-emezi ka ọ chọọ ime Jehova obi ụtọ.
NA-AGBA MBỌ KA Ị NA-AKỤZIKWU IHE NKE ỌMA
15. Gịnị ka i nwere ike ime ka otú i si akụzi ihe na-akakwu mma?
15 I nwere ike ịrịọ Jehova ka o nyere gị aka ịmata ebe ị ga-emekwu nke ọma n’otú i si akụzi ihe. (1 Jọn 5:14) Ka i nwee ike ime ihe dabara n’ekpere gị ahụ, na-etinye uche gị n’ihe ndị a na-akụziri anyị n’ọmụmụ ihe gbasara ịkụzi ihe nke ọma. I nwere ike ịkpọrọ nwanna bụ́ aka ochie n’ịkụzi ihe ka o soro gị gaa ịmụrụ mmadụ Baịbụl. Jụzie ya ebe o chere ị ga-emekwu nke ọma. Chetakwa na ọ bụ eziokwu na ị ma ihe ị chọrọ ịkụzi nke ọma, onye ị na-amụrụ ihe amaghị ya. Gbalịa ka ị ghọta otú o si ele ihe ahụ a na-amụ anya. Nyeziere ya aka ịghọta uru ihe ị na-akụziri ya ga-abara ya nakwa ihe ọma ndị Jehova kwere anyị ná nkwa. O nwere ike ime ka ọ bịakwuo Jehova nso, meekwa ka ọ na-enwe ezigbo obi ụtọ.—Ọma 1:1-3.
16. Olee uru ọ ga-abara anyị ma anyị na-eme ka otú anyị si akụzi ihe na-akakwu mma?
16 Ịkụziri ndị mmadụ gbasara Jehova so n’ihe ndị kacha eme anyị obi ụtọ. Ọrụ a na-eme obi ụtọ ga-adị ezigbo mkpa n’ụwa ọhụrụ. N’ihi ya, ka anyị gbalịa na-egosi ndị anyị na-akụziri ihe na ihe gbasara ha na-emetụ anyị n’obi, na-esi n’Okwu Chineke na-akụzi ihe, na-emekwa ka uche ha dịrị n’ebe Jehova nọ mgbe anyị na-akụziri ha ihe. Anyị mee otú ahụ, anyị ga na-akụzikwu ihe nke ọma n’ozi ọma.
ABỤ NKE 65 Gaa n’Ihu