Okwu Chineke Ọ̀ Na-akpa Ike ná Ndụ Gị?
Ịgụ Baịbụl kwa ụbọchị ga-enyere anyị aka ka ụkwụ sie anyị ike n’ofufe Chineke, okwukwe anyị esikwuo ike. (Kọl. 2:6, 7) Ma, ihe ga-eme ka Okwu Jehova na-akpa ike ná ndụ anyị bụ ịtụgharị uche n’ihe anyị gụtara na ya na ime ya eme. (Hib. 4:12; Jems 1:22-25) Jọshụa 1:8 kwuru ihe atọ anyị kwesịrị ime mgbe anyị na-agụ Baịbụl. Ha bụ: (1) Ịgụ ya “ehihie na abalị.” (2) Ịgụ ya “n’olu dị ala,” ya bụ, ịgụ ya otú anyị ga-enwe ike ịna-atụgharị uche n’ihe anyị na-agụ ma were ya na anyị nọ ebe ihe anyị na-agụ gbasara ya mere. (3) Ịgba mbọ na-eme “ihe niile e dere na ya.” Anyị na-eme ihe atọ a, ọ ga-agaziri anyị, anyị ejirikwa amamihe na-eme ihe ọ bụla anyị na-eme ná ndụ.