Ntụleghachi nke Ihe Ndị A Mụrụ n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
A ga-aza ajụjụ ndị e dere ebe a n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke n’izu na-amalite n’Ọgọst 27, 2012. Ụbọchị e denyere n’akara ngebichi bụ izu a ga-eme ihe omume e si na ya nweta ajụjụ ahụ. E denyere ya ka i nwee ike mee nchọnchọ n’izu ahụ a ga-amụ ya.
1. Gịnị ka ọhụụ a Ezikiel hụrụ gbasara Juda na-atụ aka ya? Oleekwa ihe dị mkpa anyị kwesịrị ịmụta na ya? (Ezik. 8:15-17) [Jul. 2, w07 7/1 p. 13 para. 6; w93 1/15 p. 27-28 para. 7, 12]
2. Olee otú ọtụtụ ndị ndú okpukpe si na-eme ka ndị amụma ụgha e nwere n’oge Ezikiel? (Ezik. 13:3, 7) [Jul. 9, w99 10/1 p. 13 para. 14-15]
3. Ònye bụ “ome” e buru amụma ya n’Ezikiel 17:22-24? Gịnị bụ “ugwu dị oké elu” e kwuru na a ga-adọgharị ome ahụ na ya? Oleekwa otú ọ ga-esi ghọọ “osisi sida dị ukwuu”? [Jul. 16, w07 7/1 p. 12-13 para. 6]
4. N’Ilu ahụ a tụrụ n’Ezikiel 18:2, ònye ka ndị e mere ka ha na Ezikiel gaa biri ná mba ọzọ kwuru na ọ bụ ya mere ha ji na-ata ahụhụ? Oleekwa ihe nke ahụ na-akụziri anyị? [Jul. 23, w88 9/15 p. 18 para. 10]
5. Olee otú ihe ahụ a kọrọ n’Ezikiel 21:18-22 si gosi na ma mmadụ ma ndị mmụọ ọjọọ agaghị emeli ka Jehova ghara imezu nzube ya? [Jul. 30, w07 7/1 p. 14 para. 4]
6. Gịnị ka nchara tara n’ite e ji esi ihe e kwuru okwu ya n’Ezikiel 24:6, 11, 12 nọchiri anya ya? Gịnịkwa ka amaokwu ya nke iri na anọ na-akụziri anyị? [Ọgọ. 6, w07 7/1 p. 14 para. 2]
7. Olee otú amụma ahụ e buru gbasara obodo Taya si mezuo? [Ọgọ. 6, w08 1/1 p. 23 para. 1]
8. Olee okwu ndị e kwuru n’Ezikiel 28:2, 12-17 bụ́ ndị kọwara ma “eze Taya” ma sabo mbụ bụ́ Setan? [Ọgọ. 13, w05 10/15 p. 23-24 para. 10-14]
9. Olee mgbe Ijipt tọgbọrọ n’efu ruo iri afọ anọ? Oleekwa ihe mere obi ji kwesị isi anyị ike na ihe ahụ mere eme? (Ezik. 29:8-12) [Ọgọ. 13, w07 8/1 p. 8 para. 5]
10. Mgbe ndị mmadụ jụrụ ige Ezikiel ntị ma na-akwa ya emo, gịnị ka o mere? Oleekwa otú Jehova si mesie ya obi ike? (Ezik. 33:31-33) [Ọgọ. 20, w91 3/15 p. 17 para. 16-17]