Septemba 5-11
1 NDỊ EZE 9-10
Abụ nke 10 na Ekpere
Okwu Mmeghe (1 nkeji)
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE
“Too Jehova Maka Amamihe Ya”: (Nkeji 10)
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke: (Nkeji 10)
1 Eze 10:10, 14—Olee ihe gosiri na ọlaedo Eze Solomọn nwere hà otú Baịbụl kwuru na ọ hà? (w08 11/1 22 ¶4-6)
Gịnị ka ị mụtara n’ọgụgụ Baịbụl nke izu a gbasara Jehova, ozi anyị, ma ọ bụ ihe ọzọ?
Ọgụgụ Baịbụl: (Nkeji 4) 1 Eze 10:1-13 (th ihe ọmụmụ nke 5)
MỤTAKWUO IZI OZI ỌMA NKE ỌMA
Vidio Mkparịta Ụka nke Mbụ: (Nkeji 5) Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Kpọnye vidio Mkparịta Ụka nke Mbụ: Ọmụmụ Baịbụl—Ọma 37:29. Mgbe ọ bụla ajụjụ pụtara na vidio ahụ, kwụsịtụ ya ma jụọ ụmụnna ajụjụ ndị ahụ. Ha zachaa, a kpọnyekwa ya.
Mkparịta Ụka nke Mbụ: (Nkeji 3) Jiri ihe dị n’ebe e dere Mkpọsa A Ga-eme Iji Malitere Ndị Mmadụ Ọmụmụ Baịbụl mee ya. (th ihe ọmụmụ nke 1)
Mkparịta Ụka nke Mbụ: (Nkeji 5) Buru ụzọ mee ihe dị n’ebe e dere Mkpọsa A Ga-eme Iji Malitere Ndị Mmadụ Ọmụmụ Baịbụl. Jirizie isi nke 01 na broshọ Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi malitere ya ọmụmụ Baịbụl. (th ihe ọmụmụ nke 13)
OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ
“Chọta Amamihe Ga-abara Gị Uru Kwa Ụbọchị na JW.ORG”: (Nkeji 8) Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Gbaa mmadụ niile ume ka ha na-aga na jw.org mgbe ọ bụla ha chọrọ inweta ndụmọdụ si na Baịbụl ga-enyere ha aka ná nsogbu na-abịara ha kwa ụbọchị.
Mkpa Ọgbakọ: (Nkeji 7)
Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ: (Nkeji 30) lff isi nke 18 nọmba nke 6-7 na nchịkọta, ajụjụ ndị e ji echeta ihe a mụrụ, na ihe ị ga-agba mbọ mee
Okwu Mmechi (Nkeji 3)
Abụ nke 106 na Ekpere