Ihe I Nwere Ike Ikwu
Ịmalite Ọmụmụ Baịbụl na Satọdee Mbụ n’Ọnwa Septemba
I kelechaa onye ị bịara na nke ya, gị asị ya: “Anyị na ndị agbata obi anyị na-ekwu banyere ihe ga-enyere di na nwunye aka ịna-ebi n’udo. Gịnị ka i chere na-emekarị ka di na nwunye ghara ịna-ebi n’udo?” Chere ka ọ zaa. Ya kwuchaa, gị egosi ya, Ụlọ Nche Septemba 1, peeji nke 16. Gị na ya tụlee ajụjụ nke mbụ dị na peeji ahụ, gụọkwanụ ma ọ́ dịghị ihe ọzọ otu n’ime amaokwu Baịbụl ndị dị n’ebe ahụ. I mechaa, nyekọta ya Ụlọ Nche ahụ na Teta!, gị na ya yiekwa mgbe ị ga-abịaghachi ka unu tụlee ajụjụ nke abụọ.
Ụlọ Nche Septemba 1
I kelechaa onye ị bịara na nke ya, gị asị ya: “Ọtụtụ ndị na-eche ihe mere Chineke ji kwe ka ndị mmadụ na-ata ahụhụ. Ì chetụla ihe mere anyị ji ata ahụhụ? [Chere ka ọ zaa. Ya kwuchaa, gị asị ya:] Ama m na obi ga-adị gị ụtọ ịnụ na Chineke kwere nkwa na e nwere oge iru uju na ihe mgbu na-agaghịkwa adị. [Gụọ Mkpughe 21:4.] Ụlọ Nche a kwuru ihe ise mere anyị ji ata ahụhụ nakwa ihe Baịbụl kwuru banyere otú Chineke ga-esi mee ka anyị kwụsị ịta ahụhụ.”
Teta! Septemba–Ọktoba
I kelechaa onye ị bịara na nke ya, gị asị ya: “Obi anaghị adị ndị mmadụ mma ma ha hụ otú e si emegbu ndị ọzọ. Ụfọdụ na-eme ngagharị iwe iji gosi otú obi dị ha. Ì chere na ime ngagharị iwe na-eme ka ihe gbanwee? [Chere ka ọ zaa. Ya zachaa, gị asị ya:] Lee ihe Baịbụl kwuru na ọ bụ ya ga-eme ka ihe gbanwee n’ụwa a. [Gụọ Matiu 6:9, 10.] Teta! a zara ajụjụ bụ́, ‘Ngagharị iwe ọ̀ ga-ebi ya?’”