Ntụleghachi A Ga-eme n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
A ga-aza ajụjụ ndị e dere ebe a n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke n’izu na-amalite n’April 28, 2008. Onye nlekọta ụlọ akwụkwọ ga-eduzi ntụleghachi a ga-ewe nkeji iri atọ, ọ ga-adaberekwa n’ihe ndị a tụlere n’ihe omume ndị e mere n’izu nke March 3 ruo n’izu nke April 28, 2008.
NKÀ OKWU
1. Gịnị mere o ji dị mkpa ịkwadebe okwu anyị site n’ebe e si kenye anyị ihe omume, oleekwa otú anyị nwere ike isi mee nke a? [be-IB p. 234 para. 1–p. 235 para. 1]
2. Gịnị mere o ji dị mkpa iji ajụjụ eme ihe mgbe anyị na-ezi ihe? [be-IB p. 236 para. 1-5]
3. Olee otú ajụjụ nwere ike isi nyere ndị na-ege anyị ntị aka ichebara isiokwu anyị na-atụle echiche? [be-IB p. 237 para. 3–p. 238 para. 1]
4. Mgbe anyị na-akụzi ihe, gịnị mere iji ajụjụ eme ihe nke ọma ji dị mkpa iji dọpụta ihe dị n’obi ndị na-ege anyị ntị? (Ilu 20:5; Mat. 16:13-16; Jọn 11:26) [be-IB p. 238 para. 3-5]
5. Olee uru ọ bara ịdị na-eji okwu ndị na-ekwu na ihe yiri ihe akụzi ihe? (Jen. 22:17; Jere. 13:11) [be-IB p. 240 para. 1-3]
IHE OMUME NKE 1
6. Olee ihe obere onyinye nwaanyị ahụ bụ́ ogbenye nke di ya nwụrụ nyere na ihe Jizọs kwuru banyere onyinye ya nwere ike ịkụziri anyị? (Mak 12:41-44) [w89 10/15-IB p. 31 para. 3]
7. Olee otú mmụọ nsọ si enyere ndị ohu Chineke aka taa? (Jọn 14:25, 26) [be-IB p. 19 para. 2-3]
8. Olee uru kasịnụ a na-erite n’ịgụ ihe? [be-IB p. 21 para. 3]
9. Gịnị ka ịmụ ihe na-agụnye? [be-IB p. 27 para. 3–p. 28 para. 1]
10. Olee ihe ndị anyị nwere ike ịmụta n’akwụkwọ Baịbụl bụ́ Luk? Kọwaa. [w89 11/15-IB p. 25 para. 2-5]
ỌGỤGỤ BAỊBỤL KWA IZU
11. Gịnị mere Jizọs ji gwa otu nwoke ka ọ ghara ịkpọ Ya “Ezi Onye Ozizi”? (Mak 10:17, 18) [w08 2/15-IB “Okwu Jehova Dị Ndụ—Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Mak”]
12. Olee ihe atụ Jizọs ji osisi fig mee banyere mba Izrel? (Mak 11:12-14, 20, 21) [w03 5/15-IB p. 26 para. 2-3]
13. Mgbe mmụọ ozi ahụ bụ́ Gebriel gwara Meri na ọ “ga-atụrụ ime” n’ihi na mmụọ nsọ Chineke ga-abịakwasị ya, ike nke Chineke ekpuchiekwa ya, gịnị ka o bu n’uche? (Luk 1:30, 31, 34, 35) [w08 3/15-IB “Okwu Jehova Dị Ndụ—Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Luk”; w02 3/15-IB p. 19 para. 3; leekwa it-2-E p. 56 para. 2]
14. Ọ̀ bụ eziokwu na ndị na-eso ụzọ Jizọs nọ “na-eme ihe iwu na-akwadoghị n’ụbọchị izu ike”? (Luk 6:1, 2) [gt-IB 31]
15. Gịnị ka anyị pụrụ ịmụta site na ndụmọdụ Jizọs nyere Mata? (Luk 10:40-42) [w99 9/1-IB p. 31]