Disemba 9-15
MKPUGHE 10-12
Abụ nke 26 na Ekpere
Okwu Mmeghe (Nkeji 3 ma ọ bụ ihe na-erughị ya)
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE
“‘E Gburu Ndị Àmà Abụọ,’ E mechaa Kpọlite Ha”: (Nkeji 10)
Mkpu. 11:3—‘Ndị àmà abụọ’ buru amụma ruo otu puku ụbọchị na narị ụbọchị abụọ na iri isii (w14 11/15 30)
Mkpu. 11:7—“Anụ ọhịa ahụ” gburu ha
Mkpu. 11:11—E mere ka ‘ndị àmà abụọ’ ahụ dịghachi ndụ mgbe “ụbọchị atọ na ọkara” gachara
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke: (Nkeji 8)
Mkpu. 10:9, 10—Olee otú o si bụrụ na ozi ahụ e nyere Jọn ‘na-elu ilu, na-atọkwa ụtọ’? (it-2 880-881)
Mkpu. 12:1-5—Olee otú ihe e kwuru n’amaokwu ndị a si mezuo? (it-2 187 ¶7-9)
Gịnị ka ọgụgụ Baịbụl nke izu a kụziiri gị gbasara Jehova?
Olee ihe ndị ọzọ ị mụtara n’ọgụgụ Baịbụl nke izu a?
Ọgụgụ Baịbụl: (Nkeji 4 ma ọ bụ ihe na-erughị ya) Mkpu. 10:1-11 (th ihe ọmụmụ nke 10)
MỤTAKWUO IZI OZI ỌMA NKE ỌMA
Vidio Mkparịta Ụka nke Mbụ: (Nkeji 4) Kpọnye vidio ahụ. Kwurịtakwanụ ihe unu mụtara na ya.
Mkparịta Ụka nke Mbụ: (Nkeji 2 ma ọ bụ ihe na-erughị ya) Jiri ihe dị na peeji nke mbụ mee ya. (th ihe ọmụmụ nke 6)
Mkparịta Ụka nke Mbụ: (Nkeji 3 ma ọ bụ ihe na-erughị ya) Jiri ihe dị na peeji nke mbụ zie ozi ọma otú dabara adaba n’ókèala unu mgbe ị na-anọghị n’ozi. (th ihe ọmụmụ nke 3)
Mkparịta Ụka nke Mbụ: (Nkeji 3 ma ọ bụ ihe na-erughị ya) Buru ụzọ mee ihe dị na peeji nke mbụ. Nyekwa ya otu n’ime akwụkwọ ndị anyị ji akụziri ndị mmadụ ihe. (th ihe ọmụmụ nke 9)
OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ
“Ala ‘Meghere Ọnụ Ya Loo Osimiri Ahụ’ ”: (Nkeji 15) Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Kpọnye vidio aha ya bụ A Tọhapụla Ụmụnna Anyị Nọ n’Ụlọ Mkpọrọ na Koria.
Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ: (Nkeji 30) jy isi nke 94
Ịchịkọta ihe a mụrụ n’ọmụmụ ihe na ikwu ihe a ga-amụ n’izu ọzọ (Nkeji 3)
Abụ nke 47 na Ekpere