Mee 20-26
2 Ndị Kọrịnt 11-13
Abụ nke 3 na Ekpere
Okwu Mmeghe (Nkeji 3 ma ọ bụ ihe na-erughị ya)
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE
“‘Ogwu Pọl Nwere n’Anụ Ahụ́ Ya’”: (Nkeji 10)
2 Kọr. 12:7—Pọl onyeozi diri nsogbu dị ka ogwu n’anụ ahụ́ ya (w08 6/15 3-4)
2 Kọr. 12:8, 9—Jehova achọghị iwepụrụ Pọl ogwu ahụ dị ya n’anụ ahụ́ n’agbanyeghị na ọ rịọla ya ka o wepụ ya (w06 12/15 24 ¶17-18)
2 Kọr. 12:10—Pọl rụzuru ọrụ ya n’ihi na ọ ma na mmụọ nsọ Chineke ga na-enye ya ike (w18.01 9 ¶8-9)
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke: (Nkeji 8)
2 Kọr. 12:2-4—Gịnị ka ọ ga-abụ ya ka ‘eluigwe nke atọ’ na “paradaịs” e kwuru okwu ha n’amaokwu a pụtara? (w18.12 8 ¶10-12)
2 Kọr. 13:12—Gịnị ka ọ ga-abụ ya ka “nsusu ọnụ dị nsọ” pụtara? (it-2 177)
Gịnị ka ọgụgụ Baịbụl nke izu a kụziiri gị gbasara Jehova?
Olee ihe ndị ọzọ ị mụtara n’ọgụgụ Baịbụl nke izu a?
Ọgụgụ Baịbụl: (Nkeji 4 ma ọ bụ ihe na-erughị ya) 2 Kọr. 11:1-15 (th ihe ọmụmụ nke 5)
MỤTAKWUO IZI OZI ỌMA NKE ỌMA
Vidio Nletaghachi nke Mbụ: (Nkeji 5) Kpọnye vidio ahụ. Kwurịtakwanụ ihe unu mụtara na ya.
Nletaghachi nke Mbụ: (Nkeji 3 ma ọ bụ ihe na-erughị ya) Jiri ihe dị na peeji nke mbụ mee ya. (th ihe ọmụmụ nke 2)
Nletaghachi nke Mbụ: (Nkeji 4 ma ọ bụ ihe na-erughị ya) Buru ụzọ mee ihe dị na peeji nke mbụ. Nye ya akwụkwọ Baịbụl Na-akụziri Anyị ma gosi ya otú anyị na ndị mmadụ si eji ya amụ ihe. (th ihe ọmụmụ nke 4)
OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ
“Ị Ga-emerili n’Agbanyeghị ‘Ogwu Dị Gị n’Anụ Ahụ́’ ”: (Nkeji 15) Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Kpọnye vidio aha ya bụ “A Ga-emeghe Anya Ndị Ìsì”. Gwa mmadụ niile na e nweziri akwụkwọ anyị ná mkpụrụ akwụkwọ ndị ìsì n’asụsụ iri anọ na asaa, nakwa na e nwere ha n’ụdị ya dị iche iche. Ndị nkwusa chọrọ ya kwesịrị ịgwa ohu na-eje ozi nke na-ahụ maka akwụkwọ ka ọ tụọrọ ha ọda ya. Gbaa ụmụnna niile ume ka ha gbalịa nyere ndị ìsì nọ n’ọgbakọ ha na n’ókèala ha aka.
Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ: (Nkeji 30) jy isi nke 67
Ịchịkọta ihe a mụrụ n’ọmụmụ ihe na ikwu ihe a ga-amụ n’izu ọzọ (Nkeji 3)
Abụ nke 78 na Ekpere