EPREL 27–MEE 3
AỊZAYA 56-57
Abụ nke 12 na Ekpere | Okwu Mmeghe (1 nkeji)
1. Obi Dị Anyị Ụtọ na Jehova Bụ Chineke Anyị
(Nkeji 10)
Arụsị anaghị anapụta ndị na-akpọku ha ka ha nyere ha aka (Aịza. 57:13; ip-2 269 ¶14-16)
Obi anaghị eru ndị na-anaghị efe Jehova ala, ha adịghịkwa n’otu (Aịza. 57:20; w18.06 7 ¶16; it “Ụwa” ¶21)
Udo agaghị adịrị ndị ajọ omume (Aịza. 57:21; it “Udo” ¶3)
JỤỌ ONWE GỊ, SỊ: Olee otú ndụ m si na-aka mma maka na mụ na Jehova dị ná mma?
2. Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
(Nkeji 10)
Aịza. 56:6, 7—Olee otú amụma a si emezu? (w07 1/15 10 ¶2; w06 11/1 27 ¶1)
Gịnị ka ị mụtara n’ọgụgụ Baịbụl nke izu a ị ga-achọ ịkọ?
3. Ọgụgụ Baịbụl
(Nkeji 4) Aịza. 56:4-12 (th ihe ọmụmụ nke 5)
4. Ịmalite Mkparịta Ụka
(Nkeji 3) ỊGBA ÀMÀ N’OGE A NA-ANỌGHỊ N’OZI. Gwa onye ahụ ihe ị mụtara n’ọmụmụ ihe ị gara n’oge na-adịbeghị anya. (lmd isi nke 2 nọmba nke 4)
5. Ịkọwa Ihe Ndị I Kweere
(Nkeji 5) Okwu. ijwbq isiokwu nke 90—Isiokwu: Mmadụ Ò Kwesịrị Inwe Okpukpe Ọ Nọ na Ya? (th ihe ọmụmụ nke 16)
6. Ime Ka Ha Bụrụ Ndị Na-eso Ụzọ Jizọs
(Nkeji 4) lff isi nke 19 nọmba nke 4 (lmd isi nke 11 nọmba nke 3)
Abụ nke 58
7. Akwụsịla Ikwu Gbasara Jehova
(Nkeji 15) Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ.
Ndị na-anaghị efe Jehova enweghị ihe a tụkwasịrị obi na-eduzi ha, ndụ ha enweghị isi, ha enweghịkwa ezigbo olileanya. N’agbanyeghị ya, ọtụtụ n’ime ha anaghị anabata ozi Alaeze. Ha amaghị na eziokwu ndị dị na Baịbụl ga-abara ha ezigbo uru. Lee ihe ụfọdụ mere na ike anaghị agwụ anyị, obi anaghịkwa ada anyị mbà, ọ bụrụgodị na ndị mmadụ egeghị anyị ntị.—Ekli. 11:6.
Ihe na-agbanwekarị n’ókèala anyị. Ndị na-anaghị achọ ige anyị ntị n’ókèala anyị nwere ike ịkwapụ. Ndị ọhụrụ kwabataranụ nwere ike ịchọ ige anyị ntị
Anyị kụọ aka n’ụzọ, o nwere ike ịbụ onye ọzọ ga-emepe ụzọ. Nne ma ọ bụ nna merela agadi, nwata bụ́zi onye toro eto, onye ọhụrụ kwabatara n’ụlọ, ma ọ bụ onye ọbịa nwere ike ịbịa mepee ụzọ ma anyị kụọ aka
Àgwà ndị mmadụ na-agbanwe agbanwe. (1 Tim. 1:13) Otú ihe si na-aka njọ n’ụwa ma ọ bụ ọdachi dakwasịrị mmadụ nwere ike ime ka onye ahụ gewezie ntị n’ozi ọma
Anyị nọgide na-ekwusa ozi ọma, anyị na-egosi na anyị hụrụ Jehova n’anya.—Luk 6:45; 1 Jọn 5:3
Kpọnye VIDIO Bụ́ Jehova ‘Nọ Anyị Nso.’ Juzie ụmụnna ajụjụ a:
Olee ihe ndị ị mụtara na vidio a gbasara ịnọgide na-ekwusa ozi ọma n’agbanyeghị ihe ndị nwere ike ime ka ikwusa ya siere anyị ike?
8. Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ
(Nkeji 30) lfb isi nke 80-81