Nọvemba 1-7
JOSHỤA 18-19
Abụ nke 12 na Ekpere
Okwu Mmeghe (1 nkeji)
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE
“Otú Jehova Si Keere Ụmụ Izrel Ala Gosiri na Ọ Ma Ihe”: (Nkeji 10)
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke: (Nkeji 10)
Josh. 18:1-3—Gịnị ka ọ ga-abụ ya mere ụmụ Izrel ji gbuo oge ịga biri n’ala ndị dị n’ebe ọdịda anyanwụ Jọdan? (it-1 359 ¶5)
Gịnị ka ị mụtara n’ọgụgụ Baịbụl nke izu a gbasara Jehova, ozi anyị, ma ọ bụ ihe ọzọ?
Ọgụgụ Baịbụl: (Nkeji 4) Josh. 18:1-14 (th ihe ọmụmụ nke 2)
MỤTAKWUO IZI OZI ỌMA NKE ỌMA
Vidio Mkparịta Ụka nke Mbụ: (Nkeji 5) Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Kpọnye vidio Mkparịta Ụka nke Mbụ: Ozi Ọma—Ọma 37:10, 11. Mgbe ọ bụla ajụjụ pụtara na vidio ahụ, kwụsịtụ ya ma jụọ ụmụnna ajụjụ ndị ahụ. Ha zachaa, a kpọnyekwa ya.
Mkparịta Ụka nke Mbụ: (Nkeji 4) Buru ụzọ mee ihe dị n’ebe e dere Ihe Gị na Mmadụ Nwere Ike Ikwurịta. Nyezie ya Ụlọ Nche nke 2, nke afọ 2021. (th ihe ọmụmụ nke 1)
Mkparịta Ụka nke Mbụ: (Nkeji 4) Buru ụzọ mee ihe dị n’ebe e dere Ihe Gị na Mmadụ Nwere Ike Ikwurịta. Zie ya ozi ọma n’agbanyeghị na o kwuru ihe ndị na-achọghị ịnụ ozi ọma na-ekwukarị. (th ihe ọmụmụ nke 11)
OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ
“Anyị Na-ekele Jehova Maka Ịhụnanya Unu”: (Nkeji 15) Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Ọ bụ okenye ga-eme ya. Kpọnye vidio bụ́ Anyị ‘Na-ekele Chineke Mgbe Niile n’Ihi Unu.’ Kwuo otu ihe ma ọ bụ abụọ gbara ọkpụrụkpụ e kwuru n’isiokwu ndị gbara n’ebe e dere “Ihe Ndị E Ji Onyinye I Nyere Eme” na jw.org.
Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ: (Nkeji 30) bt isi nke 17 ¶8-14 na igbe dị na peeji nke 137
Okwu Mmechi (Nkeji 3)
Abụ nke 122 na Ekpere