Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w25 Ọktoba p. 12-17
  • Ịhụnanya Chineke Na-adịru Mgbe Ebighị Ebi

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ịhụnanya Chineke Na-adịru Mgbe Ebighị Ebi
  • Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2025
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • CHETA NA ỊHỤNANYA JEHOVA SO N’IHE NDỊ BỤ́ ISI BAỊBỤL NA-AKỤZI
  • TỤGHARỊA UCHE N’OTÚ JEHOVA SI ‘HỤ GỊ N’ANYA’
  • GHỌTA IHE MERE I JI ENWE OBI ABỤỌ
  • KPEBISIE IKE NA Ị GAGHỊ AHAPỤ JEHOVA
  • Ihe Banyere Gị Na-emetụ Jehova n’Obi
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2024
  • Ka Obi Sie Gị Ike na Jehova Hụrụ Gị n’Anya
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2025
  • Otú Ịhụnanya Chineke Pụrụ Iche Si Abara Anyị Uru
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2021
  • Otú Ị Ga-esi Kwụsị Inwe Obi Abụọ
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2024
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2025
w25 Ọktoba p. 12-17

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 41

ABỤ NKE 108 Ịhụnanya Chineke

Ịhụnanya Chineke Na-adịru Mgbe Ebighị Ebi

“ Keleenụ Jehova n’ihi na ọ dị mma. Ịhụnanya ya pụrụ iche na-adịru mgbe ebighị ebi.”​—ỌMA 136:1 na ihe e dere n’ala ala peeji ya.

IHE A GA-AMỤ

Isiokwu a ga-akọwa otú ịghọta ihe Baịbụl kwuru banyere ịhụnanya Jehova nwere ike isi gbaa anyị ume mgbe nsogbu bịaara anyị.

1-2. Olee nsogbu na-abịara ọtụtụ Ndị Kraịst?

CHEGODỊ banyere ụgbọ mmiri nọ n’oké osimiri mgbe e nwere ebili mmiri. Ebili mmiri ahụ na-ebugharị ụgbọ ahụ. O nwere ike iburu ya gaa ebe ọ bụla ma ọ bụrụ na e jighị nko e ji ejide ụgbọ mmiri jide ya. Nko ahụ ga-eme ka ụgbọ mmiri ahụ kwụrụ otu ebe ka ebili mmiri ghara iburu ya tinye isi ebe ọzọ.

2 Nsogbu siri ezigbo ike bịara gị, i nwere ike ịdị ka ụgbọ mmiri ahụ. Otú obi dị gị nwere ike ịgbanwe n’egbughị oge. Obi nwere ike isi gị ike taa na Jehova hụrụ gị n’anya nakwa na ọ na-akwado gị, o ruo echi, gị echewe ma ọ̀ na-ahụ ihe gị na ya na-alụ. (Ọma 10:1; 13:1) Otu enyi gị nwere ike ịgwa gị ihe ga-akasi gị obi, obi adịtụ gị mma. (Ilu 17:17; 25:11) Ma, ị nọtụkwa, ya emewe gị obi abụọ ma Jehova ọ̀ na-enyere gị aka. I nwedịrị ike ịna-eche ma ike gị ọ̀ gwụla Jehova. Nsogbu bịara gị, gịnị nwere ike ime ka ị kwụrụ chịm otú ahụ nko si ejide ụgbọ mmiri? Ya bụ, olee otú obi ga-esi sie gị ike mgbe niile na Jehova hụrụ gị n’anya nakwa na ọ na-enyere gị aka?

3. Gịnị bụ “ịhụnanya pụrụ iche” e kwuru n’Abụ Ọma 31:7 na 136:1? Gịnịkwa mere anyị nwere ike iji kwuo na ọ bụ Jehova kacha egosi ụdị ịhụnanya a? (Kọwaakwa foto.)

3 Otu ihe ga-eme ka anyị kwụrụ chịm ma nsogbu bịara anyị bụ icheta ịhụnanya pụrụ iche Jehova nwere. (Gụọ Abụ Ọma 31:7; 136:1 na ihe e dere n’ala ala peeji ya.) Okwu Hibru a sụgharịrị “ịhụnanya pụrụ iche” na-egosi otú mmadụ si eji obi ya niile ahụ onye ọzọ n’anya ma ghara ịgharịpụ ya. Ọ bụ Jehova kacha egosi ụdị ịhụnanya a. Baịbụl kwudịrị na ‘ịhụnanya ya pụrụ iche dị ukwuu.’ (Ọpụ. 34:6, 7 na ihe e dere n’ala ala peeji ya.) O kwukwara banyere Jehova, sị: “Ịhụnanya ị na-egosi ndị niile na-akpọku gị dị ukwuu.” (Ọma 86:5) Chegodị ihe ọ pụtara: Jehova emekataghị hapụ ndị ji obi ha niile na-efe ya. Ọ bụrụ na anyị echeta na Jehova emekataghị gharịpụ anyị, ọ ga-eme ka anyị kwụrụ chịm ma nsogbu tara akpụ bịara anyị.​—Ọma 23:4

Ebe e ji nko dị n’ime mmiri jide ụgbọ mmiri ka ebili mmiri ghara iburu ya.

Nko e ji ejide ụgbọ mmiri na-eme ka ebili mmiri ghara iburu ụgbọ mmiri ahụ. Ọ bụ otú ahụ ka obi ike anyị nwere na Chineke hụrụ anyị n’anya ga-eme ka anyị kwụrụ chịm ma nsogbu bịara anyị (A ga-akọwa ya na paragraf nke 3)


CHETA NA ỊHỤNANYA JEHOVA SO N’IHE NDỊ BỤ́ ISI BAỊBỤL NA-AKỤZI

4. Olee ụfọdụ ihe so n’ihe ndị bụ́ isi Baịbụl na-akụzi? Oleekwa ihe mere na ọ dịghị mfe mmadụ ime ka anyị kwụsị ikwere ha?

4 Ihe ọzọ ga-eme ka anyị kwụrụ chịm ma nsogbu bịara anyị bụ icheta na ịhụnanya Jehova so n’ihe ndị bụ́ isi Baịbụl na-akụzi. Gịnị ka ị na-echeta ma ị nụ “ihe ndị bụ́ isi Baịbụl na-akụzi”? I nwere ike icheta eziokwu ndị gbara ọkpụrụkpụ ị mụtara na Baịbụl. Dị ka ihe atụ, ị mụtara na aha Chineke bụ Jehova, na Jizọs bụ Ọkpara Chineke mụrụ naanị ya, na ndị nwụrụ anwụ amaghị ihe ọ bụla, nakwa na a ga-eme ka ụwa ghọọ Paradaịs ebe ụmụ mmadụ ga-ebi ruo mgbe ebighị ebi. (Ọma 83:18; Ekli. 9:5; Jọn 3:16; Mkpu. 21:3, 4) Ozugbo i kwetara na ihe ndị a bụ eziokwu, ọ dịghị mfe mmadụ ime ka ị kwụsị ikwere ha. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na ị ghọtara na ha niile gbakwasịrị ụkwụ n’eziokwu. Ka anyị hụ otú icheta na ịhụnanya Jehova so n’ihe ndị bụ́ isi Baịbụl na-akụzi ga-esi nyere gị aka ịkwụsị iche na Jehova anaghị ahụ nsogbu bịaara gị ma ọ bụ na ihe gbasara gị anaghị emetụ ya n’obi.

5. Kọwaa otú mmadụ nwere ike isi jụ nkụzi ụgha.

5 Mgbe i bidoro ịmụ Baịbụl, olee ihe nyeere gị aka ịjụ nkụzi ụgha? O nwere ike ịbụ na ị matara ihe dị iche n’ihe okpukpe ị na-aga na-akụzi na ihe Baịbụl na-akụzi. Dị ka ihe atụ, ka e were ya na i kwebuuru na Jizọs bụ Chineke Onye Pụrụ Ime Ihe Niile. Ma, ka ị na-amụ Baịbụl, ị jụrụ onwe gị, sị, ‘Ihe a ọ̀ bụ eziokwu?’ Mgbe ị mụchara ihe Baịbụl kwuru gbasara ya, ị matara na azịza ya bụ mba. Ị kwụsịrị ikwere nkụzi ụgha ahụ, kwerezie eziokwu a Baịbụl na-akụzi, ya bụ, na Jizọs bụ “onye e bu ụzọ kee n’ime ihe niile e kere eke” na “Ọkpara Chineke mụrụ naanị ya.” (Kọl. 1:15; Jọn 3:18) Nke bụ́ eziokwu bụ na nkụzi ụgha nwere ike ‘ịgbanyesi mgbọrọgwụ ike,’ siekwa ike ịkụghasị. (2 Kọr. 10:4, 5) Ma, ozugbo ị mụtara nke bụ́ eziokwu, ị kwụsịrị ikweta nkụzi ụgha ndị ahụ.​—Fil. 3:13.

6. Gịnị mere obi ga-eji sie gị ike na ‘ịhụnanya pụrụ iche Jehova hụrụ ndị ya na-adịru mgbe ebighị ebi’?

6 I nwere ike ime ụdị ihe ahụ ma a bịa n’ihe Baịbụl na-akụzi gbasara ịhụnanya Jehova. Ọ bụrụ na nsogbu abịara gị, ya emewe gị obi abụọ ma Chineke ọ̀ hụrụ gị n’anya, jụọ onwe gị, sị, ‘Ihe a m na-eche ọ̀ bụ eziokwu?’ Mata ihe dị iche n’ihe ahụ ị na-eche banyere ịhụnanya Jehova na ihe Baịbụl kwuru n’Abụ Ọma 136:1, nke bụ́ amaokwu e si nweta isiokwu a. Gịnị mere Jehova ji kwuo na ịhụnanya ya “pụrụ iche”? Ihe ọzọ bụ na ọ bụ ịhụnanya a ka e kwuru gbasara ya n’abụ ọma ahụ n’ahịrịokwu bụ́ “ịhụnanya ya na-adịru mgbe ebighị ebi.” Gịnịzi mere e ji kwuo gbasara ya ugboro iri abụọ na isii n’abụ ọma ahụ? Dị ka anyị kwurula, ịhụnanya pụrụ iche Jehova hụrụ ndị ya so n’ihe ndị bụ́ isi Baịbụl na-akụzi, dịkwa ka eziokwu ndị ọzọ ị mụtara n’Okwu Chineke. Iche na Jehova ejighị gị kpọrọ ihe ma ọ bụ na ọ hụghị gị n’anya bụ ụgha chara acha. Jụ ya otú ahụ ị ga-esi ajụ ụgha ndị ọzọ ndị mmadụ na-akụzi.

7. Olee amaokwu ụfọdụ na-eme ka obi sie gị ike na Jehova hụrụ gị n’anya?

7 E nwere ọtụtụ ihe ndị ọzọ e kwuru na Baịbụl mere ka obi sie anyị ike na Jehova hụrụ anyị n’anya. Dị ka ihe atụ, Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Unu bara uru karịa ọtụtụ nza.” (Mat. 10:31) Jehova gwakwara ndị ya, sị: “M ga-eme ka ị dị ike. M ga-enyekwara gị aka. M ga-eji aka nri m, bụ́ aka m ji eme ihe ziri ezi, jidesie gị ike.” (Aịza. 41:10) Legodị otú ihe ndị a e kwuru si doo anya. Jizọs asịghị: ‘Unu nwere ike ịba uru karịa ọtụtụ nza.’ Jehova asịghịkwa: ‘M nwere ike inyere gị aka.’ Kama, ha sịrị: “Unu bara uru karịa ọtụtụ nza” nakwa “M ga-enyekwara gị aka.” Nsogbu bịara gị, ya emewe gị obi abụọ ma Jehova ọ̀ hụrụ gị n’anya, ihe ụdị amaokwu ndị a nwere ike imere gị abụghị naanị ime ka obi dị gị mma. Ha nwere ike ime ka obi sie gị ike na ọ hụrụ gị n’anya. Amaokwu ndị ahụ kwuru ihe bụ́ eziokwu. I kpee ekpere gwa Jehova ihe ahụ na-eme gị obi abụọ ma chebara amaokwu ndị a echiche, ị ga-enwe ike ikwu ihe dị na 1 Jọn 4:16. Ebe ahụ sịrị: “Anyị amatakwala ma kwere na Chineke hụrụ anyị n’anya.”a

8. Gịnị ka ị ga-eme ma ọ bụrụ na ọ na-eme gị obi abụọ mgbe ụfọdụ ma Jehova ọ̀ hụrụ gị n’anya?

8 Gịnịkwanụ ka ị ga-eme ma ọ bụrụ na ọ na-eme gị obi abụọ mgbe ụfọdụ ma Jehova ọ̀ hụrụ gị n’anya? Mata ihe dị iche n’otú ahụ obi dị gị na ihe ị ma gbasara Jehova. Otú obi dị gị nwere ike ịgbanwe mgbe ọ bụla, ma ịhụnanya Jehova Baịbụl kụziiri anyị bụ eziokwu na-anaghị agbanwe agbanwe. Ọ bụrụ na anyị ekwetaghị na Jehova hụrụ anyị n’anya, anyị na-eleghara àgwà kacha mkpa Jehova nwere anya, ya bụ, ịhụnanya ya.​—1 Jọn 4:8.

TỤGHARỊA UCHE N’OTÚ JEHOVA SI ‘HỤ GỊ N’ANYA’

9-10. Gịnị ka Jizọs na-ekwu maka ya mgbe ọ sịrị: “Nna m hụrụ unu n’anya” na Jọn 16:26, 27? (Kọwaakwa foto.)

9 Anyị ga-amụtakwu banyere ịhụnanya Jehova ma anyị chebara ihe Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya echiche. Ọ sịrị ha: “Nna m hụrụ unu n’anya.” (Gụọ Jọn 16:26, 27.) Jizọs ekwughị ihe a ka obi dị ndị na-eso ụzọ ya mma. Ihe ndị ọzọ o kwuru gosiri na ọ naghị ekwu banyere otú obi dị ha n’oge ahụ. Kama ọ na-ekwu gbasara ihe ọzọ, ya bụ, ekpere.

10 Jizọs ka gwachara ndị na-eso ụzọ ya na ha kwesịrị ịna-ekpe ekpere n’aha ya, ọ bụghị ịgwa ya okwu n’ekpere. (Jọn 16:23, 24) Ha kwesịrị ịmata ihe a. Mgbe a kpọlitechara ya n’ọnwụ, ndị na-eso ụzọ ya nwere ike ịchọ ịna-agwa ya okwu n’ekpere. A sị ka e kwuwe, Jizọs bụ ezigbo enyi ha. Ha nwere ike ịna-eche na otú o si hụ ha n’anya ga-eme ka ọ na-ege ntị n’arịrịọ ha ma kọọrọ Nna ya ihe ha rịọrọ. Ma, Jizọs sịrị na ha ekwesịghị iche otú ahụ. Maka gịnị? Ọ bụ n’ihi na ọ gwara ha, sị: “Nna m hụrụ unu n’anya.” Ihe a so n’ihe ndị bụ́ isi Baịbụl kụziri gbasara ekpere. Chegodị uru ihe a ga-abara gị. I si na Baịbụl mata onye Jizọs bụ ma hụ ya n’anya. (Jọn 14:21) Ma, dịkwa ka ndị mbụ ahụ soro ụzọ Jizọs, obi ga-esili gị ike ịgwa Chineke okwu n’ekpere ebe ị ma na ‘ọ hụrụ gị n’anya.’ Ị na-egosi na i kwetara ihe a Jizọs kwuru mgbe ọ bụla ị na-ekpere Jehova ekpere.​—1 Jọn 5:14.

Foto ndị na-egosi: Ebe otu nwanna nọ n’oche dị n’èzí jiri obi ike na-ekpe ekpere gbasara ihe atọ dị ya mkpa. 1. Ebe o wetaara nwunye ya ahụ́ na-adịghị dina ala nri. 2. Ebe obi dị nwa ya nwaanyị ụtọ ka ọ na-amụrụ ya ihe. 3. Ebe ọ na-elebara akwụkwọ gbasara ego anya.

Obi ga-esili gị ike ịgwa Chineke okwu n’ekpere ebe ị ma na ‘ọ hụrụ gị n’anya’ (A ga-akọwa ya na paragraf nke 9 na nke 10)b


GHỌTA IHE MERE I JI ENWE OBI ABỤỌ

11. Gịnị mere obi ga-eji dị Setan ụtọ ma o mewe anyị obi abụọ ma Jehova ọ̀ hụrụ anyị n’anya?

11 Gịnị nwere ike ime ka anyị nwewe obi abụọ ma Jehova ọ̀ hụrụ anyị n’anya? I nwere ike ịza na ọ bụ Ekwensu na-akpata ya. N’eziokwu, o so akpata ya. Ekwensu “na-achọ onye ọ ga-eri.” Ọ ga-adịkwa ya mma ma anyị nwewe ụdị obi abụọ ahụ. (1 Pita 5:8) A sị ka e kwuwe, ọ bụ ịhụnanya Jehova mere ka o nye anyị ihe mgbapụta. Setan chọkwara ka anyị chee na anyị erughị eru irite uru n’ihe mgbapụta ahụ. (Hib. 2:9) Ma, olee onye obi ga-adị ụtọ ma anyị nwewe obi abụọ ma Jehova ọ̀ hụrụ anyị n’anya? Ọ bụ Setan. Oleekwa onye obi ga-adị ụtọ ma anyị kwụsị ife Jehova ma nsogbu bịara anyị? Ọ bụ Setan. Ọ chọrọ ka anyị chee na Jehova ahụghị anyị n’anya. Mana, ọ bụtụdịghị eziokwu. Ọ bụ Setan ka Jehova na-ahụghị n’anya. N’agbanyeghị ya, otu n’ime “aghụghọ” ya bụ ịgbalịwa ka anyị chee na ọ bụ anyịnwa ka Jehova na-ahụghị n’anya nakwa na ọ jụla anyị. (Efe. 6:11) Anyị ghọta ihe Setan na-agbalị ime, anyị ga-ekpebisikwu ike ‘ịna-alụso ya ọgụ.’​—Jems 4:7.

12-13. Olee otú mmehie anyị ketara n’aka Adam nwere ike isi mee ka o mewe anyị obi abụọ ma Jehova ọ̀ hụrụ anyị n’anya?

12 E nwekwara ihe ọzọ nwere ike ime ka anyị nwewe obi abụọ ma Chineke ọ̀ hụrụ anyị n’anya. Gịnị ka ọ bụ? Ọ bụ mmehie anyị ketara n’aka Adam. (Ọma 51:5; Rom 5:12) Mmehie mere ka anyị na Onye kere anyị ghara ịdị ná mma. Ọ kpakwara echiche anyị, obi anyị, na ahụ́ anyị aka ọjọọ.

13 Mmehie na-akpakwa otú obi na-adị anyị aka ọjọọ. Ọ na-eme ka obi na-ama anyị ikpe, anyị ana-echegbu onwe anyị, obi ekoro anyị n’elu, ihere ana-emekwa anyị. Obi nwere ike ịdị anyị otú a ma anyị mee mmehie. Ma, o nwekwara ike ịdị anyị otú a n’ihi na anyị na-echeta mgbe niile na anyị bụ ndị mmehie. Chineke ekeghịkwanụ anyị ka ọ na-adị anyị otú ahụ. (Rom 8:20, 21) Ị manụ na ụgbọala daa afọ, ike ọsọ agaghịzi adị ya. Ebe ọ bụ na anyị ezughị okè, anyị agaghị na-emeli ihe niile Chineke kere anyị ka anyị na-eme. N’ihi ya, ọ naghị eju anyị anya na mgbe ụfọdụ, anyị na-enwe obi abụọ ma Jehova ọ̀ hụrụ anyị n’anya. Mgbe ọ bụla ọ dị anyị otú ahụ, anyị kwesịrị icheta na Jehova bụ ‘Onye ukwu na Chineke e kwesịrị ịtụ egwu, onye hụrụ ndị hụrụ ya n’anya ma na-edebe iwu ya n’anya.’​—Nehe. 1:5.

14. Olee otú ichebara ihe mgbapụta ahụ echiche ga-esi enyere anyị aka ka anyị ghara ikweta na Chineke agaghị ahụli anyị n’anya? (Ndị Rom 5:8) (Kwuokwa ihe dị n’igbe isiokwu ya bụ “Kpachara Anya Maka ‘Ike Dị Aghụghọ nke Mmehie.’”)

14 Mgbe ụfọdụ, anyị nwere ike ịna-eche na anyị erughị eru ka Jehova hụ anyị n’anya. Nke bụ́ eziokwu bụ na anyị erughị eru. Ọ bụkwanụ ya mere ịhụnanya Jehova ji pụọ iche. Anyị anaghị arụta ịhụnanya ya n’ọrụ. Ma, ihe mgbapụta ahụ na-ekpuchi mmehie anyị. Ihe mekwaranụ Jehova ji nye anyị ihe mgbapụta bụ ka o nwee ike ịgbaghara mmehie anyị n’ihi na ọ hụrụ anyị n’anya. (1 Jọn 4:10) Chetakwa na Jizọs bịara ka ọ zọpụta ndị mmehie, ọ bụghị ndị zuru okè. (Gụọ Ndị Rom 5:8.) E nweghị onye n’ime anyị ga-emeli ka ndị zuru okè. Jehova anaghịkwanụ atụ anya ka anyị zuo okè. Anyị ghọta na mmehie anyị bu pụta ụwa nwere ike ime ka o mewe anyị obi abụọ ma Jehova ọ̀ hụrụ anyị n’anya, anyị ga-ekpebisikwu ike na anyị agaghị ekwe ka o mee.​—Rom 7:24, 25.

Kpachara Anya Maka “Ike Dị Aghụghọ nke Mmehie”

Baịbụl kwuru gbasara “ike dị aghụghọ nke mmehie.” (Hib. 3:13) Ihe ezughị okè na-eme anyị abụghị naanị ime ka anyị chọwa ime ihe ọjọọ, ọ na-emekwa ka anyị nwewe obi abụọ ma Jehova ọ̀ hụrụ anyị n’anya. O doro anya na mmehie nwere “ike dị aghụghọ.”

Anyị nwere ike iche na a gaghị aghọgbuli anyị. Dị ka ihe atụ, obi anyị nwere ike ịgwa anyị na onye wayo agaghị egwuteli anyị. Ma, ọ bụrụ na anyị akpacharaghị anya, o nwere ike igwuru ego anyị niile.

Otú ahụ ka anyị kwesịkwara ịkpachara anya ma ezughị okè gbalịwa ịghọgbu anyị ka anyị chee na Jehova ahụghị anyị n’anya. Ezughị okè nwere ike ime ka anyị na-eche mgbe niile banyere ihe ndị anyị na-anaghị emeta. Ma, ọ bụ “ike dị aghụghọ” nke mmehie. Anyị kwesịkwara ịjụ ya.

KPEBISIE IKE NA Ị GAGHỊ AHAPỤ JEHOVA

15-16. Ọ bụrụ na anyị ahapụghị Jehova, gịnị ka obi kwesịrị isi anyị ike na ya? Maka gịnị? (2 Samuel 22:26)

15 Jehova chọrọ ka anyị kpebie ime ihe dị mma. Otú anyị ga-esi eme ya bụ ‘ịghara ịhapụ ya.’ (Diut. 30:19, 20) Anyị mee otú ahụ, ka obi sie anyị ike na ọ gaghị ahapụ anyị. (Gụọ 2 Samuel 22:26.) Ọ bụrụhaala na anyị ejidesie Jehova aka ike, obi kwesịrị isi anyị ike na ọ ga na-enyere anyị aka ná nsogbu ọ bụla bịaara anyị.

16 Dị ka anyị kwurula, e nwere ọtụtụ ihe mere anyị kwesịrị iji kwụrụ chịm ma nsogbu bịara anyị. Anyị ma na Jehova hụrụ anyị n’anya nakwa na ọ ga na-akwado anyị. Ọ bụ ihe Baịbụl na-akụzi. O mewe anyị obi abụọ ma Chineke ọ̀ hụrụ anyị n’anya, ka anyị tụgharịa uche n’ihe anyị ma bụ́ eziokwu, ọ bụghị n’ihe anyị chere n’oge ahụ. Ka obi sie anyị ike n’eziokwu Baịbụl gwara anyị na ịhụnanya pụrụ iche Jehova nwere na-adịru ebighị ebi.

GỊNỊ KA Ị GA-AZA?

  • Olee uru anyị ga-erite ma anyị ghọta na ịhụnanya Jehova so n’ihe ndị bụ́ isi Baịbụl na-akụzi?

  • Olee otú mmehie anyị ketara n’aka Adam nwere ike isi mee ka o mewe anyị obi abụọ ma Jehova ọ̀ hụrụ anyị n’anya?

  • Olee otú anyị ga-esi kwụsị inwe obi abụọ ma Jehova ọ̀ hụrụ anyị n’anya?

ABỤ NKE 159 Nye Jehova Otuto

a Ebe ndị ọzọ bụ Diuterọnọmi 31:8, Abụ Ọma 94:14, na Aịzaya 49:15.

b NKỌWA FOTO: Ebe otu nwanna na-arịọ Jehova ka o nyere ya aka ịna-elekọta nwunye ya ahụ́ na-adịghị, ịma otú ọ ga-esi jiri ego ha na-eme ihe bara uru, nakwa ịna-azụ nwa ha nwaanyị ka ọ hụ Jehova n’anya.

    Akwukwo Igbo (1984-2026)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2026 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya