Ịma Ọkwa
◼ Akwụkwọ a ga-enyefe na Jun: Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? Ọ bụrụ na ndị nwe ụlọ nwere akwụkwọ a, ndị nkwusa nwere ike inyefe akwụkwọ ọ bụla merela ochie ọgbakọ nwere. Julaị na Ọgọst: Ndị nkwusa nwere ike inyefe nke ọ bụla e nwere n’ime broshuọ ndị a dị peeji 32: Aha Nsọ Ahụ Nke Ga-adịru Ebighị Ebi, Chineke Ọ̀ Na-eche Banyere Anyị n’Ezie?, Gịnị Bụ Nzube nke Ndụ—Olee Otú Ị Pụrụ Isi Chọta Ya?, Gịnị Na-eme Anyị Mgbe Anyị Nwụrụ?, Idi Ndụ n’Elu Ala Rue Mgbe Ebighị-ebi!, Ị Pụrụ Ịbụ Enyi Chineke!, Mgbe Onye Ị Hụrụ n’Anya Nwụrụ, Mmụọ nke Ndị Nwụrụ Anwụ—Hà Pụrụ Inyere Gị Aka ka ọ̀ bụ Imerụ Gị Ahụ? Hà Dị Adị n’Ezie?, na Ụzọ Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi—Ị̀ Chọtawo Ya? Nyefee broshuọ ọ bụla merela ochie unu nwere n’ọgbakọ. Septemba: Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? Gbalịa ka ị malitere ndị mmadụ ọmụmụ Baịbụl n’ụbọchị mbụ i ziri ha ozi ọma.
◼ N’ọnwa Septemba, a ga-amalite ịtụle fim bụ́ The Bible—Its Power in Your Life nakwa The Bible—Accurate History, Reliable Prophecy ná Nzukọ Ije Ozi. Ndị chọrọnụ nwere ike ịtụ ọda ozugbo ka e zitere ha diiviidi bụ́ The Bible—A Book of Fact and Prophecy—On DVD, nke nwere fim ndị ahụ.