FEBỤWARỊ 24–MACH 1
JENESIS 20-21
Abụ nke 108 na Ekpere
Okwu Mmeghe (1 nkeji)
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE
“Jehova Na-eme Ihe O kwere ná Nkwa Mgbe Niile”: (Nkeji 10)
Jen. 21:1-3—Sera tụụrụ ime mụọ nwa nwoke (wp17.5 14-15)
Jen. 21:5-7—Jehova mere ka ihe yiri ihe na-agaghị ekwe omume kwe omume
Jen. 21:10-12, 14—Ebreham na Sera nwere okwukwe siri ike na nkwa Jehova kwere gbasara Aịzik ga-emezu
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke: (Nkeji 10)
Jen. 20:12—Olee otú Sera si bụrụ nwanne Ebreham? (wp17.3 12, ihe e dere n’ala ala peeji)
Jen. 21:33—Olee otú Ebreham si “kpọkuo aha Jehova”? (w89 7/1 20 ¶9)
Gịnị ka ị mụtara n’ọgụgụ Baịbụl nke izu a gbasara Jehova Chineke, ozi anyị, ma ọ bụ ihe ọzọ?
Ọgụgụ Baịbụl: (Nkeji 4 ma ọ bụ ihe na-erughị ya) Jen. 20:1-18 (th ihe ọmụmụ nke 5)
MỤTAKWUO IZI OZI ỌMA NKE ỌMA
Vidio Nletaghachi nke Abụọ: (Nkeji 5) Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Kpọnye vidio ahụ ma jụọ ajụjụ ndị a: Olee otú onye nkwusa ahụ si mee ka a mata uru Baịbụl bara? Gịnị mere o ji dị mma ime ihe a o mere ma anyị hụ onye nwere mmasị?
Nletaghachi nke Abụọ: (Nkeji 3 ma ọ bụ ihe na-erughị ya) Jiri ihe dị na peeji nke mbụ mee ya. (th ihe ọmụmụ nke 4)
Ọmụmụ Baịbụl: (Nkeji 5 ma ọ bụ ihe na-erughị ya) bhs 35 ¶19-20 (th ihe ọmụmụ nke 3)
OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ
Akụkọ Ozi Afọ Ije Ozi Gara Aga: (Nkeji 15) Okwu okenye ga-ekwu. A gụchaa akwụkwọ ozi si n’alaka ụlọ ọrụ gbasara akụkọ ozi anyị nke afọ ije ozi gara aga, gbaa ndị nkwusa ụfọdụ i bu ụzọ gwa ajụjụ ọnụ. Ha ga-abụ ndị nwere ihe na-agba ume mere n’ozi ha n’afọ gara aga.
Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ: (Nkeji 30) jy isi nke 105
Okwu Mmechi (Nkeji 3 ma ọ bụ ihe na-erughị ya)
Abụ nke 119 na Ekpere