Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g97 1/8 p. 3-4
  • “Mgbukpọ nke Ihe E Kere Eke”

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • “Mgbukpọ nke Ihe E Kere Eke”
  • Teta!—1997
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Imetọ Mbara Ụwa
  • “Anyị Bụ Ihe Otiti nke Aka Anyị”
  • Chineke Kwere Nkwa na Ụwa Anyị A Ga-adịgide
    Teta!—2023
  • Okwu Mmalite
    Teta!—2023
  • Mbara Ụwa Anyị Na-esighị Ike—Gịnị Banyere Ọdịnihu?
    Teta!—1996
  • Oké Ọhịa
    Teta!—2023
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—1997
g97 1/8 p. 3-4

“Mgbukpọ nke Ihe E Kere Eke”

SITE N’AKA ONYE NTA AKỤKỌ TETA! NA IRELAND

ANYAUKWU na-eyi ebe obibi gị egwu. Ọ na-ebelata ikike ụwa nwere inye ihe oriri na ụlọ dị anyị nile mkpa iji dịrị ndụ. Obi abụọ adịghị ya na ị maraworị otú anyaukwu si emebi ụwa, ma ndị a bụ ihe ncheta ole na ole.

Imetọ Mbara Ụwa

Laa azụ na 1962, Rachel Carson, n’akwụkwọ ya bụ́ Silent Spring, dọrọ aka ná ntị banyere iji ọgwụ e ji egbu ụmụ ahụhụ na ihe mkpofu na-egbu egbu emetọ mbara ụwa. Akwụkwọ bụ́ The Naked Savage na-ekwu, sị: “Ihe a kpọrọ mmadụ na-emebi ma na-emetọ gburugburu ebe obibi ya, ihe mgbaàmà maka mkpochapụ nke ụdị ihe dị iche iche.” Ndị mmadụ ka ji anyaukwu na-emetọ mbara ụwa. “N’ịchọ uru kasị ukwuu n’ime oge kasị mkpirikpi,” ka akwụkwọ bụ́ World Hunger: Twelve Myths na-ekwu, “ndị kasị na-akọ nri dị njikere iji ala, mmiri, na ọgwụ a na-etinye mee ihe gabiga ókè n’echeghị echiche banyere irichapụ elu ala, ibelata ọ̀tụ̀tụ̀ mmiri dị n’okpuru ala, na imetọ gburugburu ebe obibi.”

Kama ichebe oké ọhịa mmiri ozuzo ndị bara oké uru nke ụwa—bụ́ ndị dị mkpa maka nlanarị nke ụwa—ụmụ mmadụ na-ebibi ha ngwa ngwa karịa mgbe ọ bụla ọzọ. “Oké ọhịa juru eju nke ebe okpomọkụ,” ka ndị dere akwụkwọ bụ́ Far From Paradise—The Story of Man’s Impact on the Environment (1986) na-ekwu, “ga-afọ nke nta ka ha pụọ n’anya n’ime iri afọ ise ma ọ bụrụ na ọ̀tụ̀tụ̀ iji ha eme ihe n’ụzọ na-adịghị mma dị ugbu a agaa n’ihu n’agbanweghị.”

Ndị na-enweghị ụkpụrụ na-akụ azụ̀ ji ọgwụ dynamite na ọgwụ nwere nsí na-egbu azụ̀ na gburugburu akụkụ mmiri jupụtara na coral—nke a kọwaworo dị ka “ihe bi ná mmiri nke ya na oké ọhịa mmiri ozuzo ebe okpomọkụ bụ otu ihe ahụ” n’ihi ụba nke ụdị dị iche iche nke ndụ bi n’ime ha. Usoro ọjọọ ndị a nke ịkụ azụ̀ tinyere mmetọ e ji ọgwụ eme n’echeghị echiche ‘ebibiwo n’ụzọ dị ukwuu’ ọtụtụ coral dị ndụ.—The Toronto Star.

“Anyị Bụ Ihe Otiti nke Aka Anyị”

Sir Shridath Ramphal, bụ́ onye isi nke Òtù Nchekwa Ụwa nke IUCN malite na 1991 ruo 1993, na-akọwa ụdị iji ihe ndị dị n’ụwa eme ihe otú a n’ụzọ na-adịghị mma dị ka “mgbukpọ nke ihe e kere eke.” Ruo nnọọ ókè hà aṅaa ka ọ dịruru ná njọ? N’inye otu ihe atụ, Ramphal na-ede, sị: “Ihe ka ọtụtụ n’osimiri India bụ nnọọ ebe ghere oghe mmiri ruru unyi si aga, na-eburu ihe mkpofu a na-etinyeghị ọgwụ site n’ógbè mepere emepe na ime obodo gaa n’oké osimiri.” Gịnị bụ nkwubi okwu ya? “Anyị bụ ihe otiti nke aka anyị.”

Anyaukwu ejupụtawo akụkọ ihe mere eme nke mmadụ ruo ọtụtụ narị afọ, ma egwu a na-eyi nlanarị nke mbara ụwa taa amụbawo. N’ihi gịnị? N’ihi na ikike mbibi mmadụ nwere ka nnọọ ukwuu ugbu a. “Nanị n’ime iri afọ ise gara aga,” ka akwụkwọ bụ́ Far From Paradise na-ekwu, “anyị enwewo ụzọ iji ọgwụ na ígwè ọrụ bibie ụdị ndụ ndị ọzọ n’elu mbara ụwa anyị n’ụzọ dị irè. . . . Homo sapiens [Latin, onye amamihe], dị ka mmadụ ji enweghị obi umeala na-akpọ onwe ya, fọrọ nke nta ka o nwee ike zuru ezu, ọ kwụsịwokwa igosipụta mgbochi ọ bụla.” N’oge na-adịbeghị anya, òtù gburugburu ebe obibi bụ́ Greenpeace kwupụtara amamikpe siri ike, na-asị: “Mmadụ oge a emewo ka Paradaịs [ụwa] ghọọ ikpó ihe mkpofu . . . na-eguzokwa ugbu a dị ka obere nwa na-amaghị nke a na-akọ . . . n’ọnụ ọnụ nke ibibi kpam kpam ebe nchebe ndụ nke a.”

Ma anyaukwu na-eme ihe karịrị iyi atụmanya na-adịte anya nke mbara ụwa egwu. Ọ na-eyi obi ụtọ e nwere ugbu a na nchebe nke gị na ezinụlọ gị egwu. Olee otú nke a si dị otú a? Tụlee isiokwu na-esonụ.

    Akwukwo Igbo (1984-2026)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2026 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya