Nọvemba 19-25
ỌRỤ NDỊOZI 4-5
Abụ nke 73 na Ekpere
Okwu Mmeghe (Nkeji 3 ma ọ bụ ihe na-erughị ya)
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE
“Ha Nọgidere Na-ekwu Okwu Chineke n’Atụghị Egwu”: (Nkeji 10)
Ọrụ 4:5-13—N’agbanyeghị na Pita na Jọn “bụ ndị na-agụghị oké akwụkwọ na ndị nkịtị,” ha ekweghị ka ụjọ mee ka ha ghara ikwu ihe ha kweere n’ihu ndị na-achị achị na ndị odeakwụkwọ (w08 9/1 15, igbe; w08 5/15 30 ¶6)
Ọrụ 4:18-20—Pita na Jọn akwụsịghị ikwusa ozi ọma n’agbanyeghị egwu a na-eyi ha
Ọrụ 4:23-31—Ndị Kraịst n’oge ndịozi tụkwasịrị Jehova obi ka o nye ha mmụọ nsọ ya ka ha nwee ike ikwu okwu Chineke n’atụghị egwu (mwbr18.11 it-1 128 ¶3)
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke: (Nkeji 8)
Ọrụ 4:11—Olee otú Jizọs si bụrụ nkume “isi nkuku”? (mwbr18.11 it-1 514 ¶4)
Ọrụ 5:1—Gịnị mere Ananayas na Safaịra ji ree ihe ụfọdụ ha nwere? (w13 3/1 15 ¶4)
Gịnị ka ọgụgụ Baịbụl nke izu a kụziiri gị gbasara Jehova?
Olee ihe ndị ọzọ ị mụtara n’ọgụgụ Baịbụl nke izu a?
Ọgụgụ Baịbụl: (Nkeji 4 ma ọ bụ ihe na-erughị ya) Ọrụ 5:27-42
MỤTAKWUO IZI OZI ỌMA NKE ỌMA
Mkparịta Ụka nke Mbụ: (Nkeji 2 ma ọ bụ ihe na-erughị ya) Buru ụzọ mee ihe dị na peeji nke mbụ. Onye nwe ụlọ ekwuo ihe ndị na-achọghị ịnụ ozi ọma na-ekwukarị ma unu gaa ozi ọma.
Nletaghachi nke Mbụ: (Nkeji 3 ma ọ bụ ihe na-erughị ya) Buru ụzọ mee ihe dị na peeji nke mbụ. Onye ahụ agwa gị na ya abụghị onye chọọchị.
Vidio Nletaghachi nke Abụọ: (Nkeji 5) Kpọnye vidio ahụ. Kwurịtakwanụ ihe unu mụtara na ya.
OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ
“Uru Iji Ihe Nkwagharị Ezi Ozi Ọma Na-aba n’Ụwa Niile”: (Nkeji 15) Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Ọ bụ onye nlekọta ije ozi ga-eme ya. Kpọnye vidio ahụ. Ọ bụrụ na ọgbakọ unu na-eji tebụl ma ọ bụ ihe a na-akwagharị akwagharị e tinyere akwụkwọ anyị ezi ozi ọma, bute ya gosi ụmụnna. Kwuo otú unu haziri isi na-ezi ọma a. Ọ bụrụ na oge dị, kọọ ihe dị mma mere n’oge unu ji tebụl ma ọ bụ ihe a na-akwagharị akwagharị na-ezi ozi ọma, ma ọ bụkwanụ e mee ihe ngosi otú o si mee. Kọwaa otú ndị nkwusa ga-esi na-eso eji ya ezi ozi ọma.
Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ: (Nkeji 30) jy isi nke 43 ¶8-18
Ịchịkọta ihe a mụrụ n’ọmụmụ ihe na ikwu ihe a ga-amụ n’izu ọzọ (Nkeji 3)
Abụ nke 64 na Ekpere