Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • mwb17 Jenụwarị p. 8
  • Cheta Ịna-etinye Ndị Kraịst A Na-akpagbu n’Ekpere

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Cheta Ịna-etinye Ndị Kraịst A Na-akpagbu n’Ekpere
  • Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2017
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Na-aṅụrị Ọṅụ Mgbe A Na-akpagbu Gị
    Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2022
  • Ndị A Na-akpagbu Ma Ha Enwee Obi Ụtọ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2004
  • Na-echeta Ndị Ọzọ n’Ekpere
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2025
  • ‘Na-ekpenụ Ekpere n’Ihi Ibe Unu’
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2017
mwb17 Jenụwarị p. 8

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Cheta Ịna-etinye Ndị Kraịst A Na-akpagbu n’Ekpere

Baịbụl buru amụma na Setan ga na-akpagbu anyị iji mee ka anyị kwụsị ijere Chineke ozi. (Jọn 15:20; Mkpu. 12:17) Olee otú anyị nwere ike isi nyere ụmụnna anyị ndị a na-akpagbu ná mba ọzọ aka? Anyị nwere ike ịna-etinye ha n’ekpere. “Ekpere nke onye ezi omume na-ekpesi ike dị ike nke ukwuu mgbe ọ na-akpa ike.”—Jems 5:16.

Ebe a kpụ otu nwanna nwoke a tụnyere ịgá n’aka na-akpụba n’ụlọ mkpọrọ; ụmụnna ndị nwoke na ndị nwaanyị; ebe otu nwanna na-ekpe ekpere

Olee ihe anyị nwere ike ikpe n’ekpere? Anyị nwere ike ịrịọ Jehova ka o mee ka ụmụnna anyị kata obi ma ghara ịtụ ụjọ. (Aịza. 41:10-13) Anyị nwekwara ike ịrịọ Jehova ka o mee ka ndị ọchịchị ghara inye anyị nsogbu n’oziọma anyị na-ekwusa, “ka anyị wee na-ebi ndụ dị nwayọọ na nke dị jụụ.”—1 Tim. 2:1, 2.

Mgbe a na-akpagbu Pọl na Pita, Ndị Kraịst oge mbụ kpọrọ ha aha n’ekpere ha ma rịọ Jehova ka o nyere ha aka. (Ọrụ 12:5; Rom 15:30, 31) Ọ bụrụgodị na anyị amaghị aha ụmụnna anyị niile a na-akpagbu n’ebe dị iche iche n’ụwa, ka anyị gbalịa kpọọ aha ọgbakọ ha, obodo ha, ma ọ bụ mpaghara ebe ha bi n’ekpere anyị.

  • Ị gaa na jw.org, ị ga-ahụ akụkọ ndị kacha ọhụrụ gbasara ụmụnna anyị ndị a na-akpagbu ná mba dị iche iche. (Gaa n’ebe e dere AKỤKỌ pịzie ebe e dere > OKWU IKPE.)

  • Ị gaa na jw.org mepee isiokwu bụ́ “Ebe Ndị A Tụrụ Ndịàmà Jehova Mkpọrọ n’Ihi Ihe Ha Kweere” ị ga-ahụ ebe e depụtara ọnụ ọgụgụ ụmụnna anyị a tụrụ mkpọrọ n’obodo nke ọ bụla. (Gaa n’ebe e dere AKỤKỌ pịzie ebe e dere > OKWU IKPE. Pịa mba nke ị chọrọ ka ị mata ihe gbasara ya nakwa ka ị hụ ebe e dere aha ụmụnna niile a tụrụ mkpọrọ ná mba ahụ n’ụdị PDF.)

Dee aha obodo ebe ndị a na-akpagbu ụmụnna anyị, ka i nwee ike itinye ha n’ekpere:

    Akwukwo Igbo (1984-2026)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2026 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya