Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • mwb21 Jenụwarị p. 11
  • Kpebie Ijere Jehova Ozi

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Kpebie Ijere Jehova Ozi
  • Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2021
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ime Baptizim Ga-abara Gị Ezigbo Uru
    Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi—Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịmụ Baịbụl
  • E Kwesịrị Ime Ndị Kraịst Baptizim
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2018
  • Ihe Baptizim Pụtara na Uru Ọ Bara
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2026
  • Iru Ihe Ndị A Chọrọ Tupu E Mee Mmadụ Baptizim Dị Ka Onye Kraịst
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2006
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2021
mwb21 Jenụwarị p. 11
Ụzọ dị warara nke na-egosi ihe mmadụ ga-eme iji ruo eru ijere Jehova ozi. Ihe ndị nọ n’ụzọ ahụ na-egosi ihe ndị ahụ. Ha bụ ịmụ Baịbụl, ịga ọmụmụ ihe, ịga ozi ọma, na ime baptizim.

Olee ebe ị nọ n’ụzọ na-eduga na baptizim?

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Kpebie Ijere Jehova Ozi

Ọ bụrụ na ị bụ onye nkwusa a na-emebeghị baptizim ma ọ bụ onye a na-amụrụ Baịbụl, ị̀ chọrọ ime baptizim? Gịnị mere i kwesịrị iji mee baptizim? Mmadụ inyefe Jehova onwe ya, e meekwa ya baptizim ga-eme ka onye ahụ na Jehova dịrị ná mma n’ụzọ pụrụ iche. (Ọma 91:1) Ọ ga-emekwa ka a zọpụta anyị. (1 Pita 3:21) Olee ihe ị ga-eme ka i ruo eru ime baptizim?

Gbalịa chọpụta n’onwe gị na ihe a na-akụziri gị bụ eziokwu. E nwee ihe na-agbagwoju gị anya, gbalịa wepụta ezigbo oge mee nchọnchọ banyere ya. (Rom 12:2) Chọpụta ihe ndị i kwesịrị ịgbanwe ná ndụ gị, gbalịakwa mee mgbanwe ndị ahụ ebe ọ bụ na ị chọrọ ime ihe dị Jehova mma. (Ilu 27:11; Efe. 4:23, 24) Na-arịọ ya mgbe niile ka o nyere gị aka. Obi siekwa gị ike na Jehova ga-eji mmụọ nsọ ya nyere gị aka ma kwadoo gị. (1 Pita 5:10, 11) Mbọ ọ bụla ị gbara ime ihe ndị a agaghị efu ọhịa. Ijere Jehova ozi bụ ihe kacha mma mmadụ nwere ike ime.—Ọma 16:11.

LEENỤ VIDIO BỤ́ IHE MMADỤ GA NA-EME KA O NWEE IKE RUO ERU IME BAPTIZIM, ZAAKWANỤ AJỤJỤ NDỊ A:

  • Olee nsogbu ndị ụfọdụ meriri iji nwee ike ime baptizim?

  • Gịnị ga-enyere gị aka inwe ụdị okwukwe ga-eme ka i nyefee Jehova onwe gị?

  • Olee ihe nyeere ụfọdụ ndị aka ịgbalị ruo eru ime baptizim?

  • Olee ngọzi ndị kpebiri ijere Jehova ozi na-enweta?

  • Gịnị ka mmadụ inyefe Jehova onwe ya na ime baptizim pụtara?

Ná ngwụcha okwu baptizim, nwanna na-ekwu okwu ahụ na-agwa ndị niile chọrọ ime baptizim ka ha bilie ọtọ ma jiri olu dara ụda zaa ajụjụ abụọ ndị a:

Ì chegharịala ná mmehie gị, nyefee Jehova onwe gị, ma na-ebi ndụ gosiri na i kwetara na o si n’aka Jizọs Kraịst azọpụta anyị?

Ị̀ ghọtara na baptizim a ga-eme gị na-egosi na ị ghọọla Onyeàmà Jehova nọ ná nzukọ Jehova?

Ọ bụrụ na ndị a na-aga ime baptizim azaa ee n’ajụjụ abụọ a, ọ pụtara na ha emeela “nkwupụta ihu ọha” nakwa na ha nwere okwukwe n’àjà mgbapụta Jizọs. Ọ pụtakwara na ha enyefeela Jehova onwe ha kpamkpam.—Rom 10:9, 10.

    Akwukwo Igbo (1984-2026)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2026 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya