Ịma Ọkwa
◼ Akwụkwọ a ga-enye ndị mmadụ n’ọnwa Mee na Jun: Jiri traktị ọ bụla unu nwere gaa ozi ọma. Ọ bụrụ na onye nwe ụlọ achọọ ka a mụwara ya Baịbụl, jiri akwụkwọ Bible Na-akụzi gosi ya otú anyị si amụrụ ndị mmadụ Baịbụl ma ọ bụkwanụ gị ejiri broshọ bụ́ Gee Chineke Ntị ma ọ bụkwanụ Gee Chineke Ntị Ka I Wee Dị Ndụ Ebighị Ebi. Julaị na Ọgọst: Ozi Ọma Si n’Aka Chineke! ma ọ bụ nke ọ bụla n’ime broshọ ndị a dị peeji 32: Gee Chineke Ntị ma ọ bụkwanụ Gee Chineke Ntị Ka I Wee Dị Ndụ Ebighị Ebi, na Ụzọ Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi—Ị̀ Chọtawo Ya? Ị gaa izi ndị Alakụba ozi ọma, nye ha broshọ bụ́ Real Faith—Your Key to a Happy Life ma ọ bụ The Guidance of God—Our Way to Paradise.
◼ Ọ bụrụ na ị nọ n’ụlọ ọgwụ ma chọọ ka ndị okenye ma ọ bụkwanụ Ụmụnna Ndị Na-aga Eleta Ụmụnna Anyị n’Ụlọ Ọgwụ na-abịa eleta gị, gịnị ka ị ga-eme? Mgbe ị na-agwa dọkịta ma ọ bụ ndị na-arụ n’ebe ahụ na ị bụ Onyeàmà Jehova, ọ ga-adị mma ma ị gwa ha na ị ga-achọ ka Ndịàmà Jehova na-abịa eleta gị. Iwu obodo anyị na iwu na-achị ndị dọkịta kwuru na ndị dọkịta ekwesịghị ịkọrọ ndị ọzọ gbasara ọrịa mmadụ na-arịa na ihe ndị ọzọ gbasara onye ahụ. Ma, ọ bụrụ na i jiri ọnụ gị gwa ha na ị ga-achọ ka ndi okenye na-abịa agba gị ume, ha ga-ekwe n’ihi na iwu na-achị ha kwadoro ya.