Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • ijwex isiokwu 4
  • Ndị Uwe Ojii Eduga Josef Ozi Ọma

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ndị Uwe Ojii Eduga Josef Ozi Ọma
  • Ihe Ndịàmà Jehova Kọrọ
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • O Chebere Ezinụlọ Ya, Gbooro Ha Mkpa Ha ma Rubere Chineke Isi Ruo Ọnwụ
    Ṅomie Okwukwe Ha
  • O Chebere Ezinụlọ Ya, Gbooro Ha Mkpa Ha, Rubekwara Chineke Isi Ruo Ọnwụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2012
  • “Olee Otú M Ga-esi Mee Oké Ihe Ọjọọ A?”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2014
  • “Ànọ M n’Ọnọdụ Chineke?”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2015
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ihe Ndịàmà Jehova Kọrọ
ijwex isiokwu 4
Ụgbọala ndị uwe ojii

Ndị Uwe Ojii Eduga Josef Ozi Ọma

Ọ bụrụ na ị bụ Onyeàmà Jehova, ì chetụla otú ọ ga-adị ma ndị uwe ojii soro gị na-agagharị ka ị na-ekwusa ozi ọma site n’ụlọ ruo n’ụlọ? Ọ bụ ụdị ihe a mere Josef na Maịkronishia n’afọ 2017. Ya na Ndịàmà Jehova atọ gara n’otu agwaetiti dịbara n’ime ka ha zie ndị bi ebe ahụ ozi ọma n’oge a na-eme mkpọsa pụrụ iche.

N’ehihie, ha anọ rutere n’obere agwaetiti ahụ, nke ihe dị ka narị mmadụ isii bi na ya. Onyeisi obodo ahụ bịara kelee ha mgbe ha rutere n’ụsọ mmiri ahụ. Josef kwuru ihe ọzọ merenụ. Ọ sịrị: “Onyeisi obodo ahụ kwuru na e nwere ụgbọala ndị uwe ojii nwere ike ibuga anyị n’ụlọ niile. Ihe a o kwuru juru anyị anya, ma anyị medara obi gwa ya hapụwa. Anyị chọrọ isi otú ahụ anyị si aga ozi ọma gaa hụ ndị mmadụ, ya bụ, site n’ụlọ ruo n’ụlọ.”

Ndị nkwusa ahụ ji ụkwụ palie ije n’egbughị oge, n’ihi na ha kpebisiri ike ikwusara ọtụtụ ndị ozi ọma. Ndịàmà Jehova ahụ kwuru, sị: “Ndị obodo ahụ dị obiọma, na-anabata ọbịa, nweekwa mmasị n’ozi ọma. Nke a mere ka anyị gbuo oge n’ụlọ ọ bụla anyị banyere karịa otú anyị tụrụ anya ya.”

Ka ọ na-eru ná mgbede, ndị uwe ojii ji ụgbọala ha gbafee Josef ugboro abụọ ma kwụsị na nke atọ ya. Ha jụrụ Josef ma ha nwere ike ibuga ya n’ụlọ ndị fọrọnụ. Josef kwuru, sị: “M sịrị ha mba. Ma na nke ugbu a, ha jụrụ, ma sị m, ‘Oge agawala, n’ihi ya, anyị ga-ebuga gị n’ụlọ ndị fọrọnụ.’ M kwere n’ihi na m ka nwere ọtụtụ ụlọ m ga-aga. Anyị ruwe n’ụlọ nke ọ bụla, ha na-agwa m aha onye anyị na-aga na nke ya. Ha kwukwara na ọ bụrụ na o nweghị onye pụtara ma m kụọ aka, na ha ga-egbu opi ha ka onye ahụ mepee ụzọ.

“Ihe a mere ka anyị nwee ike ikwusa ozi ọma n’ụlọ niile dị ebe ahụ n’ụbọchị ahụ. Anyị nyefere ha ọtụtụ akwụkwọ ma hazie otú ahụ ga-esi abịaghachi leta ndị nwere mmasị.”

Ndị uwe ojii ahụ gwara Josef na obi dị ha ụtọ iso gaa kwusaa ozi ọma. Ná mgbede, mgbe ha na-ala, ndị uwe ojii ndị ahụ ji ihu ọchị na-efere ha aka. Ha jikwa akwụkwuọ ndị e nyere ha n’aka.

    Akwukwo Igbo (1984-2026)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2026 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya