Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • ijwex isiokwu 14
  • Anyị Kpebiri Ilegide Anya Otu Ebe

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Anyị Kpebiri Ilegide Anya Otu Ebe
  • Ihe Ndịàmà Jehova Kọrọ
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ihe Ndị Anyị Ga-amụta n’Aka Ndị Naziraịt
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2024
  • Anya Gị Ọ̀ Na-elegide Otu Ebe?
    Ozi Alaeze Anyi—2010
  • Na-echeta Ndị Nọ n’Ozi Oge Niile
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2014
  • Ụzọ Dị Iche Iche Anyị Nwere Ike Isi Jekwuoro Jehova Ozi
    Ndị A Haziri Ime Uche Jehova
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ihe Ndịàmà Jehova Kọrọ
ijwex isiokwu 14
Ebe onye na-ere ọgba tum tum na-enye onye na-azụ ya mkpịsị ugodi ọgba tum tum ahụ. Ọgba tum tum ahụ dị n’azụ.

Anyị Kpebiri Ilegide Anya Otu Ebe

Madián na Marcela bi n’obodo Medlin, nke dị na Kolombia. Ha nwekwara ihe na-ezuru ha. Madián na-arụ ọrụ a na-akwụ ya ezigbo ụgwọ, nke mere ka ha biri n’otu ọmarịcha ụlọ. Ma otu ụbọchị, e nwere ihe mere ha ji lebagharịa anya n’ihe kacha ha mkpa ná ndụ ebe ha bụ ndị na-efe Jehova Chineke. Ha sịrị: “N’afọ 2006, anyị gara otu mgbakọ pụrụ iche isiokwu ya bụ ‘Legide Anya Otu Ebe.’ N’ọtụtụ okwu ndị e kwuru n’ụbọchị ahụ, e kwusiri okwu ike na ọ dị mkpa ka Ndị Kraịst hapụ ihe ụfọdụ ha na-eme ka ha nwekwuo ohere ijere Chineke ozi. Ka anyị si mgbakọ ahụ na-ala, anyị chọpụtara na ndụ anyị na-ebi dị nnọọ iche n’ihe anyị nụrụ. Anyị na-azụkarị ihe ọ bụla anyị hụrụ masịrị anyị, ọ sọkwa ya ya bụrụ na anyị enweghị ego ya mgbe ahụ. O mekwara ka anyị jide nnukwu ụgwọ.”

Mgbe Madián na Marcela gechara okwu ndị ahụ e kwuru ná mgbakọ ahụ, ha malitere iselata aka n’ihe ndị ha na-azụ. Ha sịrị: “Ihe mbụ anyị mere bụ iselata aka n’otú anyị si emefu ego. Anyị kwagakwara n’ụlọ dị ntakịrị, ree ụgbọala anyị, zụrụzie ọgba tum tum.” Ha kwụsịkwara ịga ná nnukwu ụlọ ahịa ka ha ghara ịna-ahụ ihe ndị ahụ ga-agụwa ha agụụ ịzụta. Ha malitekwara iji oge buru ibu na-agwa ndị agbata obi ha gbasara Baịbụl. Ha metakwara ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche enyi, bụ́ ndị na-eji oge buru ibu akụziri ndị ọzọ banyere Jehova Chineke.a

Marcela na Madián.

Ọ dịghị anya, Madián na Marcela ekpebie na ha ga-etinyekwu oge buru ibu n’ikwusa ozi ọma. Ha kwagara otu obere ime obodo ebe e nwere ọgbakọ chọkwuru ndị na-ekwusa ozi ọma. Madián kwụsịrị ọrụ ya ka ha nwee ike ịkwaga ebe ahụ. Onye Madián na-arụrụ ọrụ aghọtaghị ihe mere o ji mee ụdị mkpebi ahụ. N’ihi ya, Madián jụrụ ya, sị: “Ị na-akpata ego buru ibu, ma ị̀ na-enwe obi ụtọ?” O kwetara na ya anaghị enwe obi ụtọ n’ihi na e nwere ọtụtụ nsogbu ọ na-amaghị ihe ọ ga-eme gbasara ha. Madián sịziri ya: “Ị̀ hụlanụ na ihe kacha mkpa n’ụwa a abụghị mmadụ inwe ego? Ihe kacha mkpa bụ ihe na-eme ka i nwee obi ụtọ. Ịkụziri ndị mmadụ gbasara Chineke na-eme mụ na nwunye m obi ụtọ, anyị chọkwara ka anyị na-enwekwu obi ụtọ ahụ. Ọ bụ ya mere anyị ji chọọ ijikwu oge anyị na-akụziri ndị mmadụ gbasara Chineke.”

Madián na Marcela nwere ezigbo obi ụtọ n’ihi na ha ji oge ha niile na-ejere Chineke ozi. Kemgbe afọ iri na atọ gara aga, ha ejeela ozi n’ọgbakọ dị iche iche a chọkwuru ndị na-ekwusa ozi ọma n’ebe ugwu Kolombia. Ha bụkwa ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche ugbu a.

Ebe Marcela na Madián na-agwa otu nwoke okwu n’ime obodo. Ha na-egosi ya akwụkwọ ‘Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?’

a Ọ bụ alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova dị ná mba ọ bụla na-ahọpụta ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche. Ha na-ezigakwa ha ebe ha ga-eji oge buru ibu na-ekwusa ozi ọma. A na-enye ha obere ego mmachi akpa ha ga-eji na-egbo mkpa ha.

    Akwukwo Igbo (1984-2026)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2026 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya