Ịma Ọkwa
◼ Akwụkwọ a ga-enyefe na December: Nyefee akwụkwọ bụ́ Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ. Ọ bụrụ na e nweghị ya, nyefee akwụkwọ bụ́ Bịaruo Jehova Nso ma ọ bụ Isi Ihe Na-akpata Obi Ụtọ Ezinụlọ. January: E nwere ike inyefe akwụkwọ ọ bụla e bipụtara tupu afọ 1991 ma ọ bụ akwụkwọ ochie ọ bụla ọzọ e nwere n’ọgbakọ. Akwụkwọ ọzọ e nwere ike inyefe: Akwụkwọ Ihe Ọmụma ma ọ bụ broshuọ bụ́ Nọrọ na Nche! February: Akwụkwọ bụ́ Isi Ihe Na-akpata Obi Ụtọ Ezinụlọ. March: Nyefee akwụkwọ bụ́ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? Gbaa mbọ ịmalitere ndị mmadụ ọmụmụ Bible.
◼ Onye onyeisi oche ndị nlekọta họpụtara kwesịrị ịgụzigharị ihe ndekọ ego ọgbakọ nke September, October, na November. O kwesịghị ịbụ otu onye ga na-eme ya mgbe nile. Mgbe e nyochasịrị ihe ndekọ ego ndị a, e kwesịrị ịmara ya ọgbakọ n’ọkwa mgbe ọzọ a ga-agụ akụkọ ndekọ ego.—Lee Instructions for Congregation Accounting (S-27).
◼ Biko maranụ na ụbọchị a ga-eme ihe omume e ji echeta ọnwụ Jizọs n’afọ 2009 bụ na Thursday, April 9, mgbe anyanwụ dasịrị. Ihe mere e ji ama ọkwa a n’oge bụ ka ụmụnna wee nwee ike ime ndokwa ndị dị mkpa iji nweta ụlọ nzukọ nke ọgbakọ ha ga-anọ eme ya ma ọ bụrụ na e nwere ihe karịrị ọgbakọ abụọ na-amụ ihe n’otu Ụlọ Nzukọ Alaeze, ya abụrụkwa na a ga-enwetarịrị ụlọ nzukọ ọzọ. N’ọnọdụ dị otú ahụ, ndị okenye kwesịrị iso ndị nwe ụlọ nzukọ ọ bụla e nwetara nwee nkwekọrịta iji jide n’aka na ọ dịghị ihe omume ọzọ a ga-anọ n’ụlọ nzukọ ahụ mee n’ụbọchị ahụ, ka e wee nwee ike ime ihe omume a e ji echeta ọnwụ Jizọs n’udo nakwa n’ụzọ dị n’usoro.