Ndị Nkwusa Alaeze Na-akọ
Jehova Enyeghachi Otu Nwa Okoro Kwesịrị Ntụkwasị Obi Ụgwọ Ọrụ
NDỊ ntorobịa kwesịrị ntụkwasị obi bụ ihe oké ọnụ ahịa n’anya Jehova. Ahụmahụ na-esonụ nke otu nwa okorobịa kwesịrị ntụkwasị obi kwesịrị ịgba ndị na-eto eto ndị ọzọ ume ịnọgide ná nguzosi ike ha n’ezi ihe ka ha na-ejere Jehova ozi.
N’Argentina, otu nwa okoro nta dị afọ 11 na nwanne ya nwoke nke nta so nne ha ochie na-amụ akwụkwọ ahụ bụ Ezi-Okwu Ahu Nke Nedubà ná Ndu Ebigh-Ebi. Ozugbo ahụ, ndị mụrụ ụmụaka ahụ gosipụtara mmegide, ha machibidokwara ụmụaka ahụ iwu ije nzukọ ndị a na-enwe n’Ụlọ Nzukọ Alaeze. Ruo ogologo oge ụfọdụ, iji wee jee nzukọ ndị ahụ, ụmụaka ahụ na-esi na windo dị n’ụlọ ịsa ahụ ezopụ, madaa gaa na mbara èzí dị n’akụkụ ụlọ, sikwa n’ebe ahụ mafee mgbidi wee banye na mbara èzí dị n’akụkụ ụlọ onye agbata obi ha, wee jee n’Ụlọ Nzukọ Alaeze. Mgbe ahụ, otu onye gwara nne ha na ha na-eje nzukọ Ndịàmà Jehova. Nne ha yiri egwu iti ha ihe, nke a tụkwara nwa okoro nke nta ahụ egwu, o wee kwụsị ịmụ ihe. Ma nke nnukwu nọgidere. Ruo afọ ise, ọ nọgidere na-aga nzukọ ndị ahụ ná ndị mụrụ ya amataghị.
Mgbe ọ dị afọ 16, ọ chọrọ ije mụọ otu ihe na kọleji, bụ́ nke a na-adịghị akụzi n’obodo nke ya. Ịnọ n’ebe na-abụghị ụlọ ha ga-enye ya ohere ka ukwuu ịchụso eziokwu ahụ. Ndị mụrụ ya kwere ka o jee, ihe nile gakwara nke ọma ruo ọnwa atọ. Mgbe ahụ, onye isi ụlọ akwụkwọ ahụ gwara ndị mụrụ ya na nwa ha adịghị ekwe ikele ọkọlọtọ ma ọ bụ ịgụ abụ e ji eto mba ahụ. N’ihu onye isi ụlọ akwụkwọ ahụ, ndị mụrụ ya, otu onye odeakwụkwọ, otu onye ọkà iwu, na ndị prọfesọ iri, nwa okoro ahụ nwere ike ịgba ezi àmà banyere ihe mere na akọ na uche ya agaghị ekwe ya ime ihe ndị ahụ. (Ọpụpụ 20:4, 5) Iwe juru ndị mụrụ ya obi. Nne ya nwetara otu égbè revolver, na-akwadebe ịgbagbu nne ha ochie, bụ́ onye o chere na ọ bụ ya kpatara ihe a nile. Ma ọ dịghị mgbe o nwetara nanị ya.
Mgbe oge ụfọdụ gasịrị, site n’aro otu enyi ezinụlọ ahụ tụrụ, mgbe onye isi ụlọ akwụkwọ ahụ kwadokwara atụmatụ ahụ, ndị mụrụ ya kpebiri ịkpọje nwa okoro ahụ n’ụlọ ọgwụ ndị isi na-adịghị mma, na-eche na ọgwụgwọ ọrịa uche ga-eme ka ọ gbakụta okwukwe ya azụ. Ndị ọrụ ụlọ ọgwụ ahụ buuru nwa okoro ahụ na moto gaa 100 kilomita wee gbaa ya ọgwụ insulin na ọgwụ ndị ọzọ n’ebe ọ dị ukwuu ruo mgbe ọ na-amakwaghị onwe ya. Mgbe o tetara, ọ dịghị achịkọtakwa echiche ya ma ọlị, ọ dịghị ama onye ọ bụla, akụkụ ụfọdụ nke ike ncheta ihe ya na-efunarịkwa ya. Mgbe e mesịrị ezi nnyocha ọtụtụ ugbo, ndị dọkịta ahụ apụghị ịchọpụta ọrịa isi mgbaka ọ bụla na-arịa ya. Ma ụlọ ọgwụ ahụ gara n’ihu n’usoro ọgwụgwọ ahụ. Mgbe ọ maara ihe na-emenụ, nwa okoro ahụ nọgidere na-ekpeku Jehova ekpere ka ọ ghara ịgbakụta ya azụ ma rịọ ya maka ike iji wee nwee ntachi obi. Jehova chebere ya, e mesịkwara tọhapụ ya site n’ụlọ ọgwụ ahụ.
N’otu oge, onye isi ụlọ akwụkwọ ahụ jụrụ nwa okoro ahụ ma ọ dịwo njikere ịsị na ya ekwekwaghị ihe o kweburu. Mgbe ọ sịrị ee e, onye isi ụlọ akwụkwọ ahụ gwara ndị mụrụ ya ka ha kpọrọ ya laghachi n’ụlọ ọgwụ ahụ n’ihi na isi emebiwo ya karịa otú ọ dị na mbụ. Ndị mụrụ ya kpọjere ya n’otu ụlọ obibi ndị ije wee gwa nwanyị nwe ụlọ ahụ ka o jide n’aka na nwa okoro ahụ ejeghị nzukọ Ndịàmà Jehova. Mgbe ndị mụrụ ya lara, lee nnọọ ụdị ihe ịtụnanya nwa okoro ahụ nwetara! Ndị nwe ụlọ obibi ndị ije ahụ bụ Ndịàmà Jehova! N’ikpeazụ ndị mụrụ ya kwụsịrị inye ya ọgwụgwọ ndị isi na-adịghị mma, na-ekwere ugbu a na ndị dọkịta ndị ahụ agwawo ha okwu ụgha. N’agbata oge ahụ ka ụlọ ikpe ukwu Supreme Court nke Argentina kpebiri na a pụghị ịchụpụ ụmụ Ndịàmà Jehova n’ụlọ akwụkwọ n’ihi ekeleghị ọkọlọtọ.
Ọnwụnwa ndị a hà baara nwa okoro a kwesịrị ntụkwasị obi uru? Ọ sịrị: “Enwere m ike ịgbara ndị dọkịta, ndị prọfesọ, ụmụ akwụkwọ ibe m, ndị mụrụ m, ndị ikwu m, n’ezie, obodo ahụ dum, àmà n’ụzọ sara mbara. Ndị mụrụ m ebelatatụwo mmegide ha, ha enwewokwa nghọta dị mma karị banyere Ndịàmà ahụ. Ugbu a, mgbe m na-eleghachi anya azụ gaa n’oge m bụ nwata, ana m ahụ otú Chineke anyị si bụrụ onye dị ebube ma dị nro n’ilekọta onye na-eguzosi ike n’ebe ọ nọ. Ọ bụ kpọmkwem dị ka onye ọbụ abụ ahụ kwuru n’Abụ Ọma 27:10 (NW), sị: ‘Ọ bụrụ na nna m na nne m ahapụ m, ọbụna Jehova onwe ya ga-ekuli m.’”
Nwa okoro a agbawo 23 afọ ugbu a, ọ lụwo nwunye, na-arụsikwa ọrụ ike n’ijere Jehova ozi. N’eziokwu, ike nkwado Jehova abụghị ihe a kpaara ókè.—Abụ Ọma 55:22.