Olee Chi Nke A ga-efe Ofufe?
N’ADỊGHỊ ka ụmụ anụmanụ, anyị bụ mmadụ nwere ikike ife ofufe. Nke a bụ akụkụ nke ihe anyị bu pụta ụwa. Anyị nwekwara echiche banyere ihe ziri ezi, akọ na uche nke ga-eduzi anyị n’ihe banyere ihe bụ ezi ihe na ihe ọjọọ. N’ụzọ dị iche iche, anyị nile na-agbaso akọ na uche ahụ, n’ime otú ahụ, ọtụtụ ndị na-elegara otu chi ma ọ bụ chi dị iche iche anya maka nduzi.
N’ime otu narị afọ ma ọ bụ abụọ gara aga, ụfọdụ ndị oké mmụta akwụkwọ ụwa arụwo ụka banyere ịdị adị nke Chineke onye pụrụ ime ihe nile na Onye Okike. Na 1844, Karl Marx kwupụtara na okpukpe bụ “ọgwụ mmegharị anya a na-enye ụmụ mmadụ.” Mgbe e mesịrị, Charles Darwin wepụtara ozizi nke evolushọn. Mgbe ahụ, e nwere mgbanwe ọchịchị ndị Bolshevik ahụ. N’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Europe, ekweghị na Chineke ghọrọ ụkpụrụ echiche nke ọchịchị nabatara, e kwukwara na okpukpe ga-eso ọgbọ nke 1917 wee nwụchapụ. Ma ndị ahụ na-ekweghị na Chineke dị apụghị ịgbanwe otú e si mee ụmụ mmadụ. E nwere ihe àmà nke a ná mbiliteghachi nke okpukpe n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Europe n’oge a.
Otú ọ dị, dị ka Bible kwuru, e nwere ọtụtụ “ndị a na-akpọ chi . . . ma ọ bụ n’eluigwe ma ọ bụ n’elu ụwa; dị ka ọtụtụ chi na ọtụtụ ndị nwe mmadụ dị.” (1 Ndị Kọrint 8:5) N’ime ọgbọ nile, ihe a kpọrọ mmadụ efewo ọtụtụ chi dị iche iche. E nwewo chi dị iche iche nke ike ọmụmụ nwa, nke ịhụnanya, nke agha, na nke mmanya na oriri oké mkpọtụ. N’okpukpe ndị Hindu nanị, e nwere ọtụtụ nde chi dị iche iche.
E nwewo chi atọ n’ime otu dị iche iche na Babilọn, Asiria, na Ijipt, dịkwa ka e nwere n’ala dị iche iche nke ndị okpukpe Buddha. Krisendọm nwekwara Atọ n’Ime Otu “dị nsọ” nke ya. Okpukpe Islam, n’ịjụ Atọ n’Ime Otu ahụ, “enweghị chi ọzọ ma ọ bụghị Allah.” Ọzọkwa, ọbụna ndị ahụ na-akwa emo n’echiche nke bụ na e nwere Chineke onye pụrụ ime ihe nile nwekwara chi ndị nke ha. Dị ka ihe atụ, ná Ndị Filipaị 3:19, Bible na-ekwu banyere ụmụ mmadụ ndị nchụso ihe onwunwe mataworo n’ọnyá sị: “Chi ha bụ afọ ha.”
Ihe ka ọtụtụ n’ụmụ mmadụ na-efe chi ma ọ bụ chi dị iche iche nke ala ma ọ bụ ọha mmadụ ebe ọ dabara na a mụrụ ha. Nke a na-ewelite ajụjụ dị iche iche. Ụdị ofufe nile hà na-eduje n’otu ebe ahụ—dị ka ụzọ dị iche iche na-eduje n’ọnụ ọnụ nke oké ugwu? Ka ụzọ ihe omimi dị iche iche nke okpukpe hà na-eduje n’ọdachi—dị ka ụzọ dị iche iche na-eduje n’ọnụ ọnụ ebe a pụrụ isi daba ná ndagwurugwu dị omimi? È nwere ọtụtụ ụzọ ziri ezi isi fee ofufe ka è nwere nanị otu? È nwere chi dị iche iche ndị kwesịrị ịnata otuto ka è nwere nanị otu Chineke Onye Pụrụ Ime Ihe Nile bụ́ onye kwesịrị ka anyị rara ofufe na nsọpụrụ nile nye ya?
Mbilite nke Chi Ụgha Dị Iche Iche
Ajụjụ ndị dị n’elu ebe a kwesịrị ka anyị lebara ha anya nke ọma. N’ihi gịnị? N’ihi na ihe odide kasị mee ochie e nwere banyere okpukpe, bụ́ Bible, kọwara ụzọ otu chi ụgha, nke si n’otu agwọ na-eme ihe, si rara nne na nna ochie anyị banye n’ụzọ na-eduje n’ọdachi. Anyị na-enweta ajọ ihe ndị sitere n’atụmatụ ya pụta ruo taa. (Jenesis 3:1-13, 16-19; Abụ Ọma 51:5) Jisọs, bụ́ “Ọkpara Chineke,” kwuru okwu banyere chi nnupụisi ahụ dị ka “onye isi ụwa nke a.” Otu n’ime ndị ozi Jisọs kpọrọ ya “chi nke oge a.” (Jọn 1:34; 12:31; 16:11; 2 Ndị Kọrint 4:4) Ná Mkpughe isi 12, amaokwu nke 9, a kọwara ya dị ka “agwọ ochie ahụ, onye a na-akpọ Ekwensu na Setan, onye na-eduhie ụwa nile mmadụ bi.” Alaeze ụwa nke okpukpe ụgha nọ n’okpuru nduzi Setan.
Setan bụ onye isi nduhie. (1 Timoti 2:14) O ji aghụghọ na-eji ọchịchọ mmadụ bu pụta ụwa nke ife ofufe na-eme ihe site n’ịkwalite ọtụtụ ụdị chi dị iche iche—mmụọ nke ndị nna ochie, arụsị, ihe oyiyi okpukpe, na Madona dị iche iche. Ọbụna na ọ na-akwado ofufe nke chi dị iche iche bụ́ mmadụ, dị ka ndị ọchịchị dị ike, ndị ọchịagha nwere mmeri, na ndị ọkà n’ime ihe nkiri na n’egwuregwu. (Ọrụ 12:21-23) Anyị ga-eme nke ọma ịnọ ná nche, kpebisie ike ịchọpụta na ife nanị otu ezi Chineke ahụ, onye “ọ bụ ezie na ọ nọghị n’ebe dị anya n’ahụ onye ọ bụla n’ime anyị.”—Ọrụ 17:27.
N’ihi ya, ònye bụ Chineke nke a pụrụ iche onye anyị kwesịrị ife ofufe? Ihe dị ka 3,000 afọ gara aga, onye ọbụ abụ nke Bible kọwara ya dị ka “Onye kachasị ihe nile elu, . . . Onye pụrụ ime ihe nile . . . Chineke m, onye m na-atụkwasị obi,” jirikwa aha ya ahụ dị oké mma kpọọ ya—“Jehova.” (Abụ Ọma 91:1, 2) Tupu mgbe ahụ, Mosis ekwuwo banyere ya, sị: “Jehova, bụ́ Chineke anyị, Jehova bụ otu.” (Deuterọnọmi 6:4) Aịsaịa onye amụma hotakwara ihe Chineke n’onwe ya kwuru, na-asị: “Mụ onwe m bụ Jehova; nke ahụ bụ aha m: m gaghị enyekwa onye ọzọ nsọpụrụ m, m gaghị enyekwa arụsị dị iche iche a pịrị apị otuto m.”—Aịsaịa 42:8.
Jehova Chineke zubere iwepụchasị nkọcha nile chi ụgha ahụ bụ Setan wetawooro aha ya. O mere ihe atụ ụzọ ọ ga-esi mee nke a n’afọ 1513 T.O.A., mgbe o jiri onye amụma ya bụ Mosis mee ihe ịnapụta ndị Israel site ná mkpagbu nke ndị Ijipt. N’oge ahụ, Chineke jikọtara aha ya ahụ bụ Jehova na okwu ndị ahụ bụ: “Abụ m ihe m bụ.” (Ọpụpụ 3:14, 15) Ọ ga-ewepụ onwe ya n’ụta megide Fero nke Ijipt, ma o bu ụzọ gwa onye ọchịchị obi ọjọọ ahụ, sị: “Ọ bụ n’ihi nke a ka m guzoworo gị, ka m wee mee ka ị hụ ike m, ka e wee kọọkwa akụkọ aha m n’ụwa nile.”—Ọpụpụ 9:16.
Ọnọdụ yiri nke ahụ dịkwa taa. Dị ka Fero oge ochie, chi nke ụwa nke a, bụ́ Setan, na-ama Jehova Chineke aka n’ihu, jirikwa ụzọ aghụghọ na-ebu agha ime mmụọ megide mmadụ ndị ahụ hụrụ ezi omume na eziokwu n’anya. (Ndị Efesọs 6:11, 12, 18) Ọzọkwa, Chineke ezubewo ibuli aha ya elu n’agbanyeghị mmegide Setan. Otú ọ dị, tupu o gosipụta ike ya site n’ibibi Setan na ọrụ ya nile, Jehova na-edupụ ndị na-efe ya ofufe ka ha kpọsaa aha Ya n’elu ala dum. Ịgba àmà nye aha ya bụ akụkụ dị oké mkpa nke ezi ofufe.
N’ụzọ kwesịrị ekwesị, Chineke n’onwe ya ekwuwo na ndị a na-efe ya ofufe ga-abụ ndịàmà ya, Ndịàmà Jehova, “ndị m kpụworo nye onwe m, akụkọ otuto m ka ha ga-akọ.” (Aịsaịa 43:10-12, 21) Olee ụzọ ha na-esi akọ akụkọ otuto Jehova? Ha na-ekwusa, na-ezikwa ihe n’ihu ọha, sitekwa n’ụlọ ruo n’ụlọ, na-akpọsa ozi ọma ahụ nke bụ na Alaeze Jehova, nke Ọkpara ya, bụ́ Jisọs Kraịst na-achị, ga-eweta ngọzi ebighị ebi nye ihe a kpọrọ mmadụ na-erube isi n’elu ala nke a. Otú a, ha na-efe Chineke ‘n’esepụghị aka,’ dị ka ezi ndị Kraịst mere n’ime narị afọ nke mbụ. (Ọrụ 5:42; 20:20, 21) Hà enwetawo ngọzi Chineke n’ime nke a? Peji ndị na-esonụ ga-aza.