Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w91 3/15 p. 3-4
  • Nkwupụta Mmehie—Ọ̀ Dị Ihe Na-agahie?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Nkwupụta Mmehie—Ọ̀ Dị Ihe Na-agahie?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ọ̀ Bụ Ihe Omume Mmeghachi Efu?
  • Nkwupụta Mmehie—Ụzọ nke Mmadụ Ka Ọ̀ Bụ Ụzọ nke Chineke?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
  • Chineke Ọ̀ Chọrọ Ka Anyị Na-ekwupụta Mmehie Anyị?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2010
  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2001
  • M̀ Kwesịrị Ikwupụta Mmehie M?
    Teta!—1997
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
w91 3/15 p. 3-4

Nkwupụta Mmehie—Ọ̀ Dị Ihe Na-agahie?

“NKWUPỤTA mmehie bụ ime ka a dị ọcha n’ụzọ ime mmụọ, ụzọ e si amaliteghachi n’isi, ụzọ e si ehichapụ ihe ndị e meworo eme. Ọ na-amasị m ịga Nkwupụta, ịkọrọ onye ụkọchukwu mmehie m nile, ịhụ na ọ gbaghaara m na mmetụta oké mkpali nke na-esochinụ.” Otú ahụ ka otu onye na-ekpesi Katọlik ike kwuru.—Bless Me, Father, for I Have Sinned.

Dị ka akwụkwọ New Catholic Encyclopedia kwuru, “ọ bụ nanị onye ụkọchukwu ka Kraịst nyere ma ọ bụ nyefere ikike ikegide ihe ma ọ bụ ịtọhapụ ihe, nke ịgbaghara mmehie ma ọ bụ ime ka ọ dịgide.” Otu akwụkwọ ihe ọmụma ahụ kwuru na ihe e bu n’uche na-eme nkwupụta mgbe mgbe bụ “iji nwetaghachi ịdị nsọ nke ndụ, nke a tụfuru site ná mmehie dị oké njọ na . . . iji mee ka akọ na uche mmadụ dịrị ọcha.” Ma n’agbanyeghị nke ahụ, ọnọdụ akparamagwa n’ọtụtụ mba na-egosi na ịga nkwupụta mgbe mgbe adịghị eme ka ọtụtụ ndị na-eme ya “si n’ihe ọjọọ wezụga onwe [ha], mee ezi ihe.” (Abụ Ọma 34:14) Ya mere, ọ̀ dị ihe na-agahie?

Ọ̀ Bụ Ihe Omume Mmeghachi Efu?

Nkwupụta mmehie pụrụ ịmalite dị ka ihe omume mmeghachi efu. N’Ireland, a na-ebu ụzọ eme nkwupụta mmehie kpọmkwem tupu a nata Oriri Nsọ mbụ. Ọ̀ bụkwa ihe ijuanya na nwa agbọghọ nta dị afọ asaa ga-echekarị echiche banyere ọmarịcha uwe nwanyị a na-alụ ọhụrụ ọ ga-eyi karịa ịbụ banyere ‘iwetaghachi ịdị nsọ nke ndụ nke a tụfuru site ná mmehie dị oké njọ’?

Ramona, bụ́ onye jere nkwupụta mbụ ya mgbe ọ dị afọ asaa nakweere, sị, “Ihe kasị kpalie m bụ uwe ahụ, e wezụgakwa inweta ego site n’aka ndị ikwu m.” Ọ gara n’ihu, sị, “N’etiti ụmụ agbọghọ nta nile m maara, e nweghị mmetụta ọ bụla nke ihe ime mmụọ. Ọ dịghị nke ọ bụla n’ime anyị chere echiche ọbụna banyere Chineke n’oge ahụ.”

N’eziokwu, ịrụgide obere ụmụntakịrị ka ha na-ekwupụta mmehie mgbe mgbe pụrụ iduje n’okwu nkwughachi efu nke na-esighị n’obi pụta. Michael, onye malitekwara ihe omume nke nkwupụta mmehie mgbe ọ dị afọ asaa sịrị, “Ana m eji nnọọ otu ahịrị okwu ndị ahụ eme ihe mgbe nile.”

Okwu ụfọdụ ndị Katọlik kwuru, bụ́ ndị e hotara n’akwụkwọ ahụ bụ Bless Me, Father, for I Have Sinned na-egosi na nkwupụta mmehie enweghị abamuru ime mmụọ dị ukwuu nye ha ọbụna mgbe ha meworo okenye karị. Otu onye nakweere, sị, “Nkwupụta mmehie na-akụziri gị ikwu okwu ụgha, n’ihi na ọ dị nnọọ ihe ụfọdụ ị na-apụghị inwe obi ike ịgwa onye ụkọchukwu.” Mmadụ pụrụ iji anọgidesighị ike n’otu ihe n’etiti ndị ụkọchukwu mere ihe iji na-enweta ọpịpịa dị ala. Ụfọdụ ndị na-achọ “ezi” onye na-anụrụ nkwupụta mmehie iji wee nata ndụmọdụ nke ha chọrọ ịnụ. Otu nwa agbọghọ kwuru, sị, “Mgbe m chọgharịsịrị ruo ọnwa atọ, achọtara m onye m ga na-ekwupụtara mmehie. Ana m ejekwuru ya kwa ọnwa, ihu na ihu n’ime ụlọ nkwupụta mmehie ahụ, ọ bụkwa ezi mmadụ.” Otu onye Katọlik ọzọ kwukwara, sị, “Ọ bụrụ na ị maara ihe, ihe ị ga-eme bụ ịchọta onye ụkọchukwu nke na-adịghị anụ ihe, onye na-adịghị asụkwa asụsụ Bekee e wezụga okwu ahụ bụ ‘Ekelee M Maria atọ.’”

Ya mere, ihe àmà gosiri na ọ dị ihe na-agahie banyere nkwupụta mmehie dị ka ụfọdụ ndị si eme ya. Ma Bible na-egosi na ọ dị mkpa ime nkwupụta mmehie, n’ihi na ọ sịrị: “Ọ dịghị onye na-ekpuchi mmehie ya nile nke ga-enwe ihe ịga nke ọma, onye ọ bụla nke na-ekwupụta ma na-ahapụ ha ga-achọta obi ebere.”—Ilu 28:13, The New Jerusalem Bible.

Nke a ọ̀ pụtara na onye Kraịst ga-ekwupụta mmehie ya nile? Ya bụrụ otú ahụ, ọ̀ bụ nye onye? Isiokwu na-esonụ ga-enyocha ajụjụ ndị a.

    Akwukwo Igbo (1984-2026)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2026 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya