Febụwarị 10-16
JENESIS 15-17
Abụ nke 39 na Ekpere
Okwu Mmeghe (1 nkeji)
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE
“Gịnị Mere Jehova Ji Gụgharịa Ebram na Seraị Aha?”: (Nkeji 10)
Jen. 17:1—N’agbanyeghị na Ebram ezughị okè, ọ gbalịrị bụrụ onye na-enweghị ntụpọ (it-1 817)
Jen. 17:3-5—A gụgharịrị Ebram aha ka ọ zawazie Ebreham (it-1 31 ¶1)
Jen. 17:15, 16—A gụgharịrị Seraị aha ka ọ zawazie Sera (w09 2/1 13)
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke: (Nkeji 10)
Jen. 15:13, 14—Olee mgbe narị afọ anọ nke mmekpa ahụ́ ahụ malitere na mgbe ọ kwụsịrị? (it-1 460-461)
Jen. 15:16—Olee otú ụmụ Ebreham si laghachi Kenan “n’ọgbọ nke anọ”? (it-1 778 ¶4)
Gịnị ka ị mụtara n’ọgụgụ Baịbụl nke izu a gbasara Jehova Chineke, ozi anyị, ma ọ bụ ihe ọzọ?
Ọgụgụ Baịbụl: (Nkeji 4 ma ọ bụ ihe na-erughị ya) Jen. 15:1-21 (th ihe ọmụmụ nke 10)
MỤTAKWUO IZI OZI ỌMA NKE ỌMA
Vidio Mkparịta Ụka nke Mbụ: (Nkeji 4) Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Kpọnye vidio ahụ ma jụọ ajụjụ ndị a: Olee otú onye nkwusa ahụ si jụọ ajụjụ n’ụzọ dabara adaba? Olee otú o si jiri ihe atụ kụzie ihe?
Mkparịta Ụka nke Mbụ: (Nkeji 3 ma ọ bụ ihe na-erughị ya) Buru ụzọ mee ihe dị na peeji nke mbụ. Zie ya ozi ọma n’agbanyeghị na o kwuru ihe gosiri na ọ chọghị ịnụ ozi ọma. (th ihe ọmụmụ nke 3)
Mkparịta Ụka nke Mbụ: (Nkeji 5 ma ọ bụ ihe na-erughị ya) Buru ụzọ mee ihe dị na peeji nke mbụ. Nyezie ya broshọ Ozi Ọma ma jiri isi nke 3 malitere ya ọmụmụ Baịbụl. (th ihe ọmụmụ nke 6)
OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ
“Otú Ị Ga-esi Eme Ka Gị na Di Gị ma Ọ Bụ Nwunye Gị Dịkwuo ná Mma”: (Nkeji 15) Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Kpọnye vidio bụ́ Otú Ị Ga-esi Eme Ka Gị na Di Gị Ma Ọ Bụ Nwunye Gị Dịkwuo ná Mma.
Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ: (Nkeji 30) jy isi nke 103
Okwu Mmechi (Nkeji 3 ma ọ bụ ihe na-erughị ya)
Abụ nke 92 na Ekpere