Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w97 5/15 p. 29
  • “Ha Na-agbaso Ọzụzụ Okpukpe Ha”

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • “Ha Na-agbaso Ọzụzụ Okpukpe Ha”
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • ‘Ndị Na-akwụwa Aka Ọtọ Dị Anyị Mkpa’
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
w97 5/15 p. 29

“Ha Na-agbaso Ọzụzụ Okpukpe Ha”

OTU nwanyị sitere Miami, Florida, U.S.A., zijeere otu akwụkwọ akụkọ obodo ahụ akwụkwọ ozi a na-esonụ: “Na Dec. 10 e zunaara nwa m nwoke pọọsụ ya n’akpa uwe ya n’ahịa ọkịrịka. Ikike ịnya ụgbọala, kaadị Nlekọta Ọha, na ihe ndị ọzọ, tinyekwara $260 dị n’ime ya.

“Mgbe ọ kọsịịrị manija banyere mfu ahụ, ọ lọtara ụlọ. Ná mmalite uhuruchi o nwetara òkù telifon sitere n’aka otu nwanyị na-asụ Spanish onye, ebe onye [telifon] na-atapịara ya okwu, gwara ya na ya achọtawo pọọsụ ya.

“Nwanyị ahụ nyere ya adres ya. . . . Nwanyị ahụ nyere ya pọọsụ ahụ, n’enweghị ihe furu na ya, tinyere $260 ahụ.

“Nwanyị ahụ hụrụ mgbe onye ohi ahụ mịịrị pọọsụ ahụ wee tie mkpu. Onye ohi ahụ tụsara pọọsụ ahụ wee gbaa ọsọ. Ka ọ na-erule oge ahụ, nwa m nwoke apụwo n’anya ya, ya mere o welara pọọsụ ahụ ụlọ ma kpọọ ya.

“Nwanyị ahụ na ezinụlọ ya bụ Ndịàmà Jehova. O doro anya na ha na-agbaso ọzụzụ okpukpe ha.”

Ndịàmà Jehova adịghị akwụwa aka ọtọ iji nata otuto n’ọnụ ndị mmadụ. (Ndị Efesọs 6:7) Kama nke ahụ, ha na-achọsi ike iwetara Nna ha nke eluigwe, bụ́ Jehova otuto. (1 Ndị Kọrint 10:31) Ịhụnanya ha maka Chineke na maka ndị agbata obi na-akpali ha ịkpọsa “ozi ọma” ahụ banyere Alaeze Chineke. (Matiu 24:14) Site n’Alaeze ahụ, Chineke na-ekwe nkwa ime ka ụwa ghọọ paradaịs mara mma. Mgbe ahụ ụwa ga-abụ ọ bụghị nanị ebe nkịtị mara mma kamakwa ebe a ga-enwe omume magburu onwe ya nke ịkwụwa aka ọtọ ga-adị ruo mgbe ebighị ebi.—Ndị Hibru 13:18; 2 Pita 3:13.

    Akwukwo Igbo (1984-2026)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2026 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya