OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ
Nwee Obi Ike Mgbe Ihe Siiri Gị Ike
N’oge ikpeazụ a, nsogbu na-ezoro ndị mmadụ ka mmiri. O dokwara anya na ihe ga na-esikwu ike ka ọgwụgwụ ụwa ochie na-erukwu nso. Ihe ụfọdụ nwekwara ike ịkọ anyị. (Hab. 3:16-18) Olee ihe nwere ike inyere anyị aka inwe obi ike mgbe ihe siiri anyị ike? Anyị kwesịrị ịnọgide na-atụkwasị Chineke anyị bụ́ Jehova obi. O kwela nkwa na ya ga na-elekọta ndị ohu ya. Ọ ga na-egboro anyị mkpa anyị n’agbanyeghị otú ihe si dịrị.—Ọma 37:18, 19; Hib. 13:5, 6.
Ihe i nwere ike ime:
Rịọ Jehova ka o duzie gị, nye gị amamihe ma kwado gị.—Ọma 62:8
Dị njikere ịrụ ọrụ ị na-arụbeghị mbụ.—w12 6/1 p. 23; g-E 1/10 8-9, igbe
Na-eme ihe ndị ga-eme ka gị na Jehova dịrị ná mma, dị ka ịgụ Okwu Chineke kwa ụbọchị, ịga ọmụmụ ihe, na ikwusa ozi ọma
LEENỤ VIDIO BỤ́ WUO ỤLỌ NA-AGAGHỊ ADA ADA—“NA-ENWE AFỌ OJUJU N’IHE NDỊ DỊ UGBU A,” ZAAKWANỤ AJỤJỤ NDỊ A:
Olee nsogbu bịaarala ụfọdụ ezinụlọ?
Olee ihe kacha mkpa ná ndụ?
Olee otú anyị nwere ike isi nyere ndị ihe na-esiri ike aka?