Ịma Ọkwa
◼ Akwụkwọ a ga-enyefe n’August: Ndị nkwusa nwere ike inyefe nke ọ bụla n’ime broshuọ ndị a dị peeji 32: Aha Nsọ Ahụ Nke Ga-adịru Ebighị Ebi, Akwụkwọ Dịịrị Mmadụ Nile, Chineke Ọ̀ Na-eche Banyere Anyị n’Ezie?, Gịnị Bụ Nzube nke Ndụ—Olee Otú Ị Pụrụ Isi Chọta Ya?, Gịnị Na-eme Anyị Mgbe Anyị Nwụrụ?, Idi Ndụ n’Elu Ala Rue Mgbe Ebighị-ebi!, Ì Kwesịrị Ikwere n’Atọ n’Ime Otu?, Ị Pụrụ Ịbụ Enyi Chineke!, “Lee! Ana M Eme Ihe Nile Ka Ha Dị Ọhụrụ,” Mgbe Onye Ị Hụrụ n’Anya Nwụrụ, Mmụọ nke Ndị Nwụrụ Anwụ—Hà Pụrụ Inyere Gị Aka ka ọ̀ bụ Imerụ Gị Ahụ? Hà Dị Adị n’Ezie?, Nọrọ na Nche!, Ọchịchị Ahụ Nke Ga-eweta Paradaịs, na Ụzọ Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi—Ị̀ Chọtawo Ya? September: Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? Mgbe ọ bụla o kwere mee, ndị nkwusa ga-agba mbọ ịmalite ọmụmụ Baịbụl n’oge mbụ ha ga-enyefe ndị nwe ụlọ akwụkwọ a. Jiri nkeji ole na ole gosi ndị nwe ụlọ otú ha ga-esi erite uru n’ọmụmụ Baịbụl. October: Magazin Ụlọ Nche na Teta! Ọ bụrụ na ndị nwe ụlọ gosiri mmasị, nye ha traktị bụ́ Ị̀ Chọrọ Ịma nke Bụ́ Eziokwu?, gị na ha tuleekwa ya. Ma, ọ bụrụ na ndị nwe ụlọ nwere traktị ahụ, ndị nkwusa kwesịrị ịgbalịsi ike malitere ha ọmụmụ Baịbụl. November: Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? Ọ bụrụ na ndị nwe ụlọ nwere akwụkwọ a, ndị nkwusa nwere ike inye ha akwụkwọ ọ bụla merela ochie e nwere n’ọgbakọ. Ma ọ bụkwanụ, nyefee ha Fee Onye Nanị Ya Bụ Ezi Chineke ahụ Ofufe.
◼ A ga-agba mbọ pụrụ iche iji kpọsaa mgbakọ distrikti nke afọ 2009. Ndị nkwusa ga-ekesa akwụkwọ ịkpọ òkù pụrụ iche n’ókèala ha. Ọgbakọ ọ bụla kwesịrị ịmalite ikesa ya ma ọ fọdụ izu atọ ka ha gaa mgbakọ nke ha.
◼ A ga-ezitere ọgbakọ ọ bụla baajị ndị nkwusa ha niile ga-eyi gaa mgbakọ distrikti. Ọ bụ otu baajị ahụ ka ndị ga-aga mgbakọ mba niile ga-eyi.