Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 8/13 p. 8
  • Ihe I Nwere Ike Ikwu

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ihe I Nwere Ike Ikwu
  • Ozi Alaeze Anyi—2013
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ihe I Nwere Ike Ikwu
    Ozi Alaeze Anyi—2011
  • Ihe I Nwere Ike Ikwu
    Ozi Alaeze Anyi—2013
  • Ihe I Nwere Ike Ikwu
    Ozi Alaeze Anyi—2012
  • Ihe I Nwere Ike Ikwu
    Ozi Alaeze Anyi—2014
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—2013
km 8/13 p. 8

Ihe I Nwere Ike Ikwu

Ịmalite Ọmụmụ Baịbụl na Satọdee Mbụ n’Ọnwa Septemba

I kelechaa onye ị bịara na nke ya, gị asị ya: “Anyị na ndị agbata obi anyị na-ekwu banyere ihe ga-enyere di na nwunye aka ịna-ebi n’udo. Gịnị ka i chere na-emekarị ka di na nwunye ghara ịna-ebi n’udo?” Chere ka ọ zaa. Ya kwuchaa, gị egosi ya, Ụlọ Nche Septemba 1, peeji nke 16. Gị na ya tụlee ajụjụ nke mbụ dị na peeji ahụ, gụọkwanụ ma ọ́ dịghị ihe ọzọ otu n’ime amaokwu Baịbụl ndị dị n’ebe ahụ. I mechaa, nyekọta ya Ụlọ Nche ahụ na Teta!, gị na ya yiekwa mgbe ị ga-abịaghachi ka unu tụlee ajụjụ nke abụọ.

Ụlọ Nche Septemba 1

I kelechaa onye ị bịara na nke ya, gị asị ya: “Ọtụtụ ndị na-eche ihe mere Chineke ji kwe ka ndị mmadụ na-ata ahụhụ. Ì chetụla ihe mere anyị ji ata ahụhụ? [Chere ka ọ zaa. Ya kwuchaa, gị asị ya:] Ama m na obi ga-adị gị ụtọ ịnụ na Chineke kwere nkwa na e nwere oge iru uju na ihe mgbu na-agaghịkwa adị. [Gụọ Mkpughe 21:4.] Ụlọ Nche a kwuru ihe ise mere anyị ji ata ahụhụ nakwa ihe Baịbụl kwuru banyere otú Chineke ga-esi mee ka anyị kwụsị ịta ahụhụ.”

Teta! Septemba–Ọktoba

I kelechaa onye ị bịara na nke ya, gị asị ya: “Obi anaghị adị ndị mmadụ mma ma ha hụ otú e si emegbu ndị ọzọ. Ụfọdụ na-eme ngagharị iwe iji gosi otú obi dị ha. Ì chere na ime ngagharị iwe na-eme ka ihe gbanwee? [Chere ka ọ zaa. Ya zachaa, gị asị ya:] Lee ihe Baịbụl kwuru na ọ bụ ya ga-eme ka ihe gbanwee n’ụwa a. [Gụọ Matiu 6:9, 10.] Teta! a zara ajụjụ bụ́, ‘Ngagharị iwe ọ̀ ga-ebi ya?’”

    Akwukwo Igbo (1984-2026)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2026 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya