Echiche nke Bible
Ịnọ n’Alụghị Di Ma Ọ Bụ Nwunye Ọ̀ Bụ Ihe A Na-achọ n’Aka Ndị Kraịst Na-eje Ozi?
ỊNỌ n’alụghị di ma ọ bụ nwunye bụ, n’ikwu ya kpọmkwem, ọnọdụ nke enweghị di ma ọ bụ nwunye. Otú ọ dị, dị ka The New Encyclopædia Britannica si kwuo, ‘a na-ejikarị okwu ahụ eme ihe n’ihe metụtara ọrụ onye nọ n’alụghị di ma ọ bụ nwunye dị ka onye ọrụ okpukpe, ọkachamara okpukpe, ma ọ bụ onye na-ekpe okpukpe.’ Okwu ahụ bụ́ “nọ n’alụghị di ma ọ bụ nwunye” na-egosi “ndị ọnọdụ enweghị di ma ọ bụ nwunye ha bụ n’ihi nkwa dị nsọ ma ọ bụ omume nke ịjụ ihe ma ọ bụ nkwenkwe na ọ kaara mmadụ mma n’ihi ọkwá ya n’okpukpe ma ọ bụ ókè o jiruru okpukpe kpọrọ ihe.”
N’otu oge gara aga, ụfọdụ okpukpe a ma ama anakwerewo ịnọ n’alụghị di ma ọ bụ nwunye dị ka ihe a chọrọ maka ndị ozi ha. Ma, ọ dịghị okpukpe ọzọ nke Krisendọm nke ịnọ n’alụghị di ma ọ bụ nwunye ghọworo ihe e ji amata ya karịa ka ọ dị n’okpukpe Katọlik. Taa, e nwere esemokwu dị ukwuu banyere ịnọ n’alụghị di ma ọ bụ nwunye nke Katọlik. The Wilson Quarterly kwuru na “ọtụtụ nnyocha e mere n’iri afọ ndị na-adịbeghị anya ekwubiwo na ịnọ n’alụghị di ma ọ bụ nwunye nke a manyere amanye, bụ́ ihe a chọrọ n’aka ndị ụkọchukwu Katọlik eri narị afọ nke 12, bụ mkpọrọgwụ nke nsogbu chọọchị ahụ na-enwe n’inweta na ijigide ndị ụkọchukwu.” Dị ka ọkà ná mmụta mmekọrịta ọha na eze bụ́ Richard A. Schoenherr si kwuo, “eziokwu gbara ọkpụrụkpụ nke akụkọ ihe mere eme na mgbanwe nke ọha mmadụ na-emegide ịnabata nanị ndị ikom nọ n’alụghị nwunye n’òtù ndị ụkọchukwu Katọlik.” Gịnị bụ echiche nke Bible banyere ịnọ n’alụghị di ma ọ bụ nwunye?
Alụmdi na Nwunye Ka Ọ̀ Bụ Alụghị?
N’akụkọ ihe mere eme nile ọtụtụ ndị ikom na ndị inyom ji okpukpe kpọrọ ihe, n’ọtụtụ okpukpe dị iche iche, ahọrọwo ịnọ n’alụghị di ma ọ bụ nwunye. N’ihi gịnị? N’ọtụtụ ọnọdụ ọ bụ n’ihi na ha kwenyere na ihe anụ ahụ, nke ihe onwunwe bụ “ebe ihe ọjọọ hiwere isi.” Nke a kpalitere echiche nke bụ na ịdị ọcha n’ime mmụọ ga-ekwe omume nanị site n’izere ụdị inwe mmekọahụ nile. Otú ọ dị, nke a abụghị echiche nke Bible. N’ime Bible, a na-ele alụmdi na nwunye anya dị ka onyinye dị ọcha, dị nsọ, sitere n’aka Chineke. Ihe ndekọ nke Jenesis banyere okike na-egosi alụmdi na nwunye n’ụzọ doro anya dị ka ihe “dị mma” n’anya Chineke, n’ụzọ doro anya, ọ bụghịkwa dị ka ihe mgbochi nye isoro Chineke na-enwe mmekọrịta dị ọcha n’ụzọ ime mmụọ.—Jenesis 1:26-28, 31; 2:18, 22-24; leekwa Ilu 5:15-19.
Pita onyeozi na ndị ohu Chineke ndị ọzọ a nwapụtaworo bụ́ ndị nwere ọnọdụ ịbụisi n’ọgbakọ ndị Kraịst oge mbụ bụ ndị ikom nwere nwunye. (Matiu 8:14; Ọrụ 18:2; 21:8, 9; 1 Ndị Kọrint 9:5) Ntụzi Pọl onyeozi nyere Timoti banyere nhọpụta nke ndị nlekọta ọgbakọ, ma ọ bụ “ndị bishọp,” na-eme ka nke a doo anya. Ọ na-ede, sị: “Bishọp aghaghị ịbụ onye a na-apụghị ịkọcha akọcha, di nke otu nwunye.” (Ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’ụdị dị iche; 1 Timoti 3:2, Revised Standard Version, Mbipụta nke Katọlik) Rịba ama na ọ dịtụdịghị aro a tụrụ na o kwesịghị ekwesị n’ụzọ ọ bụla nye “bishọp” ịbụ onye lụrụ nwunye. Nanị ihe Pọl gosiri bụ na “bishọp” ekwesịghị inwe karịa otu nwunye; ọ bụrụ na o nwere nwunye, o kwesịrị inwe nanị otu nwunye. N’eziokwu, Cyclopedia of Biblical, Theological, and Ecclesiastical Literature, nke McClintock na Strong dere, na-ekwubi, sị: “Ọ dịghị akụkụ okwu dị n’A[gba] Ọ[hụrụ] nke a pụrụ ịtụgharị ịbụ mmachibido iwu megide alụmdi na nwunye nke ndị ụkọchukwu n’okpuru usoro iwu nke Oziọma ahụ.”
Ọ bụ ezie na o ji alụmdi na nwunye kpọrọ ihe nke ukwuu, n’ezie Bible adịghị akatọ alụghị di ma ọ bụ nwunye ma ọ bụrụ na e jiri ọchịchọ obi họrọ ya. Bible na-atụ aro ya dị ka ọnọdụ kwesịrị ekwesị nye ụfọdụ. (1 Ndị Kọrint 7:7, 8) Jisọs Kraịst kwuru na ụfọdụ ndị ikom na ndị inyom na-elezi anya ahọrọ ọnọdụ nke alụghị di ma ọ bụ nwunye. (Matiu 19:12) N’ihi gịnị? Ọ bụghị n’ihi na e nwere ihe na-adịghị ọcha dị n’alụmdi na nwunye nke ga-egbochi uto ime mmụọ ha. Ha na-ahọrọ ọnọdụ a nanị iji chee mgbalị ha ihu n’ime uche Chineke n’ihe ha ghọtara na ọ bụ oge chọrọ ime ihe ngwa ngwa.
Ihe Dugara n’Ịnọ n’Alụghị Di Ma Ọ Bụ Nwunye nke Bụ Iwu
Otú ọ dị, ọnọdụ gbanwere, n’ọtụtụ narị afọ sochiri oge nke Kraịst. N’ime narị afọ atọ ndị mbụ nke Oge Anyị, “e nwere ma ndị ozi lụrụ nwunye ma ndị na-alụghị,” ka David Rice, bụ́ onye òtù Dominic nke hapụrụ òtù ndị ụkọchukwu iji lụọ nwanyị, na-akọwa. Mgbe ahụ, ihe otu onye edemede okpukpe kọwara dị ka “njikọ nke echiche ndị Gris na nke Bible” nke wepụtara echiche gbagọrọ agbagọ banyere mmekọahụ na alụmdi na nwunye malitere imetụta ndị kpọrọ onwe ha ndị Kraịst.
N’ezie, ụfọdụ ka nọgidere na-achụso alụghị di ma ọ bụ nwunye nanị “iji nweta nnwere onwe zuru ezu iji mikpuo [onwe ha] n’ọrụ nke alaeze Chineke.” Otú ọ dị, nkà ihe ọmụma nke ndị na-ekpere arụsị nke ha nakwerewooro kwaliri ndị ọzọ. The New Encyclopædia Britannica na-ekwu, sị: “Nkwenkwe na mmekọahụ na-emerụ emerụ ma bụrụ nke ya na ịdị nsọ na-ekwekọghị pụtara [na chọọchị sị na ya bụ nke ndị Kraịst] dị ka nkwali bụ isi maka omume ịnọ n’alụghị di ma ọ bụ nwunye.”
Na narị afọ nke anọ, ka Rice na-ekwu, chọọchị “machibidoro onye ụkọchukwu nwere nwunye iwu inwe mmekọahụ n’abalị bu ụzọ tupu ụbọchị ememe Oriri Nsọ.” Mgbe chọọchị malitere ime Oriri Nsọ kwa ụbọchị, ọ pụtara na ndị ụkọchukwu aghaghị izere inwe mmekọahụ kpam kpam. Ka oge na-aga, a machibidoro alụmdi na nwunye nke ndị ụkọchukwu iwu kpam kpam. Ịnọ n’alụghị di ma ọ bụ nwunye si otú a ghọọ iwu maka onye ọ bụla ga-abụ onye ozi na chọọchị.
Pọl onyeozi dọrọ aka ná ntị banyere kpọmkwem ụdị ihe omume dị otú ahụ. O dere, sị: “Mmụọ ahụ ekwuwo hoo haa na n’oge ikpeazụ a ga-enwe ụfọdụ ndị ga-agbahapụ okwukwe ahụ ma họrọ ịṅa ndị mmụọ na-eduhie eduhie ntị na ozizi ndị sitere n’aka ndị ekwensu . . . Ha ga-asị na a machibidoro alụmdi na nwunye iwu.”—1 Timoti 4:1, 3, Jerusalem Bible.
“A gụkwara amamihe n’onye ezi omume site n’ọrụ ya nile,” ka Jisọs Kraịst kwuru. (Matiu 11:19) Ihe nzuzu dị n’ịgabiga ụkpụrụ Chineke abụrụwo nke a nwapụtara site n’ọrụ ya ma ọ bụ ihe ndị si na ya pụta. Onye na-ede akwụkwọ bụ́ David Rice gbara ọtụtụ ndị ụkọchukwu nọ gburugburu ụwa ajụjụ ọnụ n’isiokwu banyere ịnọ n’alụghị di ma ọ bụ nwunye nke bụ iwu. Ụfọdụ ndị ọ gwara okwu kwuru, sị: “Ị ga-anọ na-abụ ụkọchukwu, mee ihe ọ bụla dị mma ị pụrụ ime, ma jiri ịdị njikere nke ndị inyom na-abịa chọọchị, bụ́ ndị nwere mmasị n’ebe ị nọ, inyefe onwe ha n’ụzọ mmekọahụ mere ihe n’ụzọ akọ.”
N’ihota Matiu 7:20, Rice na-asị: “‘Unu ga-esite ná mkpụrụ ha mazuo ha,’ ka Jisọs kwuru.” Mgbe ahụ o kwuru okwu banyere ọdachi siteworo n’ịnọ n’alụghị di ma ọ bụ nwunye a manyere amanye pụta: “Ihe ịnọ n’alụghị di ma ọ bụ nwunye nke bụ iwu rụpụtara bụ ọtụtụ puku ndị ikom na-ebi ụdị ndụ abụọ, ọtụtụ puku ndị inyom na-ebi ndụ lara n’iyi, ọtụtụ puku ụmụaka nna ha bụ́ ụkọchukwu jụrụ, gụnyere ndị ụkọchukwu ọnọdụ ahụ na-ewute.”
Alụmdi na nwunye dị nsọpụrụ bụ ngọzi si n’aka Chineke. Ịnọ n’alụghị di ma ọ bụ nwunye nke a manyere amanye aghọwo ihe na-emebi ihe n’ụzọ ime mmụọ. Alụghị di ma ọ bụ nwunye nke e ji ọchịchọ obi họrọ, n’aka nke ọzọ, ọ bụ ezie na ọ dịghị mkpa maka ịdị nsọ ma ọ bụ nzọpụta, aghọwo ụzọ ndụ na-enyeghachi ụgwọ ọrụ na nke na-eju afọ n’ụzọ ime mmụọ nye ụfọdụ.—Matiu 19:12.
[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 12]
Life