Disemba 4-10
ZEFANAYA 1–HAGAỊ 2
Abụ nke 151 na Ekpere
Okwu Mmeghe (Nkeji 3 ma ọ bụ ihe na-erughị ya)
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE
“Chọọnụ Jehova Tupu Ụbọchị Iwe Ya”: (Nkeji 10)
[Kpọnye vidio bụ́ Ihe Akwụkwọ Zefanaya Na-ekwu.]
Zef. 2:2, 3—Chọọnụ Jehova, chọọnụ ezi omume, chọọkwanụ ịdị umeala n’obi (w01 2/15 18-19 ¶5-7)
[Kpọnye vidio bụ́ Ihe Akwụkwọ Hagaị Na-ekwu.]
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke: (Nkeji 8)
Zef. 1:8—Olee ihe amaokwu Baịbụl a na-adọ anyị aka ná ntị gbasara ya? (w07 11/15 11 ¶3)
Hag. 2:9—Olee otú ebube ụlọ nsọ Zerubabel si karịa ebube ụlọ nsọ Sọlọmọn? (w07 12/1 9 ¶2)
Gịnị ka ọgụgụ Baịbụl nke izu a kụziiri gị gbasara Jehova?
Olee ihe ndị ọzọ ị mụtara n’ọgụgụ Baịbụl nke izu a?
Ọgụgụ Baịbụl: (Nkeji 4 ma ọ bụ ihe na-erughị ya) Hag. 2:1-14
MỤTAKWUO IZI OZI ỌMA NKE ỌMA
Kwadebe Otú Anyị Ga-esi Zie Ozi Ọma n’Ọnwa A: (Nkeji 15) Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Ọ ga-esi n’ebe e dere “Ihe I Nwere Ike Ikwu.” Kpọnye vidio ndị na-egosi otú anyị ga-esi ezi ozi ọma n’ọnwa a. E lechaa nke ọ bụla, a tụlee ihe ndị gbara ọkpụrụkpụ dị na ya. Gbaa ụmụnna ume ka ha gbaa mbọ hụ na ha kesara Teta! nke 6 2017 ka o ruo mmadụ niile aka. Ma, ebe ọ bụ na mkpa anyị bụ ka anyị na ndị mmadụ nwee nkwurịta okwu ihu na ihu, anyị ekwesịghị idowere onye na-anọghị n’ụlọ Teta! ọhụrụ a.
OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ
Mkpa Ọgbakọ: (Nkeji 5)
Asụsụ Dị Ọcha Na-eme Ka E Nwee Udo na Ịdị n’Otu (Zef. 3:9): (Nkeji 10) Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Ọ ga-esi n’Ụlọ Nche nke Ọgọst 15, 2012, peeji nke 12, paragraf nke 4. Kpọnye vidio aha ya bụ Ndị Bụbu Ndị Iro Mechara Ghọọ Enyi.
Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ: (Nkeji 30) kr isi nke 22 ¶8-16
Ịchịkọta ihe a mụrụ n’ọmụmụ ihe na ikwu ihe a ga-amụ n’izu ọzọ (Nkeji 3)
Abụ nke 136 na Ekpere