Ihe Alaeze Chineke Pụrụ Ịpụta nye Gị
JISỌS KRAỊST ziri ndị na-eso ụzọ ya ikpe ekpere sị: “Ka alaeze gi bịa.” (Matiu 6:10) Lee ka ndị na-ekwu na ha bụ ndị na-eso ụzọ Jisọs siworo gwa Chineke okwu ndị ahụ ọtụtụ mgbe!
Otú ọ dị, Jisọs mere ihe karịrị ịkụziri ndị na-eso ụzọ ya ikpe ekpere maka Alaeze Chineke. O mere ka Alaeze ahụ bụrụ isiokwu bụ isi n’ọrụ nkwusa ya. N’ezie, akwụkwọ bụ́ Encyclopædia Britannica sịrị na Alaeze Chineke bụ “ihe ọtụtụ ndị na-ele anya dị ka isiokwu bụ isi nke ozizi Jisọs.”
Mgbe ndị na-eso ụzọ Jisọs kpere ekpere maka Alaeze ahụ, banyere gịnị ka ha na-ekpe ekpere n’ezie? Gịnị ka Alaeze Chineke pụrụ ipụta nye ha na gị? Oleekwa otú Jisọs si lee ya anya?
Otú Jisọs Si Lee Alaeze ahụ Anya
Jisọs na-akpọkarị onwe ya “Nwa nke mmadụ.” (Matiu 10:23; 11:19; 16:28; 20:18, 28) Nke a na-echetara anyị nhota Daniel onye amụma hotara “nwa nke mmadụ.” Banyere ihe omume ga-ewere ọnọdụ n’ọdịnihu n’eluigwe, Daniel kwuru, sị: “Anọ m na-ahụ n’ọhụụ nile nke abali, ma, lee, otu onye, nke dị ka nwa nke mmadụ, nọ na-abịa n’igwe ojii nke eluigwe, ọ bụkwa Onye ochie ahụ ka ọ bịakwutere, ha wee mee ka ọ bịaruo nso n’ihu Ya. Ọ bụkwa ya ka e nyere ọchịchị, na ebube, na alaeze, ka ndị nile dị iche iche na mba nile na ndị nile na-asụ asụsụ dị iche iche wee fee ya.”—Daniel 7:13, 14.
N’ikwu okwu banyere mgbe ọ ga-anata ọchịchị a, Jisọs gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Mgbe ọ bụla Nwa nke mmadụ ga-anọkwasị n’ocheeze nke ebube ya, unu onwe unu ga-anọkwasịkwa n’oche eze iri na abụọ.” Jisọs kwukwara, sị: “Mgbe ọ bụla nwa nke mmadụ ga-abịa n’ebube ya, . . . n’ihu ya ka a ga-eme ka mba nile zukọọ: ọ ga-ekewapụtakwa ha, otu n’ahụ ibe ya, dị ka onye na-azụ atụrụ na-ekewapụta atụrụ n’ụmụ ewu. . . . Ndị a [ndị ajọ omume] ga-apụ jee baa n’ahụhụ mmehie ebighị ebi: ma ndị ezi omume ga-aba ná ndụ ebighị ebi.”—Matiu 19:28; 25:31, 32, 46.
Nhota amụma ndị a e mere banyere ocheeze na mba nile na-egosi na Alaeze ahụ bụ ọchịchị ebe Jisọs na ụfọdụ n’ime ndị na-eso ụzọ ya ga-achị ihe a kpọrọ mmadụ. Ọchịchị ahụ ga-enwe ike ikpochapụ ndị ajọ omume n’ọnwụ. Otú ọ dị, n’okpuru ọchịchị Alaeze ahụ, ndị ahụ nwere obi ezi omume ga-anata onyinye Chineke nke ndụ ebighị ebi.
Ya mere, n’ụzọ doro anya, Alaeze Chineke bụ ọchịchị eluigwe nke Chineke guzobere. Alaeze ahụ abụghị chọọchị ahụ, Akwụkwọ nsọ adịghịkwa enye ohere maka ile ya anya n’ụzọ na-emetụtaghị okpukpe. Ọzọkwa, ọchịchị nke Chineke nyere agaghị abụ nanị ihe dị n’ime obi mmadụ. Ebe Alaeze Chineke bụ ọchịchị, ọ naghị abụ ihe nọ n’ime obi anyị mgbe anyị nabatara Iso Ụzọ Kraịst. Ma n’ihi gịnị ka ụfọdụ ji na-eche na Alaeze ahụ bụ ọnọdụ nke metụtara obi?
Alaeze Ahụ Ọ̀ Dị n’Ime Anyị?
Ụfọdụ na-eche na Alaeze ahụ dị n’ime obi anyị n’ihi otú ụfọdụ ndị na-asụgharị Bible siworo sụgharịa Luk 17:21. Dị ka New International Version si sụgharịa ya, n’ebe ahụ Jisọs sịrị: “Alaeze Chineke dị n’ime unu.”
N’akụkụ nke a akwụkwọ bụ́ The Interpreter’s Dictionary of the Bible sịrị: “Ọ bụ ezie na a na-ehotakarị ya dị ka ihe atụ nke ‘imata eziokwu site n’iche echiche miri eme’ ma ọ bụ ‘irukpu onwe onye n’echiche miri emi nke ime mmụọ’ nke Jisọs, nkọwa nke a dabere n’ụzọ bụ isi n’elu nsụgharị ochie, bụ́ ‘n’ime unu,’ . . . bụ nke a ghọtara n’echiche ọgbara ọhụrụ na-ekwesịghị ekwesị nke ‘gi’ dị ka otu onye; ‘unu’ ahụ . . . bụ banyere ihe karịrị otu onye (Jisọs na-agwa ndị Farisii—ama. 20) . . . Ozizi ahụ na alaeze Chineke bụ ọnọdụ miri emi nke uche, ma ọ bụ nke mgbapụta onwe onye, megidere okwu ndị gbara amaokwu a gburugburu, nakwa otú A[gba] Ọ[hụrụ] n’ozuzu ya si wepụta echiche ahụ.”
Okwu dị n’ala ala peji nke Luk 17:21 na New International Version na-egosi na a pụrụ ịsụgharị okwu Jisọs dị ka: “Alaeze Chineke dị n’etiti unu.” Nsụgharị Bible ndị ọzọ na-agụ: “Alaeze Chineke dị n’etiti unu” ma ọ bụ “nọ n’etiti unu.” (The New English Bible; The Jerusalem Bible; Revised Standard Version) Dị ka New World Translation of the Holy Scriptures si sụgharịa ya, Jisọs kwuru, sị: “Alaeze Chineke nọ n’etiti unu.” Jisọs ebughị n’uche na Alaeze ahụ nọ n’obi nke ndị Farisii ahụ dị mpako bụ́ ndị ọ na-agwa okwu. Kama nke ahụ, dị ka Mesaịa ahụ a nọworo na-ele anya ya eri ogologo oge na Onye A Họpụtaworo Ịbụ Eze, Jisọs nọ kpọmkwem n’etiti ha. Ma ogologo oge ga-agafe tupu Alaeze Chineke abịa.
Mgbe Ọ Ga-abịa
A họrọwo ụfọdụ n’ime ndị na-eso ụzọ Jisọs Kraịst dị ka ndị ga-eso ya achị ọchịchị n’Alaeze Mesaịa nke eluigwe. Dị ka Jisọs, ha nwụrụ ọnwụ n’ikwesi ntụkwasị obi nye Chineke ma bụrụ ndị e mere ka ha si n’ọnwụ bilie baa ná ndụ ndị bụ mmụọ n’eluigwe. (1 Pita 3:18) N’ịbụ ndị ọnụ ọgụgụ ha dị ole na ole ma e ji ya tụnyere ndị ọzọ, ha ga-adị 144,000 ndị eze na ndị nchụàjà a gbatara site n’etiti ihe a kpọrọ mmadụ. (Mkpughe 14:1-4; 20:6) Ndị ga-eso Jisọs achị ọchịchị gụnyere ndị ozi ya kwesịrị ntụkwasị obi.—Luk 12:32.
Mgbe ọ na-agwa ndị na-eso ụzọ ya okwu n’otu oge, Jisọs kwere nkwa, sị: “Ụfọdụ dị n’etiti ndị guzoro n’ebe a, ndị na-agaghị edetụ ọnwụ ire ma ọli ruo mgbe ha ga-ahụ Nwa nke mmadụ ka ọ na-abịa n’alaeze ya.” (Matiu 16:28) N’ụzọ na-akpali mmasị, amaokwu nke na-esonụ gosịrị na nkwa Jisọs mezuru nanị ka ụbọchị ole na ole gasịrị. Mgbe ahụ ọ kpọọrọ ndị na-eso ụzọ ya atọ gaa n’otu elu ugwu ebe a nọ n’ihu ha nwogharịa ya, ha wee si otú a nọrọ n’ọhụụ hụ ya ka ọ nọ n’ebube Alaeze. (Matiu 17:1-9) Ma e guzobeghị Alaeze ahụ n’oge ahụ. Olee mgbe nke a ga-ewere ọnọdụ?
Otu ilu Jisọs gosịrị na a gaghị echi ya echichi dị ka Eze Mesaịa ozugbo ahụ. Na Luk 19:11-15, anyị na-agụ, sị: “Ọ tụkwasi . . . ilu, n’ihi na ọ nọ Jerusalem nso, na n’ihi na ha na-eche na alaeze Chineke gaje ịpụta ìhè ngwa ngwa. Ya mere ọ sịrị, Otu nwoke a mazuru aha ya gara ala dị anya, ịnara alaeze nye onwe ya, na ịlaghachi. Ọ wee kpọọ mmadụ iri n’ime ndị ohu ya, nye ha iri pound ise, sị ha, Zụanụ ahịa ruo mgbe m ga-abịa . . . O wee ruo, mgbe ọ laghachiri ọzọ, mgbe ọ natasịrị alaeze ya, na ọ sịrị ka a kpọọ ndị ohu ahụ, ndị o nyererị ego ahụ, ka ha bịakwute ya, ka o wee mara ihe ha zụtararị n’ahịa.”
N’ụbọchị ndị ahụ ọ pụrụ iwe ogologo oge ka mmadụ jee site n’Israel ruo Rom, chere n’obodo ukwu ahụ ruo mgbe o nwetesịrị ike ọchịchị, ma lọghachị n’ala ya dị ka onye eze. Jisọs bụ onye ahụ bụ́ “nwoke a mazuru aha ya.” Ọ ga-anata ike dị ka Eze site n’aka Nna ya n’eluigwe ma a gaghị echi ya echichi dị ka Eze Mesaịa ahụ ozugbo. Ndị na-eso ụzọ ya ga-azụ ahịa site n’ịrụ ọrụ nke ikwusa ozi ọma nke Alaeze ahụ ruo oge ụfọdụ tupu ya alọghachi dị ka Eze.
Otú Alaeze Ahụ Ga-esi Bịa
Olee ihe ndị hụrụ Chineke n’anya na-arịọ mgbe ha na-ekpe ekpere ka Alaeze ya bịa? N’ezie ha na-arịọ ka Alaeze eluigwe ahụ mee ihe ga-eweta ihe nile ná njedebe site n’ibibi usoro ọchịchị nke mmadụ mere nke na-emezughị nkwa ha iweta ezi udo na ọganihu. N’izo aka n’ihe omume nke a, onye amụma bụ Daniel dere, sị: “Ma n’ụbọchị ha, bụ́ eze ndị a, ka Chineke nke eluigwe ga-eme ka otu alaeze bilie, nke agaghị emebi emebi ruo mgbe ebighị ebi, ọ bụkwa ọbụbụ eze ya ka a na-agaghị ahapụrụ ndị ọzọ; ọ ga-etipịa alaeze ndị a nile mee ka ha gwụsia, ma ya onwe ya ga-eguzosi ike ruo mgbe ebighị ebi.” (Daniel 2:44) Olee mgbe nke a ga-eme?
Jisọs buru amụma na nke a ga-ewere ọnọdụ n’ime ọgbọ nke ndị ahụ ga-ahụ oké ime mkpọtụ n’ihe omume nke mmadụ. Banyere ‘ọnụnọ’ ya, Jisọs nyere “ihe ịrịba ama” nke ọtụtụ ihe mejupụtara nke gụnyere ụdị ihe omume ndị dị ka agha na-enweghị atụ, ala ọma jijiji, ụkọ nri, ọrịa—ee, nakwa nkwusa ozi ọma nke Alaeze Chineke zuru ụwa ọnụ.—Matiu, isi 24, 25; Mak, isi 13; Luk, isi 21.
Amụma Jisọs gụnyere ihe omume ga-ewere ọnọdụ ugbu a—na narị afọ nke 20 anyị. Ya mere, ọ gaghị adị anya tupu Alaeze Chineke ewetere ihe a kpọrọ mmadụ ngọzị ndị dị ukwuu. Ị pụrụ ịbụ otu onye n’ime ndị ahụ ga-enweta abamuru nile nke ọchịchị Alaeze ahụ. Ma gịnị ka Alaeze Chineke pụrụ ịpụtara gị na ndị ị hụrụ n’anya?
Ngọzi Nile nke Ọchịchị Alaeze
Obi ụtọ ga-adị n’elu ala nile. N’okpuru “eluigwe ọhụrụ”—Alaeze eluigwe—ka “ụwa ọhụrụ” ahụ ga-adị, ọha mmadụ zuru ụwa ọnụ nke ndị na-erube isi nọ n’okpuru Alaeze. “Chineke onwe ya ga-anọnyekwara ha,” ka Jọn onyeozi dere. “Ọ ga-ehichapụkwa anya mmiri nile ọ bụla n’anya ha.” A gaghị enwe ihe ga-akpata ihe ọ bụla karịakwa obi ụtọ mgbe ahụ, n’ihi na “iru újú ma ọ bụ ịkwa ákwá ma ọ bụ ahụ ụfụ agaghị adịkwa ọzọ.”—Mkpughe 21:1-4.
Ọnwụ agaghị adịkwa. Ihe a dị oké njọ na-akpata iru újú agaghịkwa anapụ anyị ndị enyi na ndị anyị hụrụ n’anya. “Dị ka onye iro ikpeazụ, agaje ime ka ọnwụ ghara ịdị irè.” (1 Ndị Kọrịnt 15:26) Lee ọṅụ ga-adị mgbe a ga-eji mbilite n’ọnwụ nke ndị ahụ nile nọ na ncheta nke Chineke dochie ememe olili ozu!—Jọn 5:28, 29.
Ezi ahụ ike ga-anọchi ọrịa na nkwarụ. Àkwà ndịna ndị ụlọ ọgwụ agaghị ejupụtakwa na ndị ọrịa anụ ahụ na nke uche na-esogbu. Onye Dibia Ukwu ahụ, bụ́ Jisọs Kraịst, ga-etinye uru nke àjà mgbapụta ya n’ọrụ “ime ka ahụ dị mba nile ike.” (Mkpughe 22:1, 2; Matiu 20:28; 1 Jọn 2:1, 2) Ọgwụgwọ ọrịa ndị ọ gwọrọ mgbe ọ nọ n’elu ala bụ nanị ihe ngosipụta nke ihe ọ ga-eme site n’Alaeze ahụ.—Tụlee Aịsaịa 33:24; Matiu 14:14.
Ihe oriri ga-aba ụba. Dị ka onye ọbụ abụ ahụ kwuru, “ka ọtụtụ ọka dị n’ala n’elu ugwu nile.” (Abụ Ọma 72:16) Na nke a, amụma Aịsaịa gbakwụnyere, sị: “Ọ bụkwa n’ugwu a ka Jehova nke ụsụ nile nke ndị agha ga-emere ndị nile dị iche iche oké oriri nke ihe mara abụba, bụ́ oké oriri nke ezi mmanya vine doro edo, nke ihe mara abụba jupụtara n’ụmi, nke mmanya vine doro edo a zara nke ọma.” (Aịsaịa 25:6) N’ezie, ụkọ nri agaghị esogbu ndị nile bi n’elu ala n’okpuru ọchịchị Alaeze ahụ.
Elu ala nile ga-aghọ paradaịs. Mgbe ahụ ka a ga-emezu nkwa nke Jisọs kwere onye ahụ na-eme ihe ọjọọ nwere nchegharị: “Mụ na gị ga-anọ na Paradaịs.” (Luk 23:43) Gị onwe gị pụkwara inweta ndụ ebighị ebi n’elu ala nke a, elu ala e hichapụrụ ajọ omume n’ime ya ma gbanwee ka ọ bụrụ ụwa yiri ubi, e nwekwara ihe na-eme obi ụtọ n’ime ya.—Jọn 17:3.
A na-eche olileanya nke a dị ebube n’ihu ihe nile a kpọrọ mmadụ nwere nrube isi. Okwu Jehova e ji ike mmụọ nsọ dee, bụ́ Bible, na-enye ngọzi ndị a e ji n’aka. Ihe ndị a nile bụ ihe Alaeze Chineke pụrụ ịpụta nye gị.
[Foto dị na peeji nke 7]
I kwenyere n’ihe Jisọs kwuru banyere Alaeze Chineke?