Ịma Ọkwa
◼ Akwụkwọ a ga-enye ndị mmadụ n’ọnwa Jun: Jiri traktị ọ bụla unu nwere gaa ozi ọma. Ọ bụrụ na onye nwe ụlọ achọọ ka a mụwara ya Baịbụl, jiri akwụkwọ Bible Na-akụzi gosi ya otú anyị si amụrụ ndị mmadụ Baịbụl ma ọ bụkwanụ gị ejiri broshọ bụ́ Gee Chineke Ntị ma ọ bụkwanụ Gee Chineke Ntị Ka I Wee Dị Ndụ Ebighị Ebi. Julaị na Ọgọst: Ozi Ọma Si n’Aka Chineke! ma ọ bụ nke ọ bụla n’ime broshọ ndị a dị peeji 32: Gee Chineke Ntị ma ọ bụkwanụ Gee Chineke Ntị Ka I Wee Dị Ndụ Ebighị Ebi, na Ụzọ Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi—Ị̀ Chọtawo Ya? Ị gaa izi ndị Alakụba ozi ọma, nye ha broshọ bụ́ Real Faith—Your Key to a Happy Life ma ọ bụ The Guidance of God—Our Way to Paradise. Septemba: Ụlọ Nche na Teta!